Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 5/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ònyedị Na-achị Ụwa A?
    Ònyedị Na-achị Ụwa A?
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 5/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ònyedị na-achị ụwa a?

Ebe a na-alụ agha, na-eme mpụ, na-eme ihe ike nakwa ebe e nwere ọdachi

Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a, ndị mmadụ agaraghị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ

Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ma, ọ bụrụ ya na-achị ụwa a, ndị mmadụ agaraghị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Baịbụl gosiri na e nwere onye ọjọọ na-achị ụwa a.—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Oleekwanụ otú onye ọjọọ ahụ si chịwazie ụmụ mmadụ? Mgbe Chineke kechara Adam na Iv, otu mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi ma gwa Adam na Iv ka ha nupụkwara Chineke isi. (Jenesis 3:1-6) Di na nwunye ahụ rubeere ajọ mmụọ ozi ahụ bụ́ Setan isi. Ebe ọ bụ na ha mere ihe Setan kwuru, Setan bidoro chịwa ha. Ọ bụ naanị Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. Ma, ọ chọrọ ka ndị mmadụ jiri aka ha họrọ ka ọ chịwa ha maka na ha hụrụ ya n’anya. (Diuterọnọmi 6:6; 30:16, 19) Ọ dị mwute na e duhiela ọtụtụ ndị taa, ha ahọrọzie ka Setan chịwa ha otú ahụ Adam na Iv mere.—Gụọ Mkpughe 12:9.

Ònye ga-eme ka nsogbu ndị mmadụ nwere bie?

Chineke ọ̀ ga-ekwe ka Setan nọgide na-achị ụwa a? Mbanụ! Chineke ga-esi n’aka Jizọs wepụ ihe ọjọọ niile Setan kpataara ụmụ mmadụ.—Gụọ 1 Jọn 3:8.

Jizọs ga-eji ike Chineke nyere ya memilaa Setan. (Ndị Rom 16:20) Ọ bụ mgbe ahụ ka Chineke ga-achịwa ndị mmadụ ma mee ka ha na-enwe obi ụtọ ma biri n’udo otú o bu n’obi mgbe o kere mmadụ.—Gụọ Mkpughe 21:3-5.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 3 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya