Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 8/1 p. 3
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kasienụ Ndị M Obi”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • ‘Na-etinye Uche N’ihe Karịa Otú Ị Na-adị Etinye’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Tụkwasị Uche M n’Ihe?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 8/1 p. 3

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị?

“Anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye. Jehova na-echeta m.”a​—Ọ BỤ EZE DEVID, ONYE CHỊRỊ IZREL N’OGE OCHIE, KWURU IHE A.

A drop of water falls from a bucket

“Mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ.”—AỊZAYA 40:15

Devid ò kwesịrị ichewe na Jehova na-echeta ya? Chineke ọ̀ na-eche banyere gịnwa? Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na Chineke onye pụrụ ime ihe niile ji ha kpọrọ ihe. Gịnị mere o ji esiri ha ike ikweta?

Otu ihe kpatara ya bụ na Chineke abụghị mmadụ, ọ kakwa ụmụ mmadụ. Ọ bụrụ na Chineke anọrọ n’eluigwe lee mba niile anya, ha dị ka “mmiri si na bọket tapụ; ọ na-ewerekwa ha dị ka uzuzu nke dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Aịzaya 40:15) E nwere otu nwoke na-ede akwụkwọ n’oge a. O kweghị na Chineke. Ọ sịrị na “ọ bụrụ na mmadụ chere na Chineke dị nakwa na Chineke ji ya kpọrọ ihe, nweekwa mmasị n’ihe ndị ọ na-eme, onye ahụ mụ anya na-arọ nrọ.”

Ma, e nwere ndị chere na Chineke anaghị eche banyere ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Jim kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile ka obi ruo m ala nakwa ka m na-ejide onwe m. Ma obere oge, mụ ebidokwa wewa iwe ọkụ. M bịaziri chee na ihe ọjọọ eriela m ahụ́ nke na Chineke enwelighị ike inyere m aka.”

Ebe Chineke nọ ọ̀ dị ezigbo anya nke na ọ naghị ahụ anyị? Olee otú o si were anyị bụ́ ndị na-ezughị okè? A sị na Chineke emeghị ka anyị mata ụdị onye ọ bụ, o nweghị onye gaara aza ajụjụ ndị a. Ma, Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ya bụ, Baịbụl, mere ka o doo anyị anya na Chineke anọghị ebe dị anya, ọ bụghịkwa onye ihe gbasara anyị na-anaghị emetụ n’obi. Baịbụl sịrị na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) N’isiokwu anọ na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe Chineke gwara anyị gbasara otú o si nwee mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ nakwa otú o sirila gosi na ya nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ ibe anyị nọ, bụ́ ndị dịrị ndụ otú a anyị dị ndụ ugbu a.

a Abụ Ọma 40:17; Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya