Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 9/1 p. 7-9
  • Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ IKPE BỤ “NDỊ IKOM MAARA IHE NA NDỊ NWERE UCHE MA NWEE AHỤMAHỤ”
  • IHE NDỊ GA-EME KA E KPEE IKPE ZIRI EZI
  • IKPE ZIRI EZI BAARA ỤMỤ IZREL URU
  • Jehova, “Onye Ikpe Ụwa Nile” Nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya N’Ihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Iwu Jehova Zuru Okè”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ndị Okenye, Na-ekpenụ Ikpe n’Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Gịnị Ka “Anya Laara Anya” Pụtara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 9/1 p. 7-9
N’Izrel oge ochie, onyeikpe na-anụrụ okwu ikpe

Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?

O NWERE mgbe ụlọikpe dị n’otu mba mara ụmụ nwoke abụọ ikpe ọnwụ maka na a sịrị na ha gburu mmadụ. Ma, ebubo a e boro ha bụ ebubo ụgha. Mgbe e mechara mata na aka ha dị ọcha, ndị ọkàiwu jisiri ike kpepụta otu n’ime ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, o nweghị ihe ha nwere ike imere onye nke ọzọ n’ihi na e gbuola ya tupu a mata na aka ya dị ọcha.

Ebe ọ bụ na ndị ọkàikpe nwere ike ikpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu, Baịbụl gwara ndị na-ekpe ikpe, sị: ‘Ikpe ziri ezi—ikpe ziri ezi ka unu ga-agbaso.’ (Diuterọnọmi 16:20) Ọ bụrụ na ndị ọkàikpe emee ihe a Baịbụl kwuru, ọ ga-abara ndị mmadụ uru. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ga-enyere ha aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi ma ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu. Ka anyị leba anya n’ihe iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru iji mata ma ‘ụzọ ya niile hà bụ ikpe ziri ezi.’—Diuterọnọmi 32:4.

NDỊ IKPE BỤ “NDỊ IKOM MAARA IHE NA NDỊ NWERE UCHE MA NWEE AHỤMAHỤ”

Ọ bụrụ na ndị ọkàikpe ma nke a na-akọ n’ikpe ikpe, na-akwụwa aka ha ọtọ ma ghara ile mmadụ anya n’ihu mgbe ha na-ekpe ikpe, ọrụ ha na-abara ndị mmadụ uru. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ọ bụ ụdị ndị ikpe a ka Chineke chọrọ ka ha na-ekpe ikpe. N’oge ụmụ Izrel bidoro ịgagharị n’ala ịkpa, Chineke gwara Mozis ka ọ chọta “ndị ikom ruru eru, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị kpọrọ uru na-ezighị ezi asị” ka ha bụrụ ndị ikpe. (Ọpụpụ 18:21, 22) Mgbe afọ iri anọ gachara, o kwukwara ka a “chọta ndị ikom maara ihe na ndị nwere uche ma nwee ahụmahụ” ka ha na-ekpe ụmụ Izrel ikpe.—Diuterọnọmi 1:13-17.

N’oge Jehọshafata na-achị Juda, o nyere ndị ikpe iwu, sị: “Lezienụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova; ọ nọnyekwaara unu n’ikpe ikpe. Na-atụnụ egwu Jehova. Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na ajọ omume ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ iri ngarị adịghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ.” (2 Ihe E Mere 19:6, 7) Ihe a Jehọshafat gwara ndị ikpe mere ka ha mata na ọ bụrụ na ịkpọasị ma ọ bụ anyaukwu emee ka ha kpee ikpe na-ezighị ezi, ha ga-aza Chineke ajụjụ maka nsogbu ha kpatara.

Mgbe ndị ikpe Izrel na-ekpe ikpe otú Chineke chọrọ, ahụ́ ruru ụmụ Izrel ala, ha ebirikwa n’udo. Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwukwara ihe ga-enyere ndị ikpe aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ bụrụgodị na ikpe ha na-ekpe tara akpụ. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru n’iwu ahụ?

IHE NDỊ GA-EME KA E KPEE IKPE ZIRI EZI

Ọ bụ eziokwu na ndị a na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị ikpe bụ ndị ma ihe na ndị ga-ekpeli ikpe, ha anaghị eji ọgụgụ isi ha na amamihe ha ekpe ikpe. Jehova Chineke gwara ha ihe ndị ga na-enyere ha aka ikpe ikpe ziri ezi. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Chineke gwara ha.

Meenụ nchọpụta nke ọma. Chineke si n’aka Mozis gwa ndị ikpe Izrel, sị: “Mgbe unu na-anụrụ okwu ikpe n’etiti ụmụnne unu, kpeenụ ikpe n’ezi omume.” (Diuterọnọmi 1:16) Ndị ikpe ga-ekpe ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na ha eburu ụzọ chọpụta otú ihe niile si mee. Ọ bụ ya mere Chineke ji gwa ha na ha ‘ga-achọgharị ma sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma.’ Ọ bụrụ na a sịrị na mmadụ mere ihe ọjọọ, ndị ikpe ga-ejide n’aka na onye ahụ mere ihe ahụ n’eziokwu tupu ha ekpewe ya ikpe.—Diuterọnọmi 13:14; 17:4.

Nụrụnụ ihe ndị akaebe ga-ekwu. Mgbe ndị ikpe na-eme nchọpụta, ha kwesịrị ịnụ ihe ndị akaebe ga-ekwu. Iwu Chineke sịrị: “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla, n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.” (Diuterọnọmi 19:15) Iwu Chineke gwakwara ndị ga-agba akaebe, sị: “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu. Adọnyerela onye ajọ omume úkwù site n’ịghọ onye akaebe nke na-akpa nkata ime ihe ọjọọ.”—Ọpụpụ 23:1.

Ndị na-agba akaebe kwesịrị ikwu eziokwu. Ihe Chineke kwuru na a ga-eme onye gbara akaebe ụgha kwesịrị ime ka onye na-agba akaebe chebara onwe ya echiche. Chineke kwuru, sị: “Ndị ikpe ahụ ga-eme nchọpụta nke ọma, ọ bụrụ na onye akaebe ahụ bụ onye akaebe ụgha, ọ bụrụkwa na ọ bụ ebubo ụgha ka o boro nwanne ya, unu ga-eme ya kpọmkwem ihe ahụ ọ kpara nkata ime nwanne ya, ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.” (Diuterọnọmi 19:18, 19) Ọ bụrụ na mmadụ ghara ụgha n’ụlọikpe ka ọ nara onye ọzọ ala ya, a ga-anara yanwa ala nke ya. Ọ bụrụ na ọ ghara ụgha ka e gbuo onye aka ya dị ọcha, a ga-egbu yanwa. Ihe a Chineke kwuru ga-eme ka ndị na-agba akaebe na-ekwu eziokwu.

Unu elela mmadụ anya n’ihu. Ndị ikpe chọpụtachaa ihe niile merenụ, ha akparịta ya n’etiti onwe ha ka ha nwee ike bie ikpe. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha kwesịrị icheta ihe a Chineke kwuru. Chineke sịrị: “Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe, unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ. Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.” (Levitikọs 19:15) N’ikpe ọ bụla ndị ikpe na-ekpe, ha ekwesịghị ile otú mmadụ dị n’anya ma ọ bụ ọkwá ya anya bie ikpe.

Ihe ndị a Chineke kwuru n’iwu o nyere ụmụ Izrel ọtụtụ narị afọ gara aga ga-abara ma ndị na-ekpe ikpe ma ndị na-agba akaebe n’oge a uru. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eme ihe Chineke kwuru n’iwu ya mgbe ha na-ekpe ikpe, o nweghị onye a ga-ekpe ikpe mkpegbu.

Ebe ọkàikpe na-ege ntị ka ndị ọkàiwu abụọ na-arụ ibe ha ụka n’ụlọikpe

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eme ihe Chineke kwuru n’iwu ya mgbe ha na-ekpe ikpe, a gaghị na-ekpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu

IKPE ZIRI EZI BAARA ỤMỤ IZREL URU

Mozis jụrụ ụmụ Izrel, sị: ‘Olee mba ukwu nke nwere ụkpụrụ na mkpebi ikpe ziri ezi dị ka iwu a dum m na-enye unu taa?’ (Diuterọnọmi 4:8) E nweghị mba ọzọ nwere ụdị iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel. Mgbe Eze Sọlọmọn na-edebe iwu Jehova n’oge ọ bụ okorobịa, ndị ọ na-achị bi n’udo, ‘obi rukwara ha ala,’ ihe gazikwaara ha, ha ‘ana-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ ma na-aṅụrị ọṅụ.’—1 Ndị Eze 4:20, 25.

Ọ dị mwute na ụmụ Izrel mechara hapụ idebe iwu Chineke. Chineke gwara Jeremaya onye amụma ka ọ gwa ha, sị: “Lee! Ha ajụwo okwu Jehova, olee ụdị amamihe ha nwere?” (Jeremaya 8:9) Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel jụrụ iwu Jehova, Jeruselem ghọrọ “obodo na-awụfu ọbara,” “ihe arụ” ejukwa na ya. E mechara bibie Jeruselem, ya atọgbọrọ n’efu ruo afọ iri asaa.—Ezikiel 22:2; Jeremaya 25:11.

Aịzaya onye amụma dịrị ndụ n’oge nsogbu juru n’Izrel. Mgbe o chebaara ihe ndị merenụ echiche, o kwuru banyere Jehova Chineke na iwu ya, sị: “Mgbe ị na-ekpe ụwa ikpe, ọ bụ ezi omume ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.”—Aịzaya 26:9.

Obi dị Aịzaya ụtọ na Chineke nyere ya mmụọ nsọ, ya ebuo amụma banyere ọchịchị Mesaya ahụ bụ́ Jizọs Kraịst, sị: “Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị. Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume, ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị nke si n’ọnụ ya; ọ ga-ejikwa mmụọ nke egbugbere ọnụ ya gbuo onye ajọ omume.” (Aịzaya 11:3, 4) Ihe a bụ ihe ọma Mesaya ahụ bụ́ Eze ga-emere ndị niile ọ ga-achị.—Matiu 6:10.

a Aha a bụ́ Jehọshafat pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe.”

Iwu Chineke Ò Kwuru na Mmadụ Imegwara Ihe Ọjọọ E Mere Ya Dị Mma?

Baịbụl sịrị: “Anya ga-alara anya, ezé ga-alara ezé.” (Ọpụpụ 21:24) Otú ọtụtụ ndị si ghọta ihe a Baịbụl kwuru dị iche iche. Ụfọdụ ndị chere na ọ na-egosi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-emegwara ihe ọjọọ e mere ha. Ma ihe a ha chere adabaghị n’iwu Chineke nyere. Chineke sịrị: “Abọla ọbọ, eburula ụmụ ndị gị iwe n’obi.” (Levitikọs 19:18) Oleezi ihe ihe a e kwuru n’Ọpụpụ pụtara?

Ọpụpụ 21:22 kwuru ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụ nwoke abụọ na-alụ ọgụ, otu n’ime ha akụta nwaanyị dị ime aka, nwaanyị ahụ amụọ nwa n’ike. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ na nwa ya anwụghị, di ya agaghị akụgwara nwoke ahụ ihe ọ kụrụ nwunye ya. Kama, ‘a ga-eri ya iwu dị ka ihe onye lụ nwaanyị ahụ gwara ya si dị; ọ ga-akwụkwa ya site n’aka ndị ikpe.’ Ihe nke a pụtara bụ na ndị ikpe ga-ahụ na nwoke ahụ kwụrụ di nwaanyị ahụ ihe ọ sịrị ya kwụọ. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ma ọ bụ nwa ya anwụọ, ndị ikpe ahụ ga-ahụ na e gburu nwoke ahụ.

Cheta na ọ bụ ndị ikpe ga-ahụ na e mere ka ‘mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi, anya alaara anya, ezé alaara ezé,’ ọ bụghị di nwaanyị ahụ. (Ọpụpụ 21:23, 24) Iwu a chetaara ndị na-ekpe ikpe na ha ekwesịghị ịta mmadụ ahụhụ karịrị ihe o mere, ha ekwesịghịkwa ịta mmadụ ahụhụ na-erughị ihe o mere. Otu ọkà mmụta Baịbụl aha ya bụ Richard Elliott Friedman kwuru, sị: “Ihe bụ́ isi iwu a na-ekwu bụ na ahụhụ a ga-ata onye mere ihe ọjọọ agaghị akarị ihe o mere.”

Ebe otu nwoke mara nwoke ibe ya ụra n’oge ochie

Gịnị mere ndị mmadụ ji eche na iwu a Chineke nyere na-ekwu na mmadụ nwere ike imegwara ihe e mere ya? Ọ dị mma ka anyị buru ihe Jizọs kwuru na Matiu 5:38, 39 n’obi. Jizọs sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Anya laara anya, ezé laakwara ezé.’ Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.” Ọ ga-abụ na n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị Juu etinyela iwu a kpọrọ ‘iwu i mee m, mụ emegwara gị’ n’iwu ha a na-edeghị ede iji gosi na mmadụ imegwara ihe e mere ya adịghị njọ. Ma Jizọs mere ka o doo anya na ihe a ha na-akụzi esighị n’iwu Chineke nyere ụmụ Izrel.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya