Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 12/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
    Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
  • Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
    Teta!—2018
  • Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?
    Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 12/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee otú ụmụaka ga-esi mụta ịhụ Chineke n’anya?

Ebe nna ji ihe e kere eke na-akụziri nwa ya ihe

Jiri ihe ndị Chineke kere nyere nwa gị aka ka ọ mata onye Chineke bụ ma hụ ya n’anya

Ụmụ gị ga-amụta ịhụ Chineke n’anya naanị ma ha hụ ihe gosiri na Chineke dị adị nakwa na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na ha amata onye Chineke bụ, ha ga-ahụ ya n’anya. (1 Jọn 4:8) Dị ka ihe atụ, ụmụaka kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ndị a: Olee ihe mere Chineke ji kee mmadụ? Gịnị mere Chineke ji hapụ ndị mmadụ ka ha na-ata ahụhụ? Olee ihe Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu?—Gụọ Ndị Filipaị 1:9.

Otú ị ga-esi eme ka ụmụ gị bido ịhụ Chineke n’anya bụ na ị ga na-egosi ha na gịnwa hụrụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na ha achọpụta na ị hụrụ Chineke n’anya, ha ga-ebido ịhụ ya n’anya.—Gụọ Diuterọnọmi 6:5-7; Ilu 22:6.

Gịnị ka ị ga-eme ka ihe ị na-akụziri ụmụ gị ruo ha n’obi?

Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, na-akpa ike. (Ndị Hibru 4:12) N’ihi ya, nyere ụmụ gị aka ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’ụwa, ọ jụrụ ndị ọ na-akụziri ihe ajụjụ, gee ha ntị ma kọwaara ha Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ ya mere ihe ọ gwara ha ji ruo ha n’obi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe ị na-agwa ụmụ gị na-eru ha n’obi, na-akụziri ha ihe otú ahụ Jizọs si kụzie ihe.—Gụọ Luk 24:15-19, 27, 32.

Ihe ọzọ ga-enyere ụmụ gị aka ka ha mata onye Chineke bụ ma hụ ya n’anya bụ akụkọ dị iche iche dị na Baịbụl bụ́ ndị gosiri otú Chineke si mesoo ndị mmadụ ihe. Ị gaa na www.jw.org/ig, ị ga-ahụ akụkọ Baịbụl a na-egere egere, akwụkwọ, na vidio ndị ga-enyere ụmụ gị aka ka ha mata onye Chineke bụ ma hụ ya n’anya.—Gụọ 2 Timoti 3:16.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 14 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig, ma ọ bụkwanụ gị ejiri otu n’ime adres ndị dị na peeji nke 2 gwa anyị ka anyị zitere gị Ụlọ Nche n’efu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya