Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 3/1 p. 13-15
  • Onyinye A Na-enye Ndị Eze

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye A Na-enye Ndị Eze
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊGAFE ỌZARA AREBIA
  • Ọ DỊBEGHỊ NGWÁ AHỊA E ZOCHIRI OTÚ E SI ENWETA YA KARỊA YA
  • Ihe Ntecha Ndị E Nwere n’Oge Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Bọlsọm nke Gilied—Ihe Otite Na-agwọ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 3/1 p. 13-15
Ihe ndị na-esi ísì ọma

Onyinye A Na-enye Ndị Eze

“Ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ, . . . meghekwara igbe akụ̀ ha wee nye ya onyinye, ya bụ, ọlaedo na frankinsens na mea.”—Matiu 2:1, 11.

Ọ BỤRỤ na ị chọrọ inye eze obodo unu ma ọ bụ onye ọzọ a ma ama onyinye, gịnị ka ị ga-enye ya? N’oge ochie, e weere ihe ndị na-esi ísì ọma otú e si were ọlaedo, nke na a na-eji ha enye ndị eze onyinye.a Ọ bụ ya mere ihe abụọ na-esi ísì ọma ji dịrị n’onyinye ahụ ndị na-agụ kpakpando nyere “eze ndị Juu.”—Matiu 2:1, 2, 11.

Mmanụ bọlsọm

Mmanụ bọlsọm

Baịbụl gwakwara anyị na mgbe eze nwaanyị Shiba bịara ileta Sọlọmọn, o nyere ya “ọlaedo dị otu narị talent na iri abụọ na mmanụ bọlsọm dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa; ọ dịghị mmanụ bọlsọm ha ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn.”b (2 Ihe E Mere 9:9) E nwekwara ndị eze ndị ọzọ na-ewetara Sọlọmọn mmanụ bọlsọm iji gọọrọ ya ọfọ ọma.—2 Ihe E Mere 9:23, 24.

Gịnị mere e ji achọsi ihe ndị a na-esi ísì ọma ike mgbe ahụ, ha ana-adakwa ọnụ? Ọ bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị e ji ha eme. Dị ka ihe atụ, a na-eji ha eme ihe ndị e ji achọ mma, jiri ha efe ofufe, jirikwa ha akwadebe ozu maka olili. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe A Na-eji Ihe Ndị Na-esi Ísì Ọma Eme n’Oge Ochie.”) E wezụgakwa na a na-achọsi ha ike, ihe ọzọ mere ihe ndị ahụ na-esi ísì ọma ji ada ọnụ bụ na a na-emefu nnukwu ego iji tụbata ha.

ỊGAFE ỌZARA AREBIA

Kashịa

Kashịa

N’oge ochie, ụfọdụ osisi ndị e si na ha emepụta ihe ndị na-esi ísì ọma dị na Ndagwurugwu Jọdan. Ma, a na-atụbata ihe ndị ọzọ na-esi ísì ọma atụbata. E nwere ọtụtụ ihe na-esi ísì ọma e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha a kacha mara bụ okooko safrọn, ahịhịa alo, mmanụ bọlsọm, sinamọn, frankinsens, na mea. E nwekwara ihe ndị na-esi ísì ọma e ji eme ka nri dịkwuo ụtọ, dị ka, kọmin, mkpá akwụkwọ mint, na mkpá akwụkwọ dil.

Olee ebe e si enweta ihe ndị a na-esi ísì ọma? E si na Chaịna, India, na Siri Lanka enweta ahịhịa alo, osisi kashịa, na sinamọn. Ebe e si enweta mea na frankinsens bụ n’osisi ndị dị n’ọzara malite n’ebe ndịda Arebia ruo Somalịa dị n’Afrịka. Ma, ọ bụ naanị n’India ka e si enweta ihe e ji eme mmanụ nad nke a na-akpọkwa mmanụ spaịknad.

Okooko safrọn

Okooko safrọn

A na-esi Arebia ebubata ọtụtụ ihe ndị a na-esi ísì ọma n’Izrel. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe ndị a na-esi ísì ọma kwuru na n’ihe dị ka n’agbata puku afọ anọ na puku afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị Arebia kacha esi ná mba ndị dị n’Eshia eburu ngwá ahịa aga ná mba ndị dị na Yurop. Na Negev, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Izrel, e nwere ihe ndị gosiri na ndị a na-agba ahịa ihe ndị na-esi ísì ọma na-esi n’obodo ahụ agafe. Ihe ndị ahụ bụ ụlọ ndị mgbe ochie, ebe ndị e wusiri ike ndị agha na-anọ, na ebe dị iche iche ndị ahịa na-akwụsịtụ ezuru ike. Ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ òtù UNESCO kwuru na otú e si rụọ ebe ndị ahụ ‘gosiri na ndị a na-esi n’ebe ndịda Arebia ebu ahịa aga n’obodo ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian na-enweta ezigbo ego n’ahịa a ha na-agba.’

Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book of Spices kwuru, sị: “Ihe ndị na-esi ísì ọma na-adị ntakịrị, dị ọnụ, dịkwa ụkọ. A na-achọsikwa ha ike.”

Ndị ahịa a na-ebu ihe ndị a na-esi ísì ọma aga n’ebe dị iche iche n’Arebia. Ha na-aga ihe dị ka otu puku kilomita na narị asatọ iji gazuo ebe ndị a. (Job 6:19) Baịbụl kọrọ gbasara ndị Ishmel si Gilied buru ngwá ahịa ha, bụ́ ihe ndị na-esi ísì ọma, na-aga Ijipt. Ha bu “mmanụ labdanọm na mmanụ bọlsọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó.” (Jenesis 37:25) Ụmụ Jekọb resịrị ndị ahịa a Josef nwanne ha ka ọ gaa gbawa ohu.

Ọ DỊBEGHỊ NGWÁ AHỊA E ZOCHIRI OTÚ E SI ENWETA YA KARỊA YA

Mkpá akwụkwọ dil

Mkpá akwụkwọ dil

Ọ bụ naanị ndị ahịa Arebia gbara ahịa ihe ndị a na-esi ísì ọma ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ bụ naanị ha na-esi ná mba ndị dị n’Eshia ebuga kashịa na sinamọn ná mba ndị ọzọ. E nwere ihe ndị ahịa Arebia ndị a na-eme ka ndị bi ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian ghara iso ha na-agba ahịa a ha na-agba. Ha na-akọrọ ha akụkọ ndị ga-eme ka ụjọ na-atụ ha iso ha gbawa ahịa a. Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book of Spices sịrị na ‘ọ dị ka ọ dịbeghị ngwá ahịa e zochirila otú e si enweta ya karịa otú e sirila zochie otú e si enweta ihe ndị a na-esi ísì ọma.’

Kọmin

Kọmin

Olee ihe ndị Arebia a na-akọrọ ndị ọzọ? N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị anọ gara aga, otu onye Grik bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Herodotus kọrọ na nnukwu nnụnụ na-eji ụgbụgbọ osisi sinamọn akpa akwụ ha n’ugwu ndị dị ezigbo elu. Ọ sịrị na ndị na-eweta sinamọn na-edowe ọtụtụ ọkpụrụkpụ anụ n’ala ala ugwu ndị ahụ. Nnụnụ ndị ahụ na-abịazi na-eburu anụ ndị ahụ etinye n’akwụ ha, ya emezie ka akwụ ha daa. Ndị na-eweta sinamọn na-emezi ngwa ngwa buru ụgbụgbọ sinamọn ndị ahụ gaa resị ndị na-agba ahịa ihe ndị na-esi ísì ọma. Akụkọ a na akụkọ ndị ọzọ yiri ya bịara gbasaa ebe niile. Akwụkwọ ahụ a na-akpọ The Book of Spices kwukwara na n’ihi otú a ‘a sịrị o si esi ike inweta sinamọn, a na-ere ya oké ọnụ.’

Mkpá akwụkwọ mint

Mkpá akwụkwọ mint

Ma e mechara mata ihe a ndị Arebia na-ezo ezo kemgbe. Ndị ọzọ esorozie gbawa ahịa ihe ndị a na-esi ísì ọma. N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e bidoro na-ebubata ma na-ere ọtụtụ ihe ndị na-esi ísì ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’Alegzandria n’Ijipt. Mgbe ụfọdụ, ikuku na-eku n’Oké Osimiri India na-eche ihu n’ebe e si aga India. Mgbe ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ndị Rom matara na ikuku a nwere ike inyere ha aka ịkwọrọ ụgbọ ha ruo India, ha bidoro na-esi n’Ijipt akwọ ụgbọ ha aga India. Ihe a meziri ka ihe ndị a na-esi ísì ọma bụrụ atụrụ tawa, ọnụ ahịa ha adalatakwa.

Taa, ndị mmadụ weere ọlaedo ka ihe bara uru karịa ihe ndị na-esi ísì ọma. Ọ na-esikwa ike ịhụ onye ga-ele ihe ndị na-esi ísì ọma anya ka onyinye a ga-enye eze. Ma, ọtụtụ ndị ka na-eji ihe ndị a na-esi ísì ọma eme sent na ọgwụ, ha na-ejikwa ha esi nri. Nke bụ́ eziokwu bụ na ísì ọma ihe ndị a nwere na-amasị anyị taa otú ahụ ọ masịkwara ndị oge gboo.

Ụgbụgbọ osisi sinamọn e kekọtara ọnụ

Sinamọn

a N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ihe a na-akpọ ihe na-esi ísì ọma bụ ahịhịa na-esi ísì ọma, ọ bụghị ihe e ji eme ka nri dị ụtọ.

b “Mmanụ bọlsọm” bụ ihe dị mmiri mmiri ma ọ bụ mmanụ na-esi ísì ọma a na-esi n’osisi enweta.

Ihe A Na-eji Ihe Ndị Na-esi Ísì Ọma Eme n’Oge Ochie

Mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Jehova gwara Mozis otú a ga na-esi eme mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. E nwere ihe anọ na-esi ísì ọma e ji eme nke ọ bụla n’ime ha. (Ọpụpụ 30:22-25, 34-38) E nwere ndị nchụàjà ọrụ ha bụ imepụta mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ na ịhụ na e nwere ha n’ụlọ nsọ mgbe ọ bụla.—Ọnụ Ọgụgụ 4:16; 1 Ihe E Mere 9:30.

Paụda na mmanụ otite. Ndị nwere ego na-azụ paụda na-esi ísì ọma ma jiri ya na-eme ka ụlọ ha, ákwà ha, ihe ndina ha, na ahụ́ ha na-esi ísì ọma. (Esta 2:12; Ilu 7:17; Abụ Sọlọmọn 3:6, 7; 4:13, 14) E nwere mgbe Meri nwanne Lazarọs weere “ezigbo mmanụ nad, nke dị nnọọ oké ọnụ,” tee Jizọs n’isi nakwa n’ụkwụ. E ree obere mkpọ̀ “ezigbo mmanụ nad” ahụ, ego a ga-ereta ya ga-ezu ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ruo otu afọ.—Mak 14:3-5; Jọn 12:3-5.

Ihe e ji akwadebe ozu. Nikọdimọs ji “ngwugwu mea na ihe otite alo” bịa kwadebe ozu Jizọs maka olili. (Jọn 19:39, 40) Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwadebere “ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ” ma jiri ya gaa n’ili Jizọs.—Luk 23:56–24:1.

Ihe e ji esi nri. N’oge ochie, ọ dị ka ụmụ Izrel hà na-eji ihe ụfọdụ na-esi ísì ụtọ esi anụ na azụ ha ga-eri. E nwekwara ihe ndị na-esi ísì ụtọ ha na-etinye ná mmanya.—Abụ Sọlọmọn 8:2.

Ihe E Ji Mee Ihe Abụọ Na-esi Ísì Ọma E Nyere Jizọs

A na-eji ihe dị mmiri mmiri na-esi n’osisi agbapụta eme frankinsens, nke a na-akpọkwa olibanọm. A na-ejikwa ihe ndị ahụ dị mmiri mmiri eme mea. A na-egbukasị ahụ́ osisi ahụ ka mmiri ya nwee ike ịna-agbapụta.

Osisi e ji eme frankinsens dị n’ebe ndịda akụkụ osimiri Arebia. Ebe a na-ahụkarị osisi e si na ya enweta ihe e ji eme mea bụ n’ebe ndị a na-akpọ Somalịa na Yemen ugbu a. Ndị mmadụ na-achọsi frankinsens na mea ike n’ihi ísì ọma ha. Jehova kwudịrị ka e jiri ha na-efe ya ofufe n’oge ochie. Mea so n’ihe e ji eme mmanụ e ji ete onye Chineke họpụtara mmanụ. E jikwa frankinsens achụ àjà nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Ọpụpụ 30:23-25, 34-37) Ma, otú frankinsens na-esi ewepụta ísì ya dị iche n’otú mea si ewepụta ísì nke ya.

A na-ebu ụzọ akpọ frankinsens ọkụ tupu ya ewepụta ísì ya. Ọ bụ ya ka a na-ejikarị achụ àjà nsure ọkụ. Ma, o nweghị ihe ọ bụla a ga-eme mea tupu ya ewepụta ísì ọma ya. A kpọrọ mea aha ugboro atọ mgbe a na-akọ akụkọ Jizọs na Baịbụl. Nke mbụ bụ mgbe e nyere ya mea ka onyinye mgbe ọ dị obere (Matiu 2:11), nke abụọ bụ mgbe e tinyere ya ná mmanya na-enye ya n’elu osisi ịta ahụhụ (Mak 15:23), nke atọ abụrụzie mgbe e ji ya kwadebe ozu ya maka olili (Jọn 19:39).

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya