Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 10/1 p. 15
  • Na-agbaghara Kpamkpam

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agbaghara Kpamkpam
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Ka Ịgbaghara Mmadụ Pụtara?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-agbaghara Mmehie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 10/1 p. 15

IHE E KWURU N’OGE OCHIE NKE KA BARA URU

Na-agbaghara Kpamkpam

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ebe otu nwaanyị ji iwe na-apụ n’ihu nwaanyị ibe ya

Gịnị ka ọ pụtara? Baịbụl kwuru na onye mere mmehie dị ka onye ji ụgwọ, nakwa na onye gbaghaara mmadụ mmehie dị ka onye kagburu ụgwọ e ji ya. (Matiu 18:21-35) Otu akwụkwọ kwuru na n’Akwụkwọ Nsọ, okwu Grik a sụgharịrị “ịgbaghara” pụtara “mmadụ ịhapụ ụgwọ e ji ya, ghara ịgba onye ahụ ụgwọ.” Ọ pụtara na anyị gbaghara onye mehiere anyị, anyị agaghị atụwa anya ka ọ taa ahụhụ ihe o mere anyị. Ma, na anyị na-achọ ịgbaghara onye mejọrọ anyị apụtaghị na ihe o mere dị anyị mma, ma ọ bụkwanụ na ọ naghị ewute anyị. Kama, anyị anaghị eburu onye ahụ iwe n’obi, ọ bụrụgodị na anyị nwere ‘ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa megide ya.’

Ọ̀ bara uru taa? Ebe anyị niile na-ezughị okè, anyị na-emehie ihe. (Ndị Rom 3:23) Anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị mejọrọ anyị n’ihi na anyị ga-emejọkwa ndị ọzọ, chọwa ka ha gbaghara anyị. Anyị gbaghara onye mejọrọ anyị, ọ na-abara anyị uru. Olee otú o si abara anyị uru?

Ebe ụmụ nwaanyị abụọ na-amakụ ibe ha

Anyị jụ ịgbaghara onye mejọrọ anyị, na-eburu ya iwe n’obi, anyị na-akpatara onwe anyị nsogbu. O nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, anyị ana-agara onwe anyị, ndụ ana-agwụkwa anyị ike. O nwekwara ike ime ka anyị daa ezigbo ọrịa. Andrew Steptoe na Dr. Yoichi Chida, bụ́ ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụ́ ike, dere n’otu akwụkwọ na-ekwu gbasara obi mmadụ, sị: “Nchọpụta ndị e mere ugbu a na-egosi na iwe iwe na ibu iwe n’obi nwere ike ime ka obi kụchie mmadụ.”

Oleezi uru ịgbaghara ndị ọzọ na-abara anyị? Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ kpamkpam, anyị na ha ga-adị n’udo, ọ ga-emekwa ka anyị na ha na-adịkwu ná mma. Nke ka nke, anyị na-egosi na anyị na-eṅomi Chineke n’ihi na ọ na-agbaghara ndị mmehie kpamkpam ma ha chegharịa, ọ chọkwara ka anyị na-eme ka ya.—Mak 11:25; Ndị Efesọs 4:32; 5:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya