Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 1 p. 8-9
  • Mee Ka Obi Ruo M Ala Naanị Otu Afọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Obi Ruo M Ala Naanị Otu Afọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • “Ọ Dị Ka Ụwa Ò Zuuru M”
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 1 p. 8-9

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Mee Ka Obi Ruo M Ala Naanị Otu Afọ

Akụkọ Alain Broggio kọrọ

  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1971

  • ABỤ M ONYE: FRANCE

  • NDỤ M BIRI: M NA-EME IHE IKE, NA-AKWA IKO, NA-AṄỤKWA ỌGWỤ IKE

Mgbe Alain Broggio bụ nwa okorobịa, nwee ntutu isi tojuru ejoju

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Mgbe m dị obere, ndị ezinụlọ anyị biri n’obere obodo a na-akpọ Telankọt, nke dị́ n’ebe ugwu Frans. Papa m bụ onye Frans, ma mama m bụ onye Ịtali. Mgbe m dị afọ asatọ, anyị kwagara n’otu ime ime obodo dị́ na Rom. Ọtụtụ ndị bi na ya dara ogbenye. Ihe bịakwara na-esiri anyị ike. Ego na-esekarịrị papa m na mama m okwu.

Mgbe m dị afọ iri na ise, mama m gwara m ka m na-apụ n’ụlọ anyị mgbe ụfọdụ chọọ ndị mụ na ha ga na-akpa. M bidoro na-eme, m pụọ, mụ anọọ ọtụtụ ụbọchị tupu mụ alọta. Mụ na ndị ọjọọ mechakwara kpawa. Otu ụbọchị, otu nwoke yiri ezigbo mmadụ bịakwutere m, nye m ọgwụ ike, mụ anara ya ṅụọ n’ihi na m chọrọ igosi na aghọọla m dimkpa. O teghị aka, mụ ana-aṅụzi ọgwụ ike, na-akwakwa iko. E dinara m n’ike ọtụtụ ugboro. Ike ịdị ndụ mechara gwụ m. Achọghịzi m ịma ma m̀ ga-adị ndụ ma m̀ ga-anwụ anwụ. Owu bịara na-ama m. Mgbe m dị afọ iri na isii, m nwara igbu onwe m. M gara ṅụọ otu ololo mmanya ọkụ ma wụbanye n’ime ọdọ mmiri. Atụbọrọ m ruo ụbọchị atọ.

Ndụ mechara tọwa m ụtọ. Ma, ebidokwara m ime ihe ike na igwu wayo. M na-agakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha, mụ na ha enwee mmekọahụ, mụ enye ha ọgwụ ọjọọ na-eme ka ụra buru ha, zuruzie ihe ọ bụla bara uru ha nwere. Ndị omekome a ma ama bịara were m n’ọrụ, mụ ana-aga erere ha ọgwụ ike n’ebe dị iche iche n’Ịtali. Ndị uwe ojii na-ejidekarị m. Ndụ m dị dịzi ka o nweghị isi. Ma, obi m na-agwa m na a ga-enwerịrị ihe mere m ji dịrị ndụ. M kpegaara Chineke ekpere, na-arịọ ya ka o mee ka obi ruo m ala naanị otu afọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

M bịara chọpụta na ndị mụ na ha na-agba ahịa ọgwụ ike nwere ike iji anyaụfụ gbufuo m. N’ihi ya, mgbe m dị afọ iri abụọ na anọ, m kpebiri ịkwaga Ịngland. Ma, tupu mụ akwagawa, m gara hụ mama m. O juru mụ anya mgbe m garuru, hụ otu nwoke aha ya bụ Annunziato Lugarà ka o ji Baịbụl na-agwa mama m okwu.a Ebe m ma nwoke a ka onye omekome, ụjọ jidere m, mụ ajụọ ya ihe ọ na-achọ na nke anyị. Ọ gwara m na ya bụzi Onyeàmà Jehova. Ọ gwakwara m otú o si gbaa mbọ gbanwee àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpabu. Ọ gwaziri m okwu mere ka m kwe ya nkwa na m rutehaala Ịngland, na m ga-agwa Ndịàmà Jehova ka ha kụziwere m Baịbụl. Ma ozugbo m garuru Ịngland, ebiwekwara m ndụ otú m si ebi.

O nwere otu ụbọchị m hụrụ otu Onyeàmà Jehova ka ọ na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! n’otu okporo ámá na-ekwo ekwo na Lọndọn. Mgbe m hụrụ ya, m chetara nkwa ahụ m kwere Annunziato. M gwaziri Onyeàmà Jehova ahụ na m ga-achọ ka ọ kụziwere m Baịbụl.

N’eziokwu, ihe m mụtara na Baịbụl tụrụ m n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe m gụrụ ihe e dere na 1 Jọn 1:9 gbasara Chineke, o metụrụ m n’ahụ́. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, o kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, nke mere na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile.” Amaokwu a mere ka m chebara onwe m echiche maka ndụ ịla n’iyi m na-ebi. Amalitere m ozugbo gawa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova nabatara m nnọọ nke ọma. O teela m nọ na-achọ ndị enyi ga-ahụ m n’anya. Ọ bụ ya mere na mgbe m hụrụ otú ha si hụ ibe ha n’anya, ya agụwa m agụụ iso ha na-efe Chineke dị ka ụmụnne.

Ọ bụ eziokwu na o sichaghịrị m ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike na ịkwa iko, o siiri m ike ịhapụ àgwà ọjọọ ụfọdụ marala m ahụ́. Achọpụtara m na m kwesịrị ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-ejikwa obiọma emeso ha ihe. E nwedịrị àgwà ndị na-adịghị mma m ka na-agbasi mbọ ike ịkwụsị. Ma, Jehova na-enyere m aka ịna-agbanwe. N’ime ọnwa isii Ndịàmà Jehova bidoro ịkụziri m Baịbụl, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. N’afọ 1997 ka e mere m baptizim.

Foto Alain Broggio

URU NDỊ M RITERELA:

Mgbe e mechara m baptizim, alụrụ m otu nwa agbọghọ aha ya bụ Barbara. O tebeghịkwa aka yanwa ghọrọ Onyeàmà Jehova. Mgbe otu n’ime ndị enyi m mbụ hụrụ otú m sirila gbanwee, o bidoro ịmụ Baịbụl. O mechara ghọọ Onyeàmà Jehova, nwanne ya nwaanyị aghọọkwa. Nwanne nwaanyị nne nne m, onye karịrịla afọ iri asatọ, bidokwara ịmụ Baịbụl, e meekwa ya baptizim tupu ya anwụọ.

A họpụtala m ka m bụrụ okenye n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị́ n’ebe m bi. Mụ na nwunye m na-ejekwa ozi ọma oge niile. Anyị na-eji asụsụ Ịtalian akụziri ndị na-asụ Ịtalian bí na Lọndọn Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ m cheta ndụ m biri ná mbụ, obi ana-ajọ m njọ. Ma, nwunye m na-enyere m aka inweta onwe m. N’ikpeazụ, enwetala m ihe m na-achọ kemgbe, ya bụ, ezinụlọ na-eme m obi ụtọ mgbe niile, na Nna hụrụ m n’anya. Arịọrọ m Chineke ka o mee ka obi ruo m ala naanị otu afọ, ma, o meerela m ihe karịrị ya.

N’ikpeazụ, enwetala m ihe m na-achọ kemgbe, ya bụ, ezinụlọ na-eme m obi ụtọ mgbe niile na Nna hụrụ m n’anya

a Gụọ ihe Annunziato Lugarà kọrọ n’isiokwu a kpọrọ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ—M Na-eji Égbè M Aga Ebe Ọ Bụla M Na-aga,” nke dị́ n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2014, peeji nke 8 na nke 9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya