Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 1 p. 15
  • Echegbula Onwe Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echegbula Onwe Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Matiu 6:34—“Ụnụ Echegbula Onwe Ụnụ Banyere Echi”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Na-eche Banyere Echi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 1 p. 15

IHE E KWURU N’OGE OCHIE NKE KA BARA URU

Echegbula Onwe Gị

IHE BAỊBỤL KWURU: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu.”—Matiu 6:25.

Ebe otu nwaanyị na-ele risit ụgwọ o ji, na-eche otú ọ ga-esi akwụ ụgwọ ahụ

Gịnị ka ọ pụtara? Jizọs kwuru ihe ahụ mgbe ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe n’elu ugwu. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na n’asụsụ Grik, a sị na mmadụ na-echegbu onwe ya, o nwere ike ịbụ “echiche mmadụ na-eche n’ihi na ọ dara ogbenye ma ọ bụ n’ihi na agụụ na-agụ ya ma ọ bụkwanụ n’ihi nsogbu ndị ọzọ na-abịara ya kwa ụbọchị.” Mmadụ nwekwara ike ịna-echegbu onwe ya gbasara ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu. Ọ dịghị njọ ma anyị na-eche gbasara ihe ndị na-akpa anyị na otú ihe ga-esi agara ndị ikwu na ibe anyị. (Ndị Filipaị 2:20) Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Unu echegbula onwe unu.” Ọ chọghị ka ha na-echegbu onwe ha maka echi, n’ihi na ọ ga-eme ka ha ghara inwe obi ụtọ ha kwesịrị inwe maka ụbọchị ọ bụla ha dị ndụ.—Matiu 6:31, 34.

Ọ̀ bara uru taa? Anyị mee ihe a Jizọs kwuru, ọ ga-abara anyị uru. N’ihi gịnị? Ihe e kwuru n’akwụkwọ ụfọdụ e ji eme nchọnchọ gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-eche oké echiche, ọ ga-eme ka akwara ndị dị́ anyị n’ahụ́ na-arụ ọrụ n’ezughị ike. Ihe a nweziri ike ime ka anyị nwee ọrịa ndị dị ka ọnyá afọ, ọrịa obi na ụkwara ume ọkụ.

Jizọs kwuru ihe mere anyị kwesịrị iji ghara ịna-echegbu onwe anyị. O kwuru na ọ baghị uru. Jizọs jụrụ, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” (Matiu 6:27) Ichegbu onwe anyị agaghị emeli ka ndụ anyị gbatịkwuo, ma ya fọdụzie ime ka ndụ anyị ka mma. Mgbe ụfọdụ, ihe anyị na-atụ ụjọ na ọ ga-eme anaghịdị emecha mee. Otu nwoke gụrụ akwụkwọ kwuru, sị: “Mmadụ ichegbu onwe ya maka ọdịnihu abaghị uru, n’ihi na ọdịnihu anaghị adịcha njọ otú anyị chere.”

Ebe otu nwaanyị na-arụ ọrụ n’ubi ya

Oleezi otú anyị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe anyị? Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịtụkwasị Chineke obi. Ọ bụrụ na Chineke na-enye anụ ufe nri, na-eyiwe okooko osisi uwe mara mma, ọ̀ bụ na ọ gaghị enye ụmụ mmadụ, ndị ji obi ha niile na-efe ya, ihe niile dị́ ha mkpa ná ndụ? (Matiu 6:25, 26, 28-30) Ihe nke abụọ anyị ga-eme bụ ịghara ịna-echegbu onwe anyị maka echi. Jizọs kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya.” Ọ̀ bụ na i kwetaghị na “ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya”?—Matiu 6:34.

Ọ bụrụ na anyị emee ihe a Jizọs kwuru, anyị agaghị na-arịa ọrịa ndị oké echiche na-akpata. Nke kadị mkpa bụ na obi ga-eru anyị ala, ya bụ, na anyị ga-enwe ihe Baịbụl kpọrọ “udo nke Chineke.”— Ndị Filipaị 4:6, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya