Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 4 p. 14-15
  • Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI CHỌPỤTA MA IHE ANYỊ KWEERE NA IHE BAỊBỤL KWURU HÀ BỤ OTU
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
    Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 4 p. 14-15

Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta

AJỤỌ gị ma ị̀ bụ Onye Kraịst, gịnị ka ị ga-aza? Ị́ sị ee, mara na i so n’ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ n’ụwa niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst. Taa, e nwere ọtụtụ puku chọọchị ndị e weere na ha bụ nke Ndị Kraịst, ma, ihe ndị ha na-akụzi na otú ha si ele ihe anya dịcha iche iche. Ọ bụ ya mere ihe i kweere nwere ike iji dịrị iche n’ihe ndị ọzọ sịkwa na ha bụ Ndị Kraịst kweere. Ì kwesịrị ịchọpụta ma ihe i kweere ò ziri ezi? Ee, ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ụdị Onye Kraịst Baịbụl kwuru ka anyị bụrụ.

Ihe a na-akpọ ndị mbụ soro ụzọ Jizọs Kraịst bụ “Ndị Kraịst.” (Ọrụ Ndịozi 11:26) Ebe ọ bụ na ha niile n’oge ahụ kweere n’otu ihe, ọ dịghị mkpa ka e nwee aha ọzọ e ji mara ha. Ha ji otu obi mee ihe Jizọs Kraịst, bụ́ onye malitere okpukpe Ndị Kraịst, kụziiri ha. Ndị chọọchị unu hà na-akụzi ihe Kraịst kụziri? Ihe ha kweere na ihe ndị mbụ soro ụzọ Kraịst kweere ọ̀ bụ otu? Olee ihe ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị a? Ọ bụ naanị Baịbụl ga-enyeliri gị aka ịmata ha.

Chebagodịrị ihe a echiche: Jizọs Kraịst ji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru kpọrọ ihe n’ihi na ọ ma na ọ bụ Okwu Chineke. Ọ kwadoghị ndị na-eleghara ihe Baịbụl kwuru anya ma ọ bụ ndị ji ọdịnala ha kpọrọ ihe karịa ihe Baịbụl kwuru. (Mak 7:9-13) Ihe ọ pụtara bụ na ihe niile ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-akụzi ga-esirịrị na Baịbụl. Ọ bụ ya mere onye ọ bụla kpọrọ onwe ya Onye Kraịst ji kwesị ịjụ onwe ya sị, ‘Ihe niile a na-akụzi na chọọchị m hà si na Baịbụl?’ Ọ bụ Baịbụl ka ị ga-eji amata azịza ajụjụ a.

Jizọs kwuru na ndị Chineke na-anabata ofufe ha bụ ndị na-efe Chineke n’eziokwu, nakwa na ọ bụ na Baịbụl ka eziokwu dị. (Jọn 4:24; 17:17) Pọl onyeozi kwukwara na a ga-azọpụta anyị ma anyị nweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji hụ na ihe ọ bụla anyị kweere si na Baịbụl. Ma ọ́ bụghị ya, a gaghị azọpụta anyị.

OTÚ ANYỊ GA-ESI CHỌPỤTA MA IHE ANYỊ KWEERE NA IHE BAỊBỤL KWURU HÀ BỤ OTU

Biko, gụọ ajụjụ na azịza isii ndị dị n’isiokwu a, gụọkwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ha. Sapeta amaokwu Baịbụl ndị ahụ na Baịbụl nke gị, ma chebara ihe Baịbụl zara echiche. Jụzie onwe gị, sị, ‘Ihe Baịbụl kwuru n’okwu a ọ̀ bụ ihe chọọchị m na-akụzi?’

Ajụjụ na azịza ndị a nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ihe kacha mkpa i kwesịrị ịchọpụta. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịchọpụta ma ihe ndị ọzọ chọọchị unu na-akụzi hà si na Baịbụl, obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ iji Baịbụl nyere gị aka. Gbalịa gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka gị na ya na-amụ Baịbụl. I nwekwara ike ịga n’adres Ịntanet anyị, bụ́ jw.org/ig, kwuo na ị chọrọ ka gị na Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl.

1 AJỤJỤ: Ònye Bụ Chineke?

AZỊZA: Jehova Chineke bụ Nna Jizọs. Ọ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụkwa Onye kere ihe niile.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst oge niile mgbe anyị na-ekpe ekpere maka unu.”—Ndị Kọlọsi 1:3.

“I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”—Mkpughe 4:11.

Gụọkwa Ndị Rom 10:13; 1 Timoti 1:17.

2 AJỤJỤ: Ònye bụ Jizọs Kraịst?

AZỊZA: Jizọs bụ Ọkpara Chineke. E kere Jizọs eke. Ọ nọ n’okpuru Chineke, na-erubekwara ya isi.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Nna m ka m ukwuu.”—Jọn 14:28.

“[Jizọs] bụ onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya, onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” —Ndị Kọlọsi 1:15.

Gụọkwa Matiu 26:39; 1 Ndị Kọrịnt 15:28.

3 AJỤJỤ: Gịnị bụ mmụọ nsọ?

AZỊZA: Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji emezu uche ya. O nweghị onye dị adị a na-akpọ mmụọ nsọ. E nwere ike ịsị na mmadụ jupụtara na mmụọ nsọ nakwa na mmụọ nsọ dakwasịrị mmadụ, onye ahụ enweta ike.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya n’afọ maliri; Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ.”—Luk 1:41.

“Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.”—Ọrụ Ndịozi 1:8.

Gụọkwa Jenesis 1:2; Ọrụ Ndịozi 2:1-4; 10:38.

4 AJỤJỤ: Gịnị bụ Alaeze Chineke??

AZỊZA: Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe. Ọ bụ Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, Alaeze a ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa niile.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Mmụọ ozi nke asaa wee fụọ opi ya. Oké olu wee kwuo okwu n’eluigwe, sị: ‘Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya, ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe niile ebighị ebi.’”—Mkpughe 11:15.

Gụọkwa Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.

5 AJỤJỤ: Ndị ezi omume niile hà ga-aga eluigwe?

AZỊZA: Mba. Ọ bụ ndị ezi omume ole na ole Baịbụl kpọrọ “ìgwè atụrụ nta” ka Chineke ga-ahọrọ ka ha gaa eluigwe. Ha na Jizọs ga-achị ụmụ mmadụ.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.”—Luk 12:32.

“Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze.”—Mkpughe 20:6.

Gụọkwa Mkpughe 14:1, 3.

6 AJỤJỤ: Gịnị bụ uche Chineke maka ụwa a na ụmụ mmadụ?

AZỊZA: Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs, ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi, ha agaghịkwa na-arịa ọrịa. Udo ga-adịkwa ebe niile.

IHE BAỊBỤL KWURU:

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Gụọkwa Abụ Ọma 37:29; 2 Pita 3:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya