Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 2 p. 16
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị bi “n’oge ikpeazụ”?
  • Olee otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu?
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 2 p. 16
Ebe ụmụaka na ndị okenye na-ekpori ndụ na Paradaịs

Ndị a na-ebibighị mgbe oge ikpeazụ ga-agwụ ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ànyị bi “n’oge ikpeazụ”?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Amụma ndị e buru na Baịbụl na ihe ndị na-eme n’oge anyị a na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • A ga na-alụ agha n’ebe dị iche iche, nweekwa ụkọ nri, ala ọma jijiji na ajọ ọrịa na-efe efe n’oge ikpeazụ.—Matiu 24:3, 7; Luk 21:11.

  • Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ, àgwà ndị mmadụ ga-eretọ eretọ, kwuokwa na ha agaghịzi eji ofufe Chineke kpọrọ ihe.—2 Timoti 3:2-5.

Olee otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na oge ikpeazụ ga-agwụ mgbe Chineke ga-ebibi ụwa na mmadụ niile bi na ya, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ihe ga-emecha dị mma n’ụwa. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Oge ikpeazụ ga-agwụ mgbe Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị.—1 Jọn 2:17.

  • A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 35:1, 6.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara ‘oge ikpeazụ,’ gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya