Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 3 p. 3
  • Otú Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Si Gbasa Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Si Gbasa Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Okwu Mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ndị Ịnyịnya Anọ Na-agbafe!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 3 p. 3
Otú ndị ịnyịnya anọ ahụ si na-awụ ọsọ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OTÚ NDỊ NA-AGBA ỊNYỊNYA ANỌ SI GBASA GỊ

Otú Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Si Gbasa Gị

E nwere nnukwu ịnyịnya anọ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe. Ha na-awụ oké ọsọ, ụkwụ ha na-adakwa oké ụda ka ha na-agba. Ị gụọ otú Baịbụl si kọwaa nnukwu ịnyịnya anọ ahụ na ndị na-agba ha, ọ ga-adị gị ka ì ji anya gị na-ahụ ha ka ha na-agbafe. Ịnyịnya nke mbụ na-acha ọcha. Onye na-agba ya bụ onye dị ebube e chiri eze ọhụrụ. Ịnyịnya nke na-eso ya na-acha uhie uhie, e nyekwara onye na-agba ya ikike iwepụ udo n’ụwa. Ịnyịnya nke atọ sochiri ya na-eji ezigbo oji ka ọchịchịrị. Onye na-agba ya ji ihe e ji atụ ihe n’aka. A nụkwara ozi ọjọọ nke na-ekwu na nri ga-adị ụkọ. Ahụ́ ịnyịnya nke anọ chanwụrụ achanwụ. Onye na-agba ya bụ ọnwụ. Ọ ga-eji ọrịa na ihe ndị ọzọ dị njọ na-egbu ndị mmadụ. Ili sochiri ya, ọ na-elokwa ọtụtụ mmadụ.—Mkpughe 6:1-8.

“Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe mbụ m gụrụ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ. Obi m gwara m na Ụbọchị Ikpe eruwela, nakwa na agaghị azọpụta m ebe ọ bụ na ejikerebeghị m.”—Crystal.

“Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m gụrụ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ ụcha ha dị iche iche. Mgbe m ghọtara ihe ọhụụ ahụ pụtara, m chọpụtara na ihe e kwuru banyere ha bụ eziokwu.”—Ed.

Mgbe ị gụrụ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ, ọ̀ dị gị otú ahụ ọ dị Crystal, ka ọ̀ bụ otú ahụ ọ dị Ed? N’agbanyeghị otú ọ dị gị, akụkọ a so n’otu n’ime akụkọ ndị magburu onwe ya a kọrọ n’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, bụ́ Mkpughe. Ị̀ ma na ịghọta ọhụụ a ga-abara gị uru? Olee otú ọ ga-esi bara gị uru? Chineke kwuru na ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ị gụọ akwụkwọ Mkpughe, mụọ ya nke ọma, ma na-eme ihe ndị e kwuru na ya.—Mkpughe 1:1-3.

Anyị ahụla na ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị ma ha gụọ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ e kwuru gbasara ha n’akwụkwọ Mkpughe, ma o kwesịghị ịtụ mmadụ ụjọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala na ọhụụ a emeela ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha nwee ezigbo olileanya. O nwekwara ike imere gị otu ihe ahụ. Biko, gụọ isiokwu na-esonụ ka ị hụ otú ọ ga-esi mee.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya