Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 4 p. 16
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ịghara ịna-echegbukarị onwe gị?
  • Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya?
  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nchegbu
    Teta!—2016
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 4 p. 16
Ebe otu ezinụlọ nọ na Paradaịs

Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, ndị mmadụ ‘ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.’​—⁠Abụ Ọma 37:11

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ịghara ịna-echegbukarị onwe gị?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:⁠7) Baịbụl ga-eme ka obi sie gị ike na Chineke ga-emeli ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Ekpere ga-enyere gị aka inweta “udo nke Chineke.” Udo nke Chineke a ga-eme ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.​—⁠Ndị Filipaị 4:​6, 7.

  • Ihe ọzọ bụ na ịgụ Baịbụl ga-eme ka ị ghara ịna-echegbucha onwe gị.​—⁠Matiu 11:​28-30.

Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na onye ọ bụla dị ndụ ga na-echegbu onwe ya, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ naanị mgbe mmadụ nwụrụ ka ọ ga-akwụsị ichegbu onwe ya. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke ga-ewepụ ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya. “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—⁠Mkpughe 21:⁠4.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, ndị mmadụ ga-ebi n’udo, obi eruokwa ha ala.​—⁠Aịzaya 32:⁠18.

  • Ndị mmadụ agaghịzi na-echeta ihe ọ bụla na-eme ka ha na-echegbu onwe ha.​—⁠Aịzaya 65:⁠17.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya, gụọ isi nke 3 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya