Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 5 p. 6
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Eziokwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 5 p. 6
Ndị mmụọ ọjọọ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ MMỤỌ OZI HÀ DỊ ADỊ N’EZIOKWU?

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị?

Ee, ha dị. Ebee ka ha si? Cheta na Chineke nyere ndị mmụọ ozi ikike iji aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Obere oge Chineke kechara nwoke mbụ na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv, otu mmụọ ozi zuru okè ji ikike a Chineke nyere ha mee ihe na-adịghị mma ma mee ka ụmụ mmadụ malite inupụrụ Chineke isi. Ọ nwatara Adam na Iv, ha enupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:​1-7; Mkpughe 12:⁠9) Baịbụl agwaghị anyị aha mmụọ ozi a ma ọ bụ ọkwá o nwere n’eluigwe tupu ya enupụrụ Chineke isi. Ma mgbe o nupụchaara Chineke isi, Baịbụl kpọrọ ya Setan, nke pụtara “Onye Mmegide,” nakwa Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ.” Aha ndị a Baịbụl kpọrọ ya dabara adaba.​—⁠Matiu 4:​8-11.

Ọ dị mwute na ọ bụghị naanị Ekwensu bụ mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. N’oge Noa, ụfọdụ ndị mmụọ ozi “hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” n’ezinụlọ Chineke dị n’eluigwe. Ha bịara n’ụwa dị ka mmadụ, ka ha nwee ike iso ụmụ mmadụ nwee mmekọahụ rụrụ arụ. Ihe a ha mere jọgburu onwe ya n’ihi na Chineke ekeghị ha ka ha na-alụ nwaanyị.​—⁠Jud 6; Jenesis 6:​1-4; 1 Pita 3:​19, 20.

Gịnị meziri ndị mmụọ ọjọọ ahụ? Mgbe Chineke wetara iju mmiri zuru ụwa ọnụ iji bibie ndị na-adịghị asọpụrụ ya, ha gbanwere, ghọghachi ndị mmụọ ma laghachi n’eluigwe. Ma, Chineke ekweghị ka ha laghachi “n’ọnọdụ mbụ ha,” kama, o wedara ha ala, ma tụba ha “n’oké ọchịchịrị,” nke Baịbụl kpọrọ Tatarọs. (Jud 6; 2 Pita 2:⁠4) Ndị mmụọ ọjọọ ahụ si otú a mee ka Setan bụ́ Ekwensu na-achị ha. Setan bụ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” Ọ ‘na-emekwa onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.’​—⁠Matiu 12:24; 2 Ndị Kọrịnt 11:⁠14.

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị dị n’aka Mesaya, malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914.a Ozugbo Alaeze ahụ malitere ịchị, a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe ma chụda ha n’ụwa. Ọ bụ ha na-akpata oké ihe ọjọọ na ịkwa iko juru n’ụwa a, n’ihi na ha na-ewe oké iwe.​—⁠Mkpughe 12:​9-12.

Ma, otú ihe ọjọọ na tigbuo zọgbuo si arị ibe ha elu na-egosi na oge ha agwụwala. N’oge na-adịghị anya, ndị mmụọ ọjọọ a obi fere azụ agaghịzi na-enye ụmụ mmadụ nsogbu. Alaeze Chineke ga-achị ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs ruo otu puku afọ. Ọ chịchaa, a ga-enye ndị mmụọ ọjọọ ahụ obere oge iji nwaa ụmụ mmadụ nke ikpeazụ ya. E mechaa, a ga-ebibizi ha ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Matiu 25:41; Mkpughe 20:​1-3, 7-10.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara Alaeze Chineke, gụọ isi nke 8 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.pr418.com/⁠ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya