Amụma Ndị Mezurulanụ
N’isiokwu nke mbụ n’Ụlọ Nche a, anyị kọrọ gbasara otú dibịa afa dị na Delfi si ghọgbuo Krosus, eze Peshia emerie ya. Ma na Baịbụl, e nwere otu amụma e buru gbasara eze Peshia. Ihe niile e buru n’amụma ahụ mezuru kpọmkwem otú e si buo ya.
N’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu a mụọ Saịrọs, otu onye amụma, bụ́ onye Hibru, aha ya bụ Aịzaya kwuru na ọ bụ Saịrọs ga-emeri obodo ukwu bụ́ Babịlọn. O kwukwara otú ọ ga-esi merie ya.
Aịzaya 44:24, 27, 28: ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru, . . . “onye na-asị ogbu mmiri, ‘Takọọ; m ga-eme ka osimiri gị niile taa’; Onye na-ekwu banyere Saịrọs, sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ; ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”’
Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ onye Grik, aha ya bụ Hirọdọtọs kwuru na Saịrọs ji nkà chee Osimiri Yufretis na-asọfe n’obodo Babịlọn ihu n’ebe ọzọ. Ihe a mere ka ndị agha Saịrọs nwee ike ịbanye Babịlọn. Mgbe Saịrọs merichara obodo ahụ, ọ hapụrụ ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ka ha laghachi Jeruselem, e bibiri kemgbe afọ iri asaa, ma wughachi ya.
Aịzaya 45:1: “Nke a bụ ihe Jehova gwara onye o tere mmanụ, bụ́ Saịrọs, onye m seere n’aka nri ya, ka m wee zọda mba dị iche iche n’ihu ya, ka m wee tọpụ ndị eze ihe ha kere n’úkwù; ka m wee megheere ya ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ, ka a ghara imechi ọbụna ọnụ ụzọ ámá ya emechi.”
Ndị Peshia si na nnukwu ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ nke dị ná mgbidi Babịlọn banye na ya. Ndị Babịlọn ghewere ya oghe n’amaghị ama. Á sị na ndị Babịlọn ma na Saịrọs na-eme atụmatụ ibuso ha agha, ha gaara emechi ọnụ ụzọ ámá niile chere ihu n’osimiri ahụ. Mana n’ụbọchị ahụ, ha ghewere ha oghe.
Amụma a dị ịtụnanya bụ otu n’ime ọtụtụ amụma ndị mezuru nnọọ otú ahụ e si buo ha na Baịbụl.a Amụma ndị dị na Baịbụl adịghị ka ihe ndị na-akọ ọdịnihu na-akọ. Ha sịrị na ọ bụ chi ụgha ha na-agwa ha ihe ha na-ekwu. Ma, amụma niile dị na Baịbụl si n’aka onye kwuru, sị: ‘M na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, m na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.’—Aịzaya 46:10.
Ọ bụ naanị ezi Chineke, onye aha ya bụ Jehova, ga-ekwuli ihe a. Aha ahụ pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ọ na-egosi na o nwere ikike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu, nweekwa ike ịhazi ya iji mezuo uche ya. Nke a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu ihe niile o kwere ná nkwa.
AMỤMA NDỊ NA-EMEZU TAA
Ị̀ ga-achọ ịma amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara oge anyị a? Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Baịbụl buru amụma na “n’oge ikpeazụ” a ga-enwe “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Oge ikpeazụ nke gịnị? Ọ bụghị oge ikpeazụ nke ụwa anyị bi n’ime ya ma ọ bụ ụmụ mmadụ. Kama, ọ bụ oge ikpeazụ nke ọgba aghara, mmegbu na nhụjuanya na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala kemgbe ọtụtụ afọ. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ kwuru ihe ga-eme “n’oge ikpeazụ.”
2 Timoti 3:1-5: “N’oge ikpeazụ . . . , ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.”
Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ọtụtụ ndị taa na-akpa àgwà ndị a? Ị̀ chọpụtala na ndị gbara anyị gburugburu hụrụ onwe ha n’anya karịa ndị ọzọ, hụ ego n’anya, dịkwa mpako? Ị́ chọpụtabeghị na ndị mmadụ na-achọzi naanị ihe ga-abara onwe ha uru, ọtụtụ ndị bụkwa ekwe ekwe? O doro anya na ị hụla na ọtụtụ ndị anaghị erubere ndị mụrụ ha isi, nakwa na ndị mmadụ hụrụ ihe ụtọ n’anya karịa Chineke. Ihe na-akakwukwa njọ ka chi na-abọ.
Matiu 24:6, 7: “Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. . . . mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha.”
Ụfọdụ nchọpụta e mere gosiri na agha ataala isi ihe karịrị otu narị nde mmadụ n’ụwa kemgbe afọ 1914. E nwere ọtụtụ mba ọnụ ọgụgụ a karịrị ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya. Chegodị mmadụ ole ihe a kpataara anya mmiri, mwute na ahụhụ. Ihe a ò meelanụ ka ọtụtụ obodo kwụsị ịlụ agha?
Matiu 24:7: “A ga-enwekwa ụkọ nri.”
Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri Ụwa kwuru, sị: “N’agbanyeghị na a na-akọpụta nri ga-ezuru mmadụ niile, narị nde mmadụ asatọ na nde iri na ise, ya bụ, otu onye n’ime mmadụ itoolu ọ bụla, na-ebu ọnụ alaba ụra kwa abalị. Otu onye n’ime ụmụaka atọ ọ bụla, na-arịa ọrịa ndị erighị nri na-edozi ahụ́ na-akpata.” A chọpụtakwala na agụụ na-agụgbu ihe dị ka nde ụmụaka atọ kwa afọ.
Luk 21:11: “A ga-enwekwa oké ala ọma jijiji.”
Kwa afọ, ihe dị ka puku ala ọma jijiji iri ise na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ. Ihe dị ka otu narị n’ime ha na-emebi ụlọ ndị mmadụ, otu nke kpụ ọkụ n’ọnụ na-eme kwa afọ. Otu nchọpụta e mere gosiri na ala ọma jijiji e nwere n’agbata afọ 1975 na afọ 2000 gburu narị puku mmadụ anọ na puku iri asaa na otu.
Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”
Ndịàmà Jehova karịrị nde asatọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile n’ihe dị ka narị obodo abụọ na iri anọ. Ha na-ekwusa ozi ọma n’ime obodo, n’ime oké ọhịa, nakwa n’elu ugwu dị iche iche. Amụma ahụ kwuru na e kwusachaa ozi ọma a otú dị Chineke mma, “ọgwụgwụ ga-abịa.” Gịnị ga-emezi ma ọgwụgwụ bịa? Ọchịchị ụmụ mmadụ ga-akwụsị, Alaeze Chineke amalite ịchị. Olee nkwa ndị a ga-emezu n’Alaeze Chineke? Gụrụ na-aga ka ị mata.
a Gụọ isiokwu bụ “Ihe Na-egosi na Amụma Baịbụl Bụ Eziokwu.”