Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w18 Septemba p. 22
  • Ị̀ Ma Ihe Na-akụnụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ma Ihe Na-akụnụ?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Gịnị Ka Oge Kwuru?’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • “Nọgidenụ Na-eche Nche”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị ‘Ịna-eche Nche’?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
w18 Septemba p. 22

Ị̀ Ma Ihe Na-akụnụ?

Ị CHỌỌ ịmata ihe na-akụnụ, gịnị ka ị na-eme? I nwere ike ile anya n’elekere aka gị ma ọ bụ na klọọkụ gị. I nwere ike hụ na o jirila otu awa na nkeji iri atọ gafee elekere iri na abụọ. Ọ bụrụ na enyi gị ajụọ gị, sị: “Gịnị na-akụ?” Gịnị ka ị ga-agwa ya?

Ihe ị ga-agwa ya dabeere n’ebe i bi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “O jirila ọkara gafee elekere mbụ.” N’ebe ụfọdụ, i nwere ike ị sị na ọ bụ “ọkara abụọ,” nke pụtara na ọ fọrọ nkeji iri atọ ka ọ kụọ elekere abụọ.

Ebe ị na-agụ Baịbụl, i nwere ike na-eche otú ndị dịrị ndụ n’oge Baịbụl si gụọ oge. E nwere ụzọ dị iche iche ha si gụọ oge. Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru gbasara ‘isi ụtụtụ,’ ‘ehihie,’ ‘etiti ehihie,’ na “mgbede.” (Jen. 8:11; 19:27; 43:16; Diut. 28:29; 1 Eze 18:26) Mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-ekwu oge ihe mere kpọmkwem.

N’oge Baịbụl, a na-enwekarị ndị nche karịchaa n’abalị. Ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs, ụmụ Izrel kere abalị ụzọ atọ. Ha na-akpọ ya oge nche. (Ọma 63:⁠6) Ndị Ikpe 7:19 kwuru gbasara “oge nche nke etiti abalị.” N’oge Jizọs, ndị Juu na-agụzi oge ka ndị Grik na ndị Rom. Ndị Grik na ndị Rom nwere oge nche anọ n’abalị.

E kwuru gbasara oge nche ndị ahụ ugboro ugboro n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn. Dị ka ihe atụ, ọ bụ “n’oge nche nke anọ nke abalị” ka Jizọs jere ije n’elu mmiri gawa n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụgbọ mmiri. (Mat. 14:25) N’otu ihe atụ Jizọs mere, ọ sịrị: “A sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya.”​—⁠Mat. 24:⁠43.

Jizọs kwuru gbasara oge nche anọ ndị ahụ mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa, ma ọ̀ bụ n’uhuruchi ka ọ̀ bụ n’etiti abalị ka ọ̀ bụ mgbe oké ọkpa ji akwa ka ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ.” (Mak 13:35) Oge nche nke mbụ bụ “n’uhuruchi.” Ọ na-amalite mgbe anyanwụ dara ruo n’ihe dị ka elekere itoolu nke abalị. Oge nche nke abụọ bụ “n’etiti abalị.” Ọ na-amalite n’ihe dị ka elekere itoolu nke abalị ruo n’elekere iri na abụọ nke etiti abalị. Oge nche nke atọ bụ “mgbe oké ọkpa ji akwa.” Ọ na-amalite n’elekere iri na abụọ nke etiti abalị ruo ihe dị ka n’elekere atọ nke abalị. Ọ ga-abụ n’oge nche a ka oké ọkpa kwara n’abalị ahụ e jidere Jizọs. (Mak 14:72) Oge nche nke anọ bụ “n’isi ụtụtụ.” Ọ na-amalite n’ihe dị ka n’elekere atọ nke abalị ruo mgbe anyanwụ wara.

N’agbanyeghị na ihe ndị e ji amata oge taa adịghị n’oge Baịbụl, ha nwere otú ha si amata oge, ma n’ụtụtụ ma n’abalị.

Ihe a bụ oge nche anọ nke ndị Juu e nwere n’oge Baịbụl
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya