Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w18 Disemba p. 10-14
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ GBANWERE ALỤMDI NA NWUNYE KA Ọ DỊ UGBU A
  • NAANỊ IHE GA-EME KA DI NA NWUNYE GBAA ALỤKWAGHỊM
  • NA-AKWANYERE ALỤMDI NA NWUNYE UNU ÙGWÙ MA MGBE UNU NWERE NSOGBU
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?
    Teta!—2004
  • Otú E Si Malite Alụmdi na Nwunye na Ihe Mere E Ji Malite Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
w18 Disemba p. 10-14
Ebe Jizọs na-akụziri ìgwè mmadụ bịakwutere ya ihe

Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”​—MAK 10:9.

ABỤ: 131, 132

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú Jehova na Jizọs si ele alụmdi na nwunye anya?

  • Olee naanị ihe Baịbụl kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm, ma olee ihe mere ụfọdụ nwere ike iji ekpebi na ha agaghị agba alụkwaghịm?

  • Olee ihe onye na-eche echiche ịhapụ di ma ọ bụ nwunye ya kwesịrị ịtụle?

1, 2. Olee ihe Ndị Hibru 13:4 kwesịrị ime ka anyị mee?

ANYỊ niile chọrọ ịna-akwanyere Jehova ùgwù. O kwesịrị ka anyị na-akwanyere ya ùgwù, o kwukwara na ya ga-akwanyere anyị ùgwù. (1 Sam. 2:30; Ilu 3:9; Mkpu. 4:11) Ọ chọkwara ka anyị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, dị ka ndị ọchịchị. (Rom 12:10; 13:7) Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị ịna-akwanyere ùgwù karịchaa. Ọ bụ alụmdi na nwunye.

2 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ.” (Hib. 13:4) Ihe Pọl na-ekwu abụghị ihe niile gbasara alụmdi na nwunye. Kama, ọ na-agwa Ndị Kraịst ka ha na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù, ya bụ, ile ya anya ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele alụmdi na nwunye anya, nke ka nke, alụmdi na nwunye gị, ma ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwaanyị?

3. Olee ndụmọdụ dị mkpa Jizọs nyere banyere alụmdi na nwunye? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Ọ bụrụ na i weere alụmdi na nwunye ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ị na-agbaso ezigbo ihe nlereanya. Jizọs weere alụmdi na nwunye ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Mgbe ndị Farisii jụrụ ya banyere ịgba alụkwaghịm, o kwuru ihe Chineke kwuru banyere alụmdi na nwunye mbụ ọ malitere, sị: “N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́.” Jizọs kwukwara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Gụọ Mak 10:2-12; Jen. 2:24.

4. Olee ihe Jehova bu n’obi malite alụmdi na nwunye?

4 Jizọs kwetara na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye, kwuokwa na di na nwunye ekwesịghị ịtọsa. Chineke agwaghị Adam na Iv na ha nwere ike ịgba alụkwaghịm. Jehova chọrọ ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị otú ahụ o nyere Adam otu nwaanyị n’ogige Iden. “Ha abụọ” ga-abụ di na nwunye ruo mgbe ebighị ebi.

IHE NDỊ GBANWERE ALỤMDI NA NWUNYE KA Ọ DỊ UGBU A

5. Olee aka ọnwụ na-akpa alụmdi na nwunye?

5 Ma, ị manụ na mmehie ahụ Adam mere gbanwere ọtụtụ ihe. Otu n’ime ya bụ ọnwụ, bụ́ nke ga-akpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ. Anyị nwere ike ịhụ nke a n’ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ na-ekwu na Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. O kwuru na ọnwụ na-atọsa alụmdi na nwunye, nakwa na di ma ọ bụ nwunye dị ndụ nwere ike imecha lụọ onye ọzọ.—Rom 7:1-3.

6. Olee otú Iwu Mozis si gosi otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya?

6 Iwu Chineke nyere mba Izrel kwuru ọtụtụ ihe gbasara alụmdi na nwunye. Iwu ahụ nyere ohere nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị, bụkwanụ ihe ndị mmadụ na-eme tupu Chineke enye mba Izrel iwu ahụ. Ma iwu ahụ chebekwara ụmụ nwaanyị na ụmụaka ka a ghara imekpọ ha ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye Izrel alụọ ohu ma mechaa lụọ nwaanyị ọzọ, ọ ga na-enye nwaanyị mbụ ya ahụ nri na uwe ọ na-enyebu ya, ya na ya ga na-enwekwa mmekọahụ. Chineke chọrọ ka ọ na-echebe ya ma na-elekọta ya. (Ọpụ. 21:9, 10) Anyị anaghị edebe Iwu Mozis taa. Ma, Iwu ahụ na-akụziri anyị na Chineke na-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Nke a na-enyere anyị aka ịna-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù.

7, 8. (a) Olee ihe Iwu Mozis kwuru na Diuterọnọmi 24:1 banyere ịgba alụkwaghịm? (b) Olee otú Jehova si ele ịgba alụkwaghịm anya?

7 Olee ihe Iwu Mozis kwuru banyere ịgba alụkwaghịm? Ọ bụ eziokwu na e nweghị mgbe Jehova chọrọ ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm, ma Iwu ahụ nyere ohere ka nwoke bụ́ onye Izrel gbaa nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ ‘chọpụtara ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ahụ nọ.’ (Gụọ Diuterọnọmi 24:1.) Ma Iwu ahụ ekwughị ihe ihe ahụ “na-ekwesịghị ekwesị” bụ. Ọ ga-abụ ihe na-eme ihere ma ọ bụ ihe dị oké njọ, ọ gaghị abụ obere ihe nwaanyị mejọrọ. (Diut. 23:14) Ma ọ dị mwute na n’oge Jizọs, ọtụtụ ndị Juu na-agba nwunye ha alụkwaghịm “n’ihi ụdị ihe ọ bụla.” (Mat. 19:3) O doro anya na anyị agaghị achọ ime ụdị ihe a ha mere.

8 Malakaị onye amụma kwuru otú Chineke si ele ịgba alụkwaghịm anya. O kwuru ihe a mgbe ọtụtụ ndị Izrel ji aghụghọ na-agba ‘nwunye ha lụrụ n’okorobịa’ alụkwaghịm, ma eleghị anya, iji lụrụ ụmụ agbọghọbịa na-ekpere arụsị. Malakaị kwuru banyere otú Chineke si ele ịgba alụkwaghịm anya, sị: “Ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.” (Mal. 2:14-16) Otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya agbanwebeghị malite mgbe ahụ ọ malitere alụmdi na nwunye mbụ mgbe o kwuru na nwoke ‘ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ.’ (Jen. 2:24) Jizọs kwadoro otú Nna ya si ele alụmdi na nwunye anya, mgbe o kwuru, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Mat. 19:6.

Ihe Chineke Mere Mgbe Ndị Izrel Kwụsịrị Ife Ya ma Fewe Arụsị

Ndị Izrel na Juda Kwụsịrị ife Jehova. Ha na mba ndị na-ekpere arụsị gbara ndụ, ha kpekwaara arụsị. Chineke mara ha ikpe n’ihi na ‘ha na nkume na osisi na-akwa iko.’ (Jere. 2:13, 20; 3:1-3, 9; tụlee Ezikiel 16:28; Jems 4:4) Mgbe ha na-agbanweghị ma na-eme ka “nwunye na-agba akwụna,” Chineke kpebiri ihe ọ ga-eme. O kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ ihe o mere, ebe ọ bụ na Izrel, bụ́ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, akwawo iko, m chụpụrụ ya wee nye ya akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm kpamkpam.”—Jere. 3:6-8.

NAANỊ IHE GA-EME KA DI NA NWUNYE GBAA ALỤKWAGHỊM

9. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe Jizọs kwuru na Mak 10:11, 12?

9 Mmadụ nwere ike ịjụ, sị: ‘È nwere ihe ga-eme ka Onye Kraịst gbaa alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ?’ Jizọs kwuru otú o si ele ịgba alụkwaghịm anya, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko ma na-emejọ ya, ọ bụrụkwa na nwaanyị alụọ di ọzọ, mgbe ọ gbasịrị di ya alụkwaghịm, ọ na-akwa iko.” (Mak 10:11, 12; Luk 16:18) O doro anya na ihe a Jizọs kwuru gosiri na o weere alụmdi na nwunye ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ọ chọkwara ka ndị ọzọ na-eme otú ahụ. Mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya kwesịrị ntụkwasị obi alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ, ọ na-akwa iko. Nke a bụ n’ihi na ịgba alụkwaghịm naanị anaghị atọsa alụmdi na nwunye. N’anya Chineke, mmadụ abụọ ahụ ka bụ ‘otu anụ ahụ́.’ Ihe ọzọ bụ na Jizọs kwuru na nwoke ịgba nwunye ya alụkwaghịm nwere ike ime ka nwunye ya kwaa iko. N’ihi gịnị? N’oge ahụ, nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm nwere ike chọọ ịlụ di ọzọ ka o nweta onye ga na-enye ya ego ọ ga-eji egbo mkpa ya. Ụdị alụmdi na nwunye a na ịkwa iko bụ otu ihe.

Naanị Ihe Akwụkwọ Nsọ Kwuru Ga-eme Ka Di na Nwunye Gbaa Alụkwaghịm

Jizọs kwuru ugboro abụọ na naanị ihe ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ bụ por·neiʹa. Olee ihe okwu Grik a pụtara? Ọ pụtara mmekọahụ na-ezighị ezi ndị na-abụghị di na nwunye otú Akwụkwọ Nsọ si kwuo na-enwe. Ọ gụnyere ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ịgba akwụna, mmekọahụ nke ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ, na mmadụ ịdịda onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.—Gụọ Ụlọ Nche, July 15, 2006, “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ.”

10. Olee naanị ihe ga-eme ka Onye Kraịst gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ?

10 Jizọs kwuru ihe ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, [ma ọ bụ, por·neiʹa n’asụsụ Grik], wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Mat. 19:9) O kwukwara otu ihe ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ya. (Mat. 5:31, 32) N’oge abụọ ndị ahụ, Jizọs kwuru banyere “ịkwa iko.” Ihe ndị so n’ịkwa iko bụ di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, ịgba akwụna, ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ, nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị, nakwa mmadụ idina ụmụ anụmanụ. Dị ka ihe atụ, nwoke kwaa iko, nwunye ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm ma ọ bụ na ọ gaghị agba ya. Ọ gbaa ya alụkwaghịm, ha abụọ abụghịzi di na nwunye n’anya Chineke.

11. Gịnị mere Onye Kraịst nwere ike iji ekpebi na ya agaghị agba alụkwaghịm ọ bụrụgodị na di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko?

11 Buru n’obi na Jizọs ekwughị na di ma ọ bụ nwunye kwaa iko, onye nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-agbarịrị onye nke kwara iko alụkwaghịm. Dị ka ihe atụ, nwaanyị nwere ike kpebie na ya agaghị agba di ya kwara iko alụkwaghịm. Ọ ka nwere ike ịhụ ya n’anya, dịrị njikere ịgbaghara ya, ma nyere ya aka ime ka alụmdi na nwunye ha ka mma. Ihe ọzọ bụ na ọ gbaa di ya alụkwaghị ma ghara ịlụ onye ọzọ, e nwere nsogbu nwaanyị a ga-enwe. Dị ka ihe atụ, gịnị banyere igboro ya mkpa ya na inwe mmekọahụ? Gịnị banyere owu ịma ya? Ò nwere ụmụ o kwesịrị ichebara echiche? Olee otú ịgba alụkwaghịm ga-esi emetụta ụmụ ya? Ọ̀ ga-eme ka o sikwuoro ya ike ịzụ ha ka ha na-efe Jehova? (1 Kọr. 7:14) O doro anya na onye nke kwesịrị ntụkwasị obi nke kpebiri ịgba alụkwaghịm ga-enwe nnukwu nsogbu.

12, 13. (a) Olee ihe mere n’alụmdi na nwunye Hosia? (b) Olee ihe mere Hosia ji nabataghachi Goma? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta na alụmdi na nwunye ha?

12 Ihe mere Hosia onye amụma na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere otú Jehova si ele alụmdi na nwunye anya. Chineke gwara ya ka ọ lụọ (Goma), bụ́ onye ga-abụ “nwaanyị nke ga-akwa iko, nakwa na [ọ ga-enwe] ụmụ a kwatara n’iko.” Goma ‘tụụrụ ime ma mụtara Hosia nwa nwoke.’ (Hos. 1:2, 3) Ka oge na-aga, Goma mụrụ nwoke ọzọ na otu nwaanyị. Ọ ga-abụkwa na a kwatara ha abụọ n’iko. N’agbanyeghị iko Goma nọ na-akwa, ya na Hosia ka bụ di na nwunye. Goma mechara hapụ Hosia ma gbawa ohu. Ma, Hosia gakwara zụrụ ya. (Hos. 3:1, 2) Jehova ji Hosia na-egosi otú O si gbaghaara ndị Izrel ugboro ugboro mgbe ha kwụsịrị ife ya ma fewe chi ndị ọzọ. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’alụmdi na nwunye Hosia?

13 Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye Onye Kraịst akwaa iko, Onye Kraịst a ga-ekpebi ihe ọ ga-eme. Jizọs kwuru na ọ ga-enwe ezigbo ihe mere ọ ga-eji gbaa alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ. Ma, o nwekwara ike ịgbaghara ya. O mee otú ahụ, ọ dịghị njọ. Hosia kpọghachikwara Goma nwunye ya. Mgbe Goma lọghachiri, Hosia gwara ya na ya na nwoke ọzọ agaghị enwe mmekọahụ. Hosia na Goma “enweghị mmekọahụ” ruo oge ụfọdụ. (Hos. 3:3, ihe e dere n’ala ala peeji Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee e degharịrị edegharị.) Ma, ka oge na-aga, ọ ga-abụ na ya na Goma malitekwara inwe mmekọahụ, si otú ahụ na-egosi otú Chineke si dị njikere ịnabataghachi ndị Izrel, ya na ha amalitekwa ịna-emekọrịta ihe. (Hos. 1:11; 3:3-5) Olee ihe ihe a na-akụziri anyị gbasara alụmdi na nwunye taa? Ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie na ya agaghị agba di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko alụkwaghịm, ya na ya ịmalitekwa inwe mmekọahụ gosiri na ọ gbagharala ya. (1 Kọr. 7:3, 5) Nke a ga-akagbu ịgba ya alụkwaghịm. Mgbe nke a gachara, di na nwunye a kwesịrị ịrụkọ ọrụ ma nyere ibe ha aka ile alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ya anya.

NA-AKWANYERE ALỤMDI NA NWUNYE UNU ÙGWÙ MA MGBE UNU NWERE NSOGBU

14. Olee ihe nwere ike ime n’alụmdi na nwunye otú ahụ 1 Ndị Kọrịnt 7:10, 11 si kwuo?

14 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịgba mbọ na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù ka Jizọs na Jehova. Ma, ụfọdụ nwere ike ha agaghị eme otú ahụ, n’ihi na anyị ezughị okè. (Rom 7:18-23) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha. Pọl kwuru na “nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya.” Ma, ụdị ihe a mere mgbe ụfọdụ.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:10, 11.

Ebe ndị okenye abụọ ji Baịbụl na-enye di na nwunye ndụmọdụ

Olee ihe e nwere ike ime ka di na nwunye na-enwe nsogbu ghara itisa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15, 16. (a) Olee ihe di na nwunye nwere nsogbu kwesịrị ịgbalịsi ike ime, n’ihi gịnịkwa? (b) Ọ bụrụkwanụ na otu n’ime ha anaghị efe Chineke, olee ihe ha ga-eme?

15 Pọl ekwughị ihe mere ndị di na nwunye ahụ ji hapụ ibe ha. Dị ka ihe atụ, ihe kpatara ya abụghị na di na-akwa iko, ya emee ka nwunye ya nwee ihe o nwere ike iji gbaa ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ. Pọl kwuru na nwaanyị nke hapụrụ di ya kwesịrị ‘ịnọrọ n’alụghị di, ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ya na di ya kpezie.’ N’ihi ya, ha abụọ ka bụ di na nwunye n’anya Chineke. Pọl kwukwara na n’agbanyeghị ihe na-esere ha okwu, ọ bụrụ na otu n’ime ha akwaghị iko, ha kwesịrị ịgbalị kpezie. Ha abụọ nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha jiri Baịbụl nyere ha aka. Ndị okenye agaghị adụnyere onye nke ọ bụla n’ime ha úkwù, ma ha ga-eji Baịbụl nyere ha aka.

16 Ma ihe nwere ike isikwu ike ma ọ bụrụ na naanị di ma ọ bụ nwunye bụ Onye Kraịst ma na-achọ ime ihe Chineke kwuru. Ọ bụrụ na ha enwee nsogbu, ihe ga-egbo ya ọ̀ bụ di ịhapụ nwunye ya ma ọ bụ nwunye ịhapụ di ya? Dị ka anyị kwurula, Baịbụl kwuru na ọ bụ ịkwa iko bụ ihe ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Ma Baịbụl ekwughị ihe ndị nwere ike ime ka di na nwunye hapụ ibe ha. Pọl kwuru, sị: “Nwaanyị nke nwere di na-ekweghị ekwe, ma nwoke ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.” (1 Kọr. 7:12, 13) Ihe a Baịbụl kwuru gbasakwara oge anyị a.

17, 18. Gịnị mere ufọdụ Ndị Kraịst ji kpebie na ha agaghị ahapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha n’agbanyeghị nsogbu ha na-enwe?

17 Ma enweela mgbe ụfọdụ “di na-ekweghị ekwe” mere ihe nwere ike igosi na o ‘kwetaghị ka ya na nwunye ya biri.’ Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-akụ nwunye ya isi aba okpu nke na nwunye ya nwedịrị ike chewe na ọ ga-egbu ya otu ụbọchị. O nwekwara ike ịbụ na ọ chọghị ịna-akpa afọ nwunye ya na ụmụ ya, ma ọ bụ na ọ chọghịkwa ka o fee Jehova. N’ihi ya, nwunye bụ́ Onye Kraịst nwere ike kpebie na n’agbanyeghị ihe di ya nwere ike ikwu, na di ya ‘ekwetaghị ka ya na ya biri,’ nakwa na ọ dị mkpa ka ya hapụ ya. Ma, Ndị Kraịst ndị ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ a ekpebiela na ha agaghị ahapụ di ha. Ha ediela ọnọdụ ha ma gbaa mbọ ime ka alụmdi na nwunye ha ka mma. Gịnị mere ha ga-eji kpebie ime otú ahụ?

18 Ọ bụrụ na nwaanyị ahapụ di ya n’ihi ihe ndị ahụ di ya na-eme ya, ha ka bụ di na nwunye. Ọ bụrụkwa na ha bi iche iche, onye ọ bụla n’ime ha ga-enwe nsogbu ndị ahụ anyị kwuru ná mmalite. Pọl onyeozi kwuru ihe ọzọ mere di na nwunye ji kwesị ịghara ịhapụ ibe ha. O kwuru, sị: “E dowo di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihi nwunye ya, e dowokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihi nwanna ahụ; ma ọ́ bụghị ya, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha n’ezie, ma ugbu a, ha dị nsọ.” (1 Kọr. 7:14) Ọtụtụ Ndị Kraịst ekpebiela na ha agaghị ahapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Onye Kraịst n’agbanyeghị nsogbu ọ na-enye ha. Ha ahụla na ime otú ahụ abaarala ha uru n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha ahụ esorola ha fewe Jehova.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:16; 1 Pita 3:1, 2.

19. Gịnị mere e ji nwee ọtụtụ ndị di na nwunye na-enwe obi ụtọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

19 Jizọs nyere ndụmọdụ banyere di na nwunye ịgba alụkwaghịm, Pọl onyeozi enyekwanụ ndụmọdụ banyere di na nwunye ịhapụ ibe ha. Ma Jizọs ma Pọl chọrọ ka ndị na-efe Chineke na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. Taa, n’ụwa niile, e nwere ọtụtụ ndị di na nwunye n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha. I nwere ike ịhụ ọtụtụ n’ime ha n’ọgbakọ gị. Ha bụ ezigbo ụmụnna ndị hụrụ nwunye ha n’anya nakwa ndị nwunye ji obi ha niile hụ di ha n’anya ma na-asọpụrụ ha. Ha niile na-egosi na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ ihe a ga-akwanyere ùgwù. Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ nde ndị di na nwunye na-egosi na ihe a Okwu Chineke kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.”—Efe. 5:31, 33.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya