Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 1 p. 3
  • Ònye Bụ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Chineke?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ị̀ Ma Onye Nna Gị nke Bi n’Eluigwe Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ònye Bụ Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 1 p. 3
Ebe otu nwoke na-ele ebe mara mma

Ònye Bụ Chineke?

Ọtụtụ ndị sị na ha kweere na Chineke. Ma, ị jụọ ha onye Chineke bụ, ha ana-ekwu ihe dị iche iche. Ụfọdụ na-ekwu na Chineke bụ onyeikpe obi kpọrọ nkụ, na naanị ihe dị ya mkpa bụ ịta ndị mmadụ ahụhụ ma ha mee ihe ọjọọ. Ndị ọzọ ana-ekwu na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-agbagharakwa ha n’agbanyeghị ihe ha mere. Ndị ọzọ kwekwaara na ọ nọ anyị n’ebe dị anya nakwa na ọ chọghị ịma banyere anyị. Ihe ndị a dị iche iche ndị mmadụ na-ekwu nwere ike ime ka ọtụtụ ndị chee na ọ gaghị ekwe omume mmadụ ịmara onye Chineke bụ.

Ọ̀ dị mkpa ịma onye Chineke bụ? Ee, ọ dị mkpa. Ịmata Chineke nke ọma nwere ike ime ka ndụ gị nwee isi. (Ọrụ Ndịozi 17:26-28) Ka ị na-abịarụkwu Chineke nso ka ọ ga na-ahụkwu gị n’anya, na-enyekwara gị aka. (Jems 4:8) Ihe kacha mkpa bụ na ịmata Chineke nke ọma ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

Olee otú ị ga-esi mata onye Chineke bụ? Chegodị gbasara ezigbo enyi gị ị ma nke ọma. Olee otú gị na ya si malite dịwa ná mma? O nwere ike ịbụ na i bu ụzọ mata aha ya, ụdị onye ọ bụ, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, ihe ndị o merela na ihe ndị ọ chọrọ ime nakwa ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ihe ndị ahụ ị matara gbasara onye ahụ mere ka gị na ya dịrị ná mma.

Anyị nwekwara ike ịmata onye Chineke bụ ma ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ndị a na-esonụ:

  • GỊNỊ BỤ AHA CHINEKE?

  • OLEE ỤDỊ ONYE Ọ BỤ?

  • OLEE IHE NDỊ O MERELA?

  • OLEE IHE NDỊ Ọ GA-EME?

  • OLEE URU ỊMATA ONYE CHINEKE BỤ GA-ABARA GỊ?

Ụlọ Nche a ga-eji Baịbụl zaa ajụjụ ndị a. Isiokwu ndị dị na ya ga-enyere gị aka ịmata onye Chineke bụ na uru ị ga-erite ma gị na ya dịrị ná mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya