Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ndụ Ka Mma?
Ọ BỤGHỊ otú Chineke chọrọ ka ndụ dịrị ka ndụ dị ugbu a. Chineke chọrọ ka ndị mmadụ ndị chọrọ ka ọ na-achị ha jupụta ụwa, ha ana-erubere ya isi ma na-eṅomi ịhụnanya ya na àgwà ọma ndị ọzọ o nwere. Ọ chọkwara ka ha na-enwe obi ụtọ ka ha na-azụ ụmụ ha, na-achọpụta ihe ọhụrụ, na-emekwa ka ụwa niile ghọọ paradaịs.
CHINEKE KWERE NKWA IME KA IHE DỊ N’ỤWA OTÚ Ọ CHỌRỌ KA Ọ DỊ
“Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.
‘Oge a kara aka maka ibibi ndị na-ebibi ụwa wee bịa.’—Mkpughe 11:18.
“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.
“Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”—Aịzaya 65:22.
Olee otú a ga-esi emezu amụma ndị a? Chineke ahọpụtala Ọkpara ya bụ́ Jizọs ka ọ bụrụ Eze nke ọchịchị kacha mma ga-esi n’eluigwe chịa ụwa a. Baịbụl kpọrọ ọchịchị ahụ Alaeze Chineke. (Daniel 2:44) Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: ‘Chineke ga-enyekwa ya ocheeze, ọ ga-achịkwa dị ka eze.’—Luk 1:32, 33.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube iji gosi na ihe ga-akara ụmụ mmadụ mma mgbe ọ ga-achịwa ụwa.
JIZỌS GOSIRI IHE ỌMA NDỊ Ọ GA-EMERE NDỊ NA-ERUBERE CHINEKE ISI
Ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche iji gosi otú ọ ga-esi akwụsị ọrịa niile na-enye ụmụ mmadụ nsogbu.—Matiu 9:35.
O mere ka ebili mmiri na-eme daa jụụ, si otú ahụ gosi otú ọ ga-esi echebe ụmụ mmadụ ka ọdachi ndị na-emere onwe ha ghara ibibi ha.—Mak 4:36-39.
O nyere ọtụtụ puku mmadụ nri, na-egosi na ọ ga-enye ụmụ mmadụ ihe niile dị ha mkpa ná ndụ. —Mak 6:41-44.
O mere ka mmiri ghọọ mmanya n’otu agbamakwụkwọ ọ gara iji gosi na ọ ga-enye anyị ihe niile ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ.—Jọn 2:7-11.
Gịnị ka ị ga-eme ka i nweta ndụ ahụ Chineke kwere ndị hụrụ ya n’anya ná nkwa? E nwere “ụzọ” i kwesịrị iso. Baịbụl kpọrọ ya “okporo ụzọ” nke “na-eduba ná ndụ.” O kwuru na “ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:14.
ỊCHỌTA ỤZỌ AHỤ NA-EDUBA NÁ NDỤ KA MMA
Gịnị bụ ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ? Ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ na-anọchi anya ihe niile Chineke gwara anyị na-eme. Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” (Aịzaya 48:17) Ije ije n’ụzọ a ga-eme ka ndụ gị ka mma.
Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” (Jọn 14:6) Ọ bụ ikwere eziokwu ndị Jizọs kụziri na iṅomi ya ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso, ndụ anyị akakwa mma.
Olee otú ị ga-esi achọta ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ? E nwere ọtụtụ okpukpe, ma Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Matiu 7:21) O kwukwara, sị: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha.” (Matiu 7:16) Baịbụl ga-enyere gị aka ịmata nke bụ́ ezi okpukpe na okpukpe ụgha.—Jọn 17:17.
Olee otú ị ga-esi ebido ije ije n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ? E nwere ihe ndị i kwesịri ịmụta banyere Onye nyere anyị niile ndụ. Ònye ka ọ bụ? Gịnị bụ aha ya? Olee ụdị onye ọ bụ? Gịnị ka ọ na-emere anyị? Gịnịkwa ka ọ chọrọ ka anyị na-eme?a
Ihe Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eme abụghị naanị ịrụ ọrụ, rie nri, gwuo egwu ma mụọ ụmụ. Ọ chọkwara ka anyị mata ya n’ihi na ọ bụ Onye Okike anyị, ma bụrụ enyi ya. Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya ma anyị na-eme uche ya. Jizọs kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.
CHINEKE NA-ESI NA BAỊBỤL AKỤZIRI GỊ “OTÚ Ị GA-ESI BAARA ONWE GỊ URU.”—AỊZAYA 48:17
ỊMALITE IJE IJE N’ỤZỌ AHỤ
Ọ bụrụ na anyị amụta ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee mgbanwe ụfọdụ ná ndụ anyị. O nwere ike iyi ihe siri ike omume. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndụ anyị ga-aka mma ma anyị bido ije ije n’ụzọ nke ndụ ahụ. Ndịàmà Jehova na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego n’oge na ebe dị ha mma iji nyere ha aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị mkpa ndị mmadụ na-ajụ banyere Chineke. I nwere ike isi na jw.org/ig gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl.
a Gụọ Ụlọ Nche nke 1 2019.