AKỤKỌ NDỤ
Ihe Ndị Mụrụ M Kụziiri M Mere Ka Ihe Gaziere M
N’OTU etiti abalị, mụ na nwanna ọzọ nọ n’akụkụ Osimiri Naịja. Osimiri a buru ibu, ọ dị ihe dị ka otu kilomita na ọkara n’obosara, na-asọsikwa ike. Ọ bụ n’oge Agha Biafra kpụ okụ n’ọnụ. N’ihi ya, ịgafe Osimiri Naịja nwere ike ịta isi mmadụ. N’agbanyeghị ya, anyị gafere ya ihe karịrị otu ugboro. Gịnị mere m ji nọrọ n’ụdị ọnọdụ a? Ka m kọọrọ gị ihe ndị mere tupu a mụọ m.
Aha Papa m bụ John Mills. E mere ya baptizim n’afọ 1913 na Niu Yọk Siti mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise. Ọ bụ Nwanna Russell kwuru okwu baptizim ya. Obere oge e mechara papa m baptizim, ọ gawara Trinidad ebe ọ lụrụ Constance Farmer, bụ́ Onye Mmụta Baịbụl na-anụ ọkụ n’obi. Papa m nyeere enyi ya aha ya bụ William R. Brown aka igosi “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Ha megidere ya ruo mgbe e zigara Nwanna Brown na nwunye ya Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka n’afọ 1923. Papa m na Mama m, bụ́ ndị nwere olileanya ịga eluigwe, nọgidere na Trinidad na-ezi ozi ọma.
NDỊ MỤRỤ ANYỊ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
Papa m na Mama m mụrụ ụmụ itoolu. Ha gụrụ nwa mbụ ha aha Nwanna Rutherford, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ. Mgbe a mụrụ m n’abalị iri atọ n’ọnwa Disemba afọ 1922, a gụrụ m aha Nwanna Woodworth, onye na-akwadebe isiokwu ndị na-agba na The Golden Age (nke a na-akpọzi Teta!). Ndị mụrụ anyị gbara mbọ hụ na anyị niile gachara ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ma, ha gbara anyị ume ka anyị nwee ihe ndị anyị ga-eji ndụ anyị eme n’ofufe Chineke. Mama m ma otú e si eme ka ndị mmadụ kwenye n’ihe Baịbụl na-ekwu. Papa m na-akọkarịrị anyị akụkọ ndị si na Baịbụl. Otú o si emegharị ahụ́ ma ọ na-akọ ya na-eme ka ọ̀ dị ka ọ bụ mgbe ahụ ka ihe ahụ na-eme.
Mbọ ha gbara bara ezigbo uru. Mmadụ atọ n’ime ụmụ nwoke ise mama m mụrụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ụmụnne m ndị nwaanyị atọ sụrụ ụzọ ọtụtụ afọ na Trinidad na Tobego. Otú ndị mụrụ anyị si kụziere anyị ihe na otú ha si bie ezigbo ndụ mere ka ha kụọ anyị “n’ụlọ Jehova.” Otú ha sikwa gbaa anyị ume nyeere anyị aka ịnọgide na-ama pokopoko “n’ogige ụlọ Chineke anyị.”—Ọma 92:13.
Ụlọ anyị bụ ebe a na-anọ ahazi ozi ọma. Ndị ọsụ ụzọ na-ezukọ n’ụlọ anyị. Ha na-ekwukarị gbasara Nwanna George Young, onye ozi ala ọzọ bụ́ onye Kanada bịara Trinidad. Papa m na Mama m na-ekwu okwu ọma gbasara Nwanna Brown na nwunye ya ha na ha sobu jee ozi, bụ́ ndị na-eje ozi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka n’oge ahụ. Ihe a niile mere ka m bido ịga ozi ọma mgbe m dị afọ iri.
IHE NDỊ MERE MGBE M KA DỊ OBERE
Magazin anyị anaghị ezo ọnụ n’oge ahụ. Ọ na-agba okpukpe ụgha, ndị ahịa anyaukwu, na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụrụ aka n’anwụ. Ọ bụ ya mere ndị isi chọọchị ji mee ka gọvanọ Trinidad machibido akwụkwọ niile Watch Tower na-ebipụta iwu n’afọ 1936. Anyị zochiri akwụkwọ anyị ma jiri ha na-ezi ozi ọma ruo mgbe ha gwụrụ. Anyị ziwe ozi ọma n’oge ahụ, anyị na-eyiri obodobo akwụkwọ e dere ihe na ya, na-enyekwa ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ma anyị jiri ụkwụ ma ọ bụ jiri ígwè na-aga. Anyị na ndị ji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu si Tunapuna bịa gara zie ozi ọma ma n’ime ime obodo ndị dị na Trinidad. Ụdị ozi a na-atọ ụtọ. Ihe ndị a mere m ji mee baptizim mgbe m dị afọ iri na isii.
Ndị ji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu ezi ozi ọma si Tunapuna
Ihe ndị mụrụ m kụziiri m na ihe ndị ahụ mere mgbe m dị obere mere ka m chọọ ịbụ onye ozi ala ọzọ. Echefughị m ya mgbe m gara soro Nwanna Edmund W. Cummings ziwe ozi ọma n’Aruba, n’afọ 1944. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe mmadụ iri bịara soro anyị cheta ọnwụ Jizọs n’afọ 1945. N’afọ ọzọ ya, e hiwere ọgbakọ mbụ n’ebe ahụ.
Mgbe m lụchara Oris, ndụ bịara na-atọkwu m ụtọ
Mgbe obere oge gachara, m ziri otu nwaanyị mụ na ya na-arụkọ ọrụ aha ya bụ Oris Williams ozi ọma n’ụlọ ọrụ anyị. Oris gbara mbọ ịgbachitere ihe ndị a kụziiri ya na chọọchị. Ma, mgbe a na-amụrụ ya Baịbụl, ọ mụtara ihe Okwu Chineke kwuru ma mee baptizim n’abalị ise n’ọnwa Jenụwarị afọ 1947. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ịhụ ibe anyị n’anya ma lụọ. Ọ malitere ịsụ ụzọ n’ọnwa Nọvemba afọ 1950. Mgbe m lụchara Oris, ndụ bịara na-atọkwu m ụtọ.
OZI ANYỊ JERE NA NAỊJIRỊA MERE ANYỊ OBI ỤTỌ
N’afọ 1955, a kpọrọ anyị ka anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe anyị na-akwado ịga, anyị hapụrụ ọrụ anyị, ree ụlọ anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere, hapụzie Aruba. N’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Julaị afọ 1956, anyị gụchara akwụkwọ na klas nke iri abụọ na asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, e ziga anyị Naịjirịa.
Anyị na ụmụnna ndị ọzọ na-eje ozi na Betel dị na Legọs, n’afọ 1957
Nwunye m chetara ihe ndị mere n’oge gara aga. O kwuru, sị: “Mmụọ Jehova nwere ike inyere mmadụ aka idi nsogbu ndị a na-enwe n’ozi ala ọzọ. Di m chọrọ ịbụ onye ozi ala ọzọ, ma mụnwa achọghị. Achọrọ m ịmụ nwa. Ma, m gbanwere obi m mgbe m ghọtara na ozi ọma dị ezigbo mkpa. Mgbe anyị gụchara akwụkwọ na Gilied, obi m niile dịzi n’ije ozi ala ọzọ. Mgbe anyị banyere ụgbọ mmiri a na-akpọ Queen Mary, otu nwanna aha ya bụ Worth Thornton, na-arụ ọrụ n’ọfis Nwanna Knorr, sịrị anyị gaa nke ọma. Ọ gwara anyị na anyị ga-eje ozi na Betel. Obi adịchaghị m mma mgbe m nụrụ ya. Ma ọ dịghị anya, ozi m na-eje na Betel atọwa m ụtọ. M rụkwara ọrụ ọtụtụ ebe na Betel. Ọrụ kacha tọọ m ụtọ bụ ịrụ n’ebe a na-anabata ndị ọbịa. Ahụrụ m ndị mmadụ n’anya. Ọrụ a mekwara ka m mara ọtụtụ ụmụnna ndị Naịjirịa. Ahụ́ ụfọdụ ndị batara ebe ahụ na-abụ uzuzu uzuzu, akpịrị akpọọkwa ha nkụ, ike agwụchaa ha, agụụ ana-agụkwa ha. Obi tọrọ m ụtọ na m nyeere ha nri, nyekwa ha ihe ndị ọzọ ha chọrọ mgbe ahụ. Ihe ndị a niile bụcha ozi dị nsọ m jeere Jehova, ọ na-emekwa ka obi na-atọ m ụtọ.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ọrụ niile anyị rụrụ mere ka anyị maa pokopoko.
N’otu oge ezinụlọ anyị nọkọrọ na Trinidad n’afọ 1961, Nwanna Brown kọrọ banyere ụfọdụ ozi ndị tọrọ ya ụtọ o jere n’Afrịka, mụnwa akọọkwanụ otú ndị mmadụ si abata n’ọgbakọ n’ike n’ike na Naịjirịa. Nwanna Brown konyere m aka n’olu ma gwa Papa m, sị: “Johnny, i jetụbeghị ozi n’Afrịka ma nwa gị Woodworth ejeela.” Papa m gwaziri m, sị: “Nwa m, jisie ike. Jisie ike.” Ume a ndị a jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ gbara m mere ka m kpebisikwuo ike na agaghị m eji ozi m egwu egwu.
Nwanna William, bụ́ onye ndị mmadụ na-akpọ Bible Brown na nwunye ya Antonia gbara anyị ezigbo ume
N’afọ 1962, e nyekwuru m ọzụzụ na klas nke iri atọ na asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O were ọnwa iri. Nwanna Wilfred Gooch, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Naịjirịa n’oge ahụ, gara klas nke iri atọ na asatọ, e ziga ya Ịngland. Mgbe ahụ, ọ bụzi m na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Naịjirịa. M gara ọtụtụ ebe na Naịjirịa ka Nwanna Brown na nwunye ya ma mata ụmụnna anyị, hụkwa ha n’anya. Ọ bụ eziokwu na ha enweghị ọtụtụ ihe otú ndị nọ ná mba ndị ka ha mepee emepee nwere, ma ụdị obi ụtọ ha nwere na otú ihe ha nwere si ju ha afọ gosiri na ọ bụghị ego ma ọ bụ ihe onwunwe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha, obi na-adị anyị ụtọ ịhụ na ha na-adị ọcha n’anya abịa ọmụmụ ihe. Ọtụtụ n’ime ha na-eji gwongworoa abịa mgbakọ. E nwere ihe ndị a na-edekarị n’ahụ́ gwongworo ndị ahụ. Otu n’ime ha bụ: “Ìgwè bụ ike.”
Ihe a ha na-ede na gwongworo ha bụ eziokwu. Mbọ ụmụnna anyị nọ na Naịjirịa gbara bara ezigbo uru, ma nke anyịnwa. Ka ọ na-erula n’afọ 1974, Naịjirịa bụ mba mbụ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ya ruru otu nari puku ma a gụpụ Amerịka. Ọrụ a mịpụtara ezigbo mkpụrụ.
Ka a nọ na-enwe mmụba ndị a, agha Biafra tiwapụrụ malite n’afọ 1967 ruo n’afọ 1970. Ruo ọtụtụ ọnwa, ụmụnna anyị nọ na Biafra anaghịzi enweta ozi ma ọ bụ akwụkwọ si n’aka alaka ụlọ ọrụ. Anyị gbara mbọ bugara ha akwụkwọ anyị, nyekwa ha akwụkwọ ozi ndị ga-agwa ha ihe ndị ha ga na-eme. Dị ka m kwuburu ná mmalite, anyị kpere ekpere, tụkwasịkwa Jehova obi, ya enyere anyị aka ịgafe osimiri ahụ ọtụtụ ugboro.
M ka na-echeta njem ndị ahụ tara akpụ anyị mere gafee Osimiri Naịja, n’agbanyeghị na ndị agha na-achọ onye ha ga-agbagbu, ọrịa nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike igbu anyị. Ọ dịghị mfe ịgafe ebe ndị agha Naịjirịa nọ, ya fọdụzie ịgafe ebe ndị agha Biafra nọ. O nwere otu abalị m ji ụgbọ epeepe si Asaba gafee Osimiri Naịja ahụ na-asọsị ike gaa Onitsha, mechaa gaa hụ ndị okenye nọ n’Enugu ma gbaa ha ume. Anyị gakwara Aba hụ ndị okenye ma gbaa ha ezigbo ume. N’oge ahụ, e nyere iwu ka ndị bi ebe ahụ ghara ịgbanye ọkụ n’abalị n’ihi ndị iro ha. Na Pọt Hakọt, anyị mechiri nnọkọ anyị na ụmụnna nwere ngwa ngwa n’ekpere mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ndị agha Biafra n’ebe dị nso ebe ahụ.
Nnọkọ ndị ahụ dị mkpa iji mee ka obi sie ụmụnna anyị ike na Jehova hụrụ ha n’anya ma na-elekọta ha. Anyị jikwa ohere ahụ mee ka ụmụnna mara na ha kwesịrị ịdị n’otu nakwa na ha ekwesighị itinye aka n’agha. Ụmụnna anyị nọ na Naịjirịa diri nsogbu niile agha ahụ kpataara ha. Ha gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya n’agbanyeghị na ndị mmadụ kpọrọ ibe ha asị n’ihi agbụrụ ha si. Ha nọgidekwara na-adị n’otu. Obi dị m ụtọ na m nyeere ha aka n’oge ahụ ihe taara ha akpụ.
N’afọ 1969, Nwanna Milton G. Henschel bụ onyeisi oche nke mgbakọ mba niile e nwere n’Ámá Egwuregwu Yanki dị na Niu Yọk. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Udo n’Elu Ụwa.” M mụtara ọtụtụ ihe n’aka Nwanna Henschel n’ihi na ọ bụ m na-enyere ya aka ná mgbakọ ahụ. Ihe ndị a m mụtara baara m ezigbo uru n’ihi na n’afọ 1970, anyị nwere mgbakọ mba niile na Legọs dị na Naịjirịa. Isiokwu ya bụ, “Ndị Ihe Ha Dị Ya Ezi Mma.” Ebe ọ bụ na e nwere mgbakọ a obere oge agha biri, anyị ma na ọ bụ Jehova mere ka ọ gaa siriri werere. Mgbakọ a pụrụ iche n’ihi na e ji asụsụ iri na asaa mee ya, ndị bịakwara ya dị otu narị puku na puku iri abụọ na otu, otu narị na iri abụọ na asatọ. Nwanna Knorr na Nwanna Henschel na ụmụnna ndị ọzọ ji ụgbọelu si Amerịka na Ịngland bịa mgbakọ a. Ha hụrụ otu n’ime ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptizim kachanụ kemgbe Pentikọst. Ha dị puku atọ, narị asaa na iri asaa na ise. Oge ahụ m so hazie mgbakọ ahụ bụ oge ọrụ kacha zuo m ahụ́ ná ndụ m niile. Otú ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa si amụba n’obodo a enweghị atụ.
E Ndị bịara mgbakọ mba niile isiokwu ya bụ, “Ndị Ihe Ha Dị Ya Ezi Mma.” Ha dị otu narị puku na puku iri abụọ na otu, otu narị na iri abụọ na asatọ. E mere ya n’asụsụ iri na asaa, tinyere Igbo
N’ime ihe karịrị iri afọ atọ m nọrọ na Naịjirịa, e nwere mgbe m jere ozi ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, jeekwa ozi ka onye nlekọta zoonu ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Obi tọrọ ndị ozi ala ọzọ ụtọ mgbe m letara ha ma gbaa onye ọ bụla n’ime ha ume. Obi tọkwara m ụtọ mgbe m gwara ha na nzukọ Jehova ejighị ha egwu egwu. Ọrụ a mere ka m ghọta na inwe mmasị n’ebe ụmụnna anyị nọ na-eme ka ha na-efe Jehova, na-emekwa ka nzukọ Jehova bụrụ a kwaa akwụrụ ma dịrị n’otu.
Ọ bụ aka Jehova nyeere anyị mere anyị ji die nsogbu agha ahụ kpatara, diekwa ọrịa ndị anyị rịara. Anyị na-ahụ na Jehova na-enyere anyị aka. Nwunye m kwuru, sị:
“Anyị rịara ịba ọtụtụ ugboro. E nwere nke di m rịara, ya emee ka ọ ghara ịma onwe ya, e buru ya gaa ụlọ ọgwụ na Legọs. A gwara m na o nwere ike ịnwụ, ma obi dị m ụtọ na o mechara gbakee. Mgbe ọ matara onwe ya, ọ gwara nọọsụ na-elekọta ya banyere Alaeze Chineke. Mụ na di m mechara gaa leta nọọsụ ahụ aha ya bụ Maazị Nwambiwe ka o nwekwuo mmasị na Baịbụl. O mechara bata n’ọgbakọ ma bụrụ okenye n’Aba. E nwekwara ọtụtụ ndị m nyeere aka ha abụrụ ezigbo ndị ohu Jehova. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Alakụba ji okpukpe ha kpọrọ ihe. Obi dị anyị ụtọ na anyị matara ụmụnna anyị ndị nọ na Naịjirịa, hụ ha n’anya, matakwa omenala ha na asụsụ ha.”
Anyị mụtakwara na ihe ga-eme ka anyị mee nke ọma n’ozi anyị na-eje ná mba ọzọ bụ ịhụ ụmụnna anyị n’anya n’agbanyeghị otú omenala ha si dịrị iche na nke anyị.
ỌRỤ ỌHỤRỤ E NYERE ANYỊ
Mgbe anyị jechara ozi na Betel dị na Naịjirịa, a gwara anyị ka anyị jewe ozi ala ọzọ n’agwaetiti mara mma dị na Sent Lushia dị na Karịbian n’afọ 1987. Ozi a tọgburu anyị atọgbu, ma e nwere nsogbu ndị dị na ya. N’Afrịka, ụmụ nwoke na-alụ karịa otu nwaanyị. Ma na Sent Lushia ebe a, nwoke na nwaanyị na-ebi n’alụghị otú iwu kwuru. Okwu Chineke nke na-akpa ike mere ka ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl lụọ otú iwu kwuru.
Ahụrụ m Oris n’anya nke ukwuu kemgbe afọ iri isii na asatọ anyị lụrụ
Mgbe ike bịara gwụwa anyị n’ihi na anyị emeela agadi, Òtù Na-achị Isi zigara anyị n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk, dị n’Amerịka, n’afọ 2005. M ka na-ekele Jehova kwa ụbọchị maka nwunye m Oris. Ọnwụ bịara gburu ya n’afọ 2015. Ọnwụ ya enyeghị m ọnụ okwu. Ọ bụ ezigbo nwaanyị. Ahụrụ m ya n’anya kemgbe afọ iri isii na asatọ anyị lụrụ. Anyị mụtara na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ ma n’alụmdi na nwunye ma n’ọgbakọ bụ ịkwanyere di na ndị okenye ùgwù, iji obi anyị niile na-agbaghara ndị mejọrọ anyị, ịdị umeala n’obi, na ịkpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.
Mgbe ihe na-agaghị otú anyị tụrụ anya ya ma ọ bụkwanụ mgbe anyị dara mbà n’obi, anyị rịọrọ Jehova ka o nyere anyị aka ịnọgide na-efe ya. Anyị chọpụtara na ka anyị na-ekwe ka Jehova na-agbazi anyị, ka ihe nọ na-akakwu mma. Anyị makwa na nke kacha mma ka dị n’ihu.—Aịza. 60:17; 2 Kọr. 13:11.
Jehova gọziri ozi ndị mụrụ m na ụmụnna ndị ọzọ jere na Trinidad na Tobego. Akụkọ ozi kacha ọhụrụ gosiri na Ndịàmà Jehova e nwere ebe ahụ ugbu a dị puku itoolu narị asatọ na iri itoolu na abụọ. N’Aruba, ọtụtụ ụmụnna gbasiri mbọ ike mee ka ọgbakọ m nọbu na ya kwụsie ike. E nwere ọgbakọ iri na anọ na-eme nke ọma ebe ahụ ugbu a. Na Naịjirịa, ndị nkwusa e nwere na ya ji ike mụbaa nke na ha dị narị puku atọ, puku iri asatọ na otu na narị atọ na iri itoolu na asatọ. N’agwaetiti Sent Lushia, ndị nkwusa dị narị asaa na iri asatọ na atọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ya ugbu a.
Akarịala m afọ iri itoolu ugbu a. Abụ Ọma 92:14 kwuru gbasara ndị a kụrụ n’ụlọ Jehova, sị: “Ha ka ga na-eme nke ọma n’isi awọ́ ha, Ha ka ga-agba agba, na-amakwa pokopoko.” Obi dị m ụtọ na m ji ndụ m jeere Jehova ozi. Ihe m mụtara n’aka nne na nna m mere ka m jiri obi m niile jeere Jehova ozi. Jehova hụkwara m n’anya ma kwe ka m ‘maa pokopoko n’ogige ụlọ Chineke m.’—Ọma 92:13.
a Gụọ Teta! Bekee nke March 8, 1972, peeji nke 24 ruo nke 26.