Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w19 Disemba p. 14
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Mgbe Di ma Ọ Bụ Nwunye Mmadụ Kwara Iko
    Teta!—2015
  • Olee Otú M Kwesịrị Isi Mesoo Nwa Agbọghọ nke Gosiri Mmasị n’Ebe M Nọ?
    Teta!—2005
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
w19 Disemba p. 14

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Baịbụl kwuru na ọ dịkarịa ala, mmadụ abụọ ga-agba akaebe tupu a mara na okwu bụ eziokwu. (Ọnụ Ọgụ. 35:30; Diut. 17:6; 19:15; Mat. 18:16; 1 Tim. 5:19) Ma, n’Iwu Mozis, ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, dinaa ya n’ike “n’ọhịa,” nwa agbọghọ ahụ etie mkpu, ikpe mara nke nwoke, ma aka nke nwaanyị dị ọcha. Ebe ọ bụ na o nweghị onye ọzọ hụrụ mgbe e dinara ya n’ike, gịnịzi mere aka ya ji dịrị ọcha, ikpe ama nke nwoke?

Ihe bụ́ isi e dere na Diuterọnọmi 22:​25-27 abụghị ka e gosi na ikpe mara nke nwoke, n’ihi na e bula ụzọ kwuo na ikpe mara ya. Ihe a chọrọ igosi n’Iwu ahụ bụ na aka nke nwaanyị dị ọcha. Ka anyị hụ ihe amaokwu ndị ọzọ kwuru.

Amaokwu ndị bu ụzọ kwuru gbasara nwoke hụrụ nwaanyị e kwere nkwa ọlụlụ ma dinaa ya “n’obodo.” Ihe ahụ o mere gosiri na ọ kwara iko ebe ọ bụ na e weere nwaanyị ahụ e kwere nkwa ọlụlụ ka onye lụrụla di. Nke nwaanyị kwanụ? “O tighị mkpu n’obodo.” A sị na o tiri mkpu, ndị ọzọ gaara anụ olu ya, bịa napụta ya. Ma, o tighịnụ mkpu. N’ihi ya, o kwetara ka ha kwaa iko. Ọ bụ ya mere e ji maa ha abụọ ikpe.​—Diut. 22:​23, 24.

Iwu ahụ kwuru ihe ọzọ dị iche. Ọ sịrị: “Otú ọ dị, ọ bụrụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, nwoke ahụ ewee bagide ya ma dinaa ya, nwoke ahụ nke dinara ya ga-anwụ naanị ya, emela nwa agbọghọ ahụ ihe ọ bụla. Nwa agbọghọ ahụ emeghị mmehie kwesịrị ọnwụ, n’ihi na ihe a dị nnọọ ka mgbe mmadụ biliri wakpo mmadụ ibe ya wee gbuo ya, ya bụ, gbuo mkpụrụ obi. N’ihi na ọ bụ n’ọhịa ka ọ hụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ e kwere nkwa ọlụlụ tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.”​—Diut. 22:​25-27.

Na nke ahụ, ndị ikpe kwetara ihe nwaanyị ahụ kwuru. N’ihi gịnị? Ha weere na nwaanyị ahụ “tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.” N’ihi ya, ọ kwaghị iko. Ma, nwoke ahụ dinara ya n’ike, kwaakwa iko, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na ọ ‘bagidere nwaanyị ahụ e kwere nkwa ọlụlụ ma dinaa ya.’

N’ihi ya, n’agbanyeghị na ihe bụ́ isi e kwuru n’iwu a bụ na aka nke nwaanyị dị ọcha, ọ dabara adaba na Diuterọnọmi 22:​25-27 kwuru na nwoke ahụ dinara nwaanyị ahụ n’ike, kwaakwa iko. Obi siri anyị ike na n’oge ahụ, ndị ikpe ‘na-enyocha ụdị okwu ahụ nke ọma’ ma jiri iwu doro anya Chineke nyere ugboro ugboro kpebie ya.​—Diut. 13:14; 17:4; Ọpụ. 20:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya