Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/97 p. 1
  • Nọgide Na-eso Jisọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-eso Jisọs
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye N’àjà Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Nwee Mmụọ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 5/97 p. 1

Nọgide Na-eso Jisọs

1 N’otu oge Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Mat. 16:24, NW) Anyị chọrọ n’ezie ịzaghachi nke ọma nye okwu Jisọs. Ka anyị nyochaa ihe nkebi ahịrị okwu ọ bụla nke ọkpụkpọ òkù ya gụnyere.

2 “Ya Jụ Onwe Ya”: Mgbe anyị raara ndụ anyị nye Jehova, anyị na-ajụ onwe anyị. Ihe bụ isi nke okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “jụ” pụtara bụ “ịsị ee e.” Nke ahụ pụtara na anyị na-eji ọchịchọ obi anyị hapụ agụụ, ọchịchọ, ntụsara ahụ, na ịchọ ihe ụtọ onwe anyị nanị—ebe anyị kpebisiri ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ruo mgbe nile ebighị ebi.—Rom 14:8; 15:3.

3 “Bulie Osisi Ịta Ahụhụ Ya”: Ndụ onye Kraịst bụ ndụ nke ibu osisi ịta ahụhụ nke ozi ịchụ àjà nye Jehova. Otu ụzọ a pụrụ isi gosipụta mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà bụ site n’ịdọgbu onwe onye n’ọrụ n’ozi ahụ. Ka ọ dị ugbu a n’afọ a, ọtụtụ ndị nkwusa anọwo na-anụ ụtọ nke ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ikekwe i so n’ime ha, ị pụkwara ikweta na ngọzi ndị ị na-enweta karịrị nnọọ àjà ndị ị na-achụ. Ndị na-enweghị ike ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka emewo ndokwa ọtụtụ mgbe itinyekwu oge n’ọrụ ime nkwusa dị ka ndị nkwusa ọgbakọ. Iji mezuo nke ahụ, ọgbakọ ụfọdụ na-edokwa nzukọ ije ozi ubi ha minit ole na ole n’oge karịa otú ha na-emebu. Ọtụtụ ndị nkwusa na-enwe ekele inwe oge a ka too ogologo maka ozi ubi. Ụfọdụ arụpụtawokwa ihe ndị magburu onwe ha, mgbe ha kpebiri ịkpọtụrụ ‘nanị otu ụlọ ọzọ’ ma ọ bụ ịrụ ọrụ ‘nanị minit ole na ole karị.’

4 Ụzọ ọzọ e si egosipụta mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà bụ site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye. Site n’iji nlezianya mee atụmatụ na ịgbanwe usoro ihe omume ha, ụfọdụ aghọwo ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ndị ọzọ enwewo ike idokwa ihe omume ha iji wepụta onwe ha maka ozi Betel ma ọ bụ Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ụfọdụ akwagawo n’ógbè ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze.

5 “Nọgidekwa Na-eso M”: Ọ bụ ezie na ndị na-eso ụzọ Jisọs nwetara ọtụtụ ule, ịnụ ọkụ n’obi na ntachi obi ya n’ozi ahụ gbara ha ume. (Jọn 4:34) Ọnụnọ ya na ozi ya mere ka mmụọ ha dịghachi ọhụrụ. Ọ bụ ya mere ndị soro ya ji gbukepụ ezi ọṅụ. (Mat. 11:29) Ka anyị n’otu aka ahụ gbarịta ibe anyị ume ịtachi obi n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ ahụ nke dị oké mkpa.

6 Ka anyị nile zaghachi nke ọma n’ọkpụkpọ òkù Jisọs ịnọgide na-eso ya site n’ịzụlite mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-enwe ọṅụ dị ukwuu ugbu a, anyị pụkwara ilepụ anya n’ihu maka ọbụna ngọzi ka ukwuu n’ọdịnihu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya