Akụkọ Ọchịchị Chineke
Benin: E nwere ndị nkwusa 5,331 bụ́ ndị nyere akụkọ ozi na November, nke ahụ bụkwa ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 59 ná ndị nkwusa n’esepụghị aka.
Cyprus: Mmụba pasent 2 na November wetara ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ ndị nkwusa 1,758. E nwekwara ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu ná ndị ọsụ ụzọ oge nile, na-enwe 136 nyere akụkọ ozi.
India: A hụrụ ọganihu dị mma n’ọrụ nkwusa ahụ na November mgbe ndị nkwusa 18,077 nyere akụkọ ozi ubi. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 39 n’esepụghị aka.
Liberia: Ọnụ ọgụgụ kasị elu a na-enwetụbeghị mbụ bụ́ ndị nkwusa 2,120 nyere akụkọ ozi ubi na November.
Solomon Islands: E ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa, na-enwe 1,393 ndị nyere akụkọ ozi na November.
Taiwan: Nkezi ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ka ọ dị ugbu a n’afọ ije ozi a bụ 3,516, nke ahụ bụkwa mmụba pasent 6 karịa nke afọ gara aga.