Ịsụ Ụzọ—Iji Oge Anyị Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya!
1 ‘Enwere m ọrụ karịrị m! Ọ̀ ga-abụrụ m ihe amamihe n’ezie ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ n’oge a?’ Otú a ka otu nwanna nwanyị chere mgbe ọ na-ege ntị ka otu okenye bụ́ ọsụ ụzọ na-ekwu okwu n’otu mgbakọ sekit n’isiokwu bụ́ “Iji Ozi Ọsụ Ụzọ Na-aga n’Ihu.” Otu nwanna nwoke na-eto eto so na-ege ntị n’otu isiokwu ahụ chere sị, ‘Olee otú o si ewepụta oge maka ịsụ ụzọ? Abụghị m okenye, ma ndụ m jupụtara n’ọrụ!’
2 Ka okenye ahụ gara n’ihu ikwu banyere ngọzi ndị a na-enweta n’ịsụ ụzọ, ọ gbara ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ sitere na sekit ahụ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị kọrọ banyere mgbanwe ndị ha meworo iji sụọ ụzọ na otú Jehova si gọzie mgbalị ha n’ụba. Otu nwere nkwarụ, otu nwere onye òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe, otu ahapụwokwa ọrụ ụwa ma nwee ike ibi ndụ ókè ego ọ na-akpata hà. N’ịnụ otú ndị ọsụ ụzọ a si na-enwe ihe ịga nke ọma site n’enyemaka Jehova, nwanna nwoke na nwanna nwanyị ahụ na-ege ntị malitere ịtụleghachi echiche na ọnọdụ nke ha. Anyị na-akpọku gị imekwa nke ahụ, karịsịa ebe ọ bụ na awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ ugbu a bụ nke ọtụtụ ndị nkwusa nke ozi ọma pụrụ ịrụzu.
3 Anyị ma na Jehova bụ Onye Okike na Eze Eluigwe na Ala nakwa na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. (Dan. 4:17; Ọrụ 17:28) O doro anyị anya na Jehova ji nanị otu nzukọ eme ihe. Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù iji iguzosi ike n’ihe na-eje ozi n’ime ya, na-akwado “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’ịgba àmà banyere Alaeze ahụ tupu ọgwụgwụ ahụ abịa. (Mat. 24:45; 25:40; 1 Pita 2:9) N’ịbụ ndị gamiworo na “mgbe ikpeazụ,” anyị na-aghọta na oge a ga-eji mee nkwusa na-abịa ná njedebe. (2 Tim. 3:1) Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ dị anyị mkpa ịkwado ezinụlọ anyị n’ụzọ ego. (1 Tim. 5:8) Ihe mmadụ na-akpata eyighị ka ọ na-emezu mkpa ya dị ka o mere n’oge gara aga. Ikekwe ahụ ike anyị adịghịzi otú ọ na-adịbu. N’ikwukwa eziokwu, anyị chọrọ inwe obere oge na ego iji zụrụ ihe dị anyị mkpa. (Ekli. 3:12, 13) Ya mere anyị pụrụ iche ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya n’ezie ịza òkù ahụ a na-akpọ ịsụ ụzọ.
4 Ọ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị iji nlezianya tụlee ọnọdụ anyị ma kpebie ma ànyị pụrụ ịsụ ụzọ. (Rom 14:12; Gal. 6:5) Ọ na-agba ume ịhụ ọnụ ọgụgụ mmadụ na-aba ụba bụ́ ndị zaworo òkù ahụ a na-akpọ ịsụ ụzọ. N’agbanyeghị nrụgide na nsogbu nke ụbọchị ikpeazụ ndị a, akụkọ ozi e bipụtara n’ime 1999 Yearbook na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 700,000 ndị Jehova n’ụwa dum na-aga n’ihu n’ozi ọsụ ụzọ. Ma hà na-eje ozi n’ọnọdụ akụ na ụba siri ike, n’enweghị ụzọ isi mee njem, na-enwe nsogbu ahụ ike, ma ọ bụ na-enwe ihe isi ike na nhụjuanya ndị ọzọ, ụmụnna nwoke na nwanyị ndị a adịghị ada mbà n’ime ihe ọma, nke a kwesịkwara ịja mma. (Gal. 6:9) Ha anabatawo òkù Jehova na-akpọ ka a nwaa ya. (Mal. 3:10) Ha chere na ịsụ ụzọ bụ nnọọ iji oge na ihe onwunwe ha dị ntakịrị eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya nakwa na Jehova agọziwo ha n’ezie n’ihi ime mgbanwe ndị dị mkpa iji banye ma nọgide n’ọrụ ịsụ ụzọ.
5 A Na-agọzi Ndị Ọsụ Ụzọ: Otu nwanna nwanyị na Cameroon bụ́ onye nwere otu nwatakịrị nwanyị na-akọ, sị: “Kemgbe m mụrụ ya, nwa m nwanyị na-esonyere m n’ozi mgbe nile. Ọbụna tupu ọ mụta ịga ije, ana m akwọrọ ya n’azụ m, jiri ákwà kee ya nke ọma. N’otu ụtụtụ anyị nọ n’ozi, akwụsịrị m n’akụkụ ụzọ ebe a na-ere ihe. Nwa m si n’ebe m nọ pụọ, na-achịrị ọtụtụ magazin n’akpa m. O jeere nwayọọ nwayọọ ruo n’ebe ọzọ a na-ere ihe. Ọ bụ ezie na ọ pụghị ikwu ọtụtụ ihe, ọ dọọrọ uche nke otu nwanyị ma chee ya otu magazin n’ihu. O juru nnọọ nwanyị ahụ anya ịhụ ka obere nwata dị otú ahụ na-ekere òkè n’ọrụ a. Ọ naara magazin ahụ ozugbo ma nakwerekwa ọmụmụ Bible ebe obibi!”
6 N’ịza òkù ahụ a kpọrọ maka inwekwu ndị ọsụ ụzọ inyeaka, otu okenye bụkwa onyeisi ezinụlọ na Zambia bụ́ onye na-arụ ọrụ ego oge nile kpebiri ịsụ ụzọ inyeaka n’agbanyeghị na o nweghị ohere. Ọ chọrọ isetịpụ ihe nlereanya maka ọgbakọ na ezinụlọ ya. N’oge ụfọdụ, ọ ga-akwụsị obere ụgbọala ya n’akụkụ ụzọ ma kpọọ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ nke dị na kaseti a na-ege ege, ọ na-akpọkwa ndị na-agafe agafe ka ha bịa gee ntị n’ihe a na-agụpụta. N’ụzọ dị otú ahụ, o nyefere akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ 16 na akwụkwọ Ihe Ọmụma 13, ọ malitekwara ọmụmụ Bible abụọ.
7 A hụkwara ezi mmụọ ịsụ ụzọ ná mba gbara ha agbata obi bụ́ Zimbabwe. N’April 1998, otu ọgbakọ nke 117 ndị nkwusa nọ na ya nyere akụkọ ozi nke ndị ọsụ ụzọ inyeaka 70 na ndị ọsụ ụzọ oge nile 9. Ọgbakọ ọzọ nke ndị nkwusa 94 nọ na ya nwere ndị ọsụ ụzọ inyeaka 58 nyere akụkọ ozi. N’ọzọkwa, nke 126 ndị nkwusa nọ na ya, nyere akụkọ ozi na mmadụ 58 kpebiri isoro ndị ọsụ ụzọ oge nile 4 ha nwere rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Afọ ije ozi gara aga bụ nke pụrụ iche na Zimbabwe. Ọ bụ ezie na ụmụnna nọ n’ebe ahụ ji nnọọ ihe omume ezinụlọ, ọrụ ọgbakọ, na iwu alaka ụlọ ọrụ n’aka, ha lekwasịrị anya n’iji amamihe tinye oge ha n’ozi.
8 Ndị ọsụ ụzọ na-aghọta na ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ na ịnọgide na ya adabereghị n’ume nke ha. Ha bụ ndị mbụ na-ekweta na ihe ọ bụla ha nwere ike ime bụ nke kwere omume n’ihi na ha “sitere n’ike ahụ Chineke na-enyezu.” (1 Pita 4:11) Okwukwe ha na-enyere ha aka ije ozi ha site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Kama ịnọ na-achọ ebe ọ ga-adịrị ha mfe na ntụsara ahụ, ndị ọsụ ụzọ na-enwe ihe ịga nke ọma na-aghọta na ọ pụrụ ịchọ ‘oké mgba’ iji gaa n’ihu, ma ha na-enweta ọtụtụ ngọzi n’ihi ya.—1 Tesa. 2:2.
9 Ihe Nlereanya Pọl Kwesịrị Nṅomi: Bible dekọrọ ihe Pọl onyeozi rụzuru n’ozi na ezi enyemaka o nyeere ọtụtụ ndị mmadụ. Ma, ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla bu ibu karịrị ya, ọ bụ Pọl. O diri mkpagbu na ihe isi ike anụ ahụ iji kwusaa ozi ọma na iji wusie ọgbakọ dị iche iche ike. Ọ ghaghịkwa ịnagide otu ajọ nsogbu ahụ ike. (2 Kọr. 11:21-29; 12:7-10) O kpebisiri ike iji oge ya mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. O kwetara na ya rụrụ ọrụ ya nile site n’enyemaka Jehova. (Fil. 4:13) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ Pọl nyeere aka ga-enwe ihe ọ ga-eji kwubie na oge na mgbalị Pọl tinyere n’ozi Jehova bụ ihe efu ma ọ bụ na ọ gaara eji ya mee ihe ka mma. Leenụ, anyị ka na-erite uru taa site n’ụzọ Pọl si jiri oge ya mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya! Lee ka anyị si enwe ekele maka ndụmọdụ ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ iji nyere anyị aka inyocha ihe ndị ka mkpa ma rapara n’eziokwu ahụ n’oge ndị a siri ike!
10 Ugbu a dị ka ọ na-adịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ, ‘e mewo ka oge iji kwusaa ozi ọma ahụ dị mkpụmkpụ.’ (1 Kọr. 7:29; Mat. 24:14) Ya mere, o kwesịrị ekwesị ịjụ onwe anyị sị, ‘Ọ bụrụ na m gaje ịnwụ echi na mberede, àpụrụ m ịgwa Jehova taa na ejiriwo m oge m mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya?’ (Jes. 4:14) Gịnị ma ị gwa Jehova okwu n’ekpere ugbu a, na-emesi ya obi ike banyere ọchịchọ gị iji oge gị eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya dị ka otu n’ime Ndịàmà ya? (Abụ Ọma 90:12) Kpee ekpere maka enyemaka Jehova iji mee ka ndụ gị dị mfe. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị kachapụwo ya na mbụ, ọ̀ pụrụ ịbụ na ị chọpụtawo ugbu a na ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ ịbata n’ime ihe ndị ị na-eme na ndụ?
11 Jiri Ọnọdụ Gị Rụpụta Ihe Kasị Mma: N’ụzọ kwere nghọta, n’ihi ọnọdụ dị iche iche ọ bụghị ndị nile ọ bụ ọchịchọ ha pụrụ iwepụta awa 70 n’ọnwa iji jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nkwusa na-ahazi oge ha iji wepụta awa 50 n’ọnwa iji jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka ọtụtụ mgbe dị ka ha nwere ike ma ọ bụ n’akwụsịghị akwụsị. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị bụ nke na-agaghị ekwe ka ị rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile ugbu a, adala mbà n’obi. Nọgide na-ekpe ekpere ka ọnọdụ gị gbanwee. Ka ọ dịgodị ugbu a, ọ bụrụ na ị pụghị nnọọ ime mgbanwe, nwee nkasi obi na obi na-adi Jehova ụtọ n’ihe ọ bụla i nwere ike iji mkpụrụ obi gị dum mee n’ozi ya. (Mat. 13:23) Ọ na-ahụ na ị na-akwadosi ya ike nakwa na ị na-agbasi mgba ike ịbụ onye nkwusa kwesịrị ntụkwasị obi na-adịghị ekwe ma ọlị ka otu ọnwa gafee n’ejighị ohere ndị dapụtaranụ gbaa àmà. Ikekwe ị pụrụ inwe ọganihu site n’imeziwanye nkà gị n’ịgba àmà, na-arụ ọrụ iji na-eme nke ọma dị ka onye nkwusa na onye na-ezi ozi ọma.—1 Tim. 4:16.
12 Ebe ọ bụ na “ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu” nke Jehova dị nnọọ nso, ọ dị anyị mkpa iji oge nke fọdụrụnụ mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na anyị ga-arụcha ọrụ e nyere anyị. (Joel 2:31) Setan maara na oge ya dị mkpirikpi, dịkwa ka ọ na-adịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ, ọ na-agbalị ime ihe nile o nwere ike ime iji tinye ọgba aghara ná ndụ anyị ma mee ka o siere anyị ike itinye uche n’ihe ndị dị mkpa n’ezie. (Fil. 1:10; Mkpu. 12:12) Ya adịla mgbe i ledara mmasị Chineke nwere n’ebe ị nọ anya. Jehova pụrụ inyere gị aka ime ka ndụ gị dị mfe, na ka i mee ihe nile ị pụrụ ime n’ozi. (Abụ Ọma 145:16) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị na-achọpụta, n’inyochagharị ọnọdụ ha, na ha pụrụ isonyere ìgwè ndị ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ọsụ ụzọ oge nile. N’ezie, ndị ọsụ ụzọ na-enwe afọ ojuju dị ukwuu n’iji oge ha eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ị̀ ga-abụ otu n’ime ha?