Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/00 p. 1
  • “Mụrụnụ Anya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mụrụnụ Anya”
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nọgidenụ Na-eche Nche”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Mụrụ Anya na “Mgbe Ọgwụgwụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ngọzi Na-adịrị Ndị Na-eche Nche!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 5/00 p. 1

“Mụrụnụ Anya”

1 Mgbe ọ kọwasịrị ihe omume ndị dị mkpa bụ́ ndị ga-aka mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a akara, Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘mụrụ anya.’ (Mak 13:33) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji mụrụ anya? N’ihi na anyị na-ebi n’oge kasị dịrị egwu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Anyị ekwesịtụghị iro ụra n’ụzọ ime mmụọ. Nke ahụ ga-eme ka anyị ghara iji ọrụ Jehova nyere anyị ịrụ na mgbe ọgwụgwụ a kpọrọ ihe. Olee ọrụ ọ bụ?

2 Jehova na-eme ka ndị ya kpọsaa ozi ọma banyere Alaeze ya n’ụwa nile—nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Anyị isoro nzukọ Chineke na-arụkọ ọrụ na-eme ka a mara anyị dị ka ndị Kraịst bu oge ndị a na ịdị mkpa nke inyere ndị ọzọ aka ịnụ “okwu nke ndụ ebighị ebi” n’uche. (Jọn 6:68) Site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ a dị oké mkpa, anyị na-enye ihe àmà na anyị mụ anya n’ụzọ ime mmụọ.

3 Ndị A Kpaliri Ime Nkwusa: Dị ka ndị àmà Jehova, anyị kwesịrị inwe echiche ziri ezi banyere ozi anyị. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ na-akpali anyị n’otu n’otu ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. (1 Kọr. 9:16, 17) Site n’ime otú ahụ, anyị ga-azọpụta onwe anyị nakwa ndị na-anụ olu anyị. (1 Tim. 4:16) Ka anyị kpebisie ike ikerechi òkè anya ruo n’ókè o kwere mee ma tinye oge ruo n’ókè ọ dị mkpa n’ikwusa banyere ọchịchị kasị mma nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inwe—Alaeze Chineke!

4 Otu eziokwu dị mkpa na-eme ka anyị ghọta ịdị ngwa nke ozi anyị—ntiwapụ nke oké mkpagbu ahụ ga-abịa mgbe anyị ka na-arụ ọrụ a. Ọmụma anyị na-amaghị ụbọchị na awa ahụ chọrọ anyị ịmụrụ anya na ịdị njikere mgbe nile, na-eji ekpere adabere na Jehova. (Efe. 6:18) Ebe a na-arụ ọrụ nkwusa ahụ nọgidere na-amụba. Ma otu ụbọchị n’oge na-adịghị anya, ọrụ ịgba àmà kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu.

5 Jiri ikwesị ntụkwasị obi na-agbaso iwu Jisọs nyere ka a ‘mụrụ anya.’ Nke a dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ka anyị jiri echiche nke ịdị ngwa mee ihe. Taa na kwa ụbọchị, ka anyị mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, nọrọ na nche ma na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Ee, ka anyị “na-eche nche nweekwa anya udo.”—1 Tesa. 5:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya