Igbe Ajụjụ
◼ Olee otú ndị atendantị pụrụ isi nyere ndị nne na nna aka ime ka ụmụ ha na-anọ jụụ ná nzukọ?
Ụmụaka na-abụkarị ndị mgbagharị, ọ bụghị àgwà ha ịnọdụ ala ruo ogologo oge. Mgbe a gbasara nzukọ, ụmụaka nwere ume nke pụrụ ime ka ha chọọ ịgbagharị na ịchụgharị ụmụaka ndị ọzọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ a na-enwe nzukọ, n’ebe a na-adọba ụgbọala, ma ọ bụ n’akụkụ okporo ụzọ. Otú ọ dị, dị nnọọ ka otu ilu na-ekwu: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.”—Ilu 29:15.
Ọ dị mwute ikwu na e merụwo ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị bụ́ ndị agadi ezigbo ahụ n’ihi na ụmụaka gbaara ọsọ kwatuo ha. Nke a akpataworo ndị nne na nna ha na ọgbakọ ahụhụ na mfu na-enweghị isi. Maka nchebe ha na nke ndị ọzọ, e kwesịghị ikwe ka ụmụaka na-agbagharị ma na-egwu egwu n’ime ma ọ bụ n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ndị nne na nna nwere ibu ọrụ nke Akwụkwọ Nsọ nyere ha ịzụ ụmụ ha ka ha kwanyere ebe ndị anyị na-anọ efe ofufe ùgwù kwesịịrị ya. (Ekli. 5:1a) Ná nzukọ ndị Kraịst nakwa ná mgbakọ anyị dị iche iche, e nyere ndị atendantị ọrụ ịhụ na ‘e mere ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya’ nakwa na e nwere “usoro dị mma.” (1 Kọr. 14:40; Kọl. 2:5, NW) Ha aghaghị ịnọ na nche tupu ihe omume amalite, mgbe ọ na-aga n’ihu, na mgbe ọ gasịrị, ma n’ime ụlọ ma n’èzí. Ọ bụrụ na nwatakịrị na-agbagharị ma ọ bụ na-eme aghara, onye atendantị pụrụ iji nwayọọ kwụsị nwa ahụ, ọ pụkwara ịkọwara ya ihe mere na omume ndị dị otú ahụ adịghị mma. E kwesịkwara iji obiọma gwa nne ma ọ bụ nna nwa ahụ banyere nsogbu ahụ na mkpa ọ dị ilekọta nwa ahụ. Nne ya ma ọ bụ nna ya kwesịrị imeghachi omume n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
O kwere nghọta na mgbe ụfọdụ ụmụ ọhụrụ na ụmụaka pụrụ ibe ákwá ma ọ bụ malite inye nsogbu n’oge nzukọ. Site ná ndị atendantị ịbịa n’oge, ya dịkarịa ala minit 20 tupu ihe omume amalite, ha pụrụ ịhapụrụ ndị nne na nna ga-achọ isoro ụmụ ha nọrọ oche ikpeazụ ụfọdụ dị n’ụlọ nzukọ. Anyị nile kwesịrị inye nkwado site n’ịhapụrụ ha oche ndị ahụ.
Ọ bụrụ na nwatakịrị na-enye nsogbu, nne ma ọ bụ nna ya kwesịrị ime ihe. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ya emeghị ihe ọ bụla, nsogbu ahụ ewee ghọọ ihe ndọpụ uche, onye atendantị kwesịrị iji obiọma jụọ ma nne ma ọ bụ nna ahụ ọ̀ ga-achọ ịkpọpụ nwa ahụ èzí. Mgbe anyị kpọrọ ndị ọhụrụ nwere ụmụaka òkù ịbịa nzukọ, anyị kwesịrị isoro ha nọrọ ma nyere ha aka ilekọta ụmụaka ha ma ha na-ebe ákwá ma ọ bụ na-enye nsogbu n’ụzọ ndị ọzọ.
Ọ na-enye anyị ọṅụ ịhụ ụmụaka nọ n’afọ ndụ nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ịhụ àgwà ọma ha n’ezinụlọ Chineke. (1 Tim. 3:15) Site n’ịkwanyere ndokwa Jehova mere maka ofufe ùgwù, ha na-enye ya nsọpụrụ ma bụrụ ndị na-enye mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ọṅụ.