Ị̀ Bụ Onye Ihere?
1 Ọ dịghị eju anyị anya mgbe anyị hụrụ obere nwa ka o si n’azụ nne ya ma ọ bụ nna ya na-enyo anyị. Ime ihere na nwata bụ ihe dị otú o kwesịrị. Ọbụnadị mgbe ha mere okenye, ụfọdụ ka na-emetụ ihere. Ọ bụrụ na ime ihere na-emetụta òkè ị na-ekere n’ozi, gịnị ka ị pụrụ ime?
2 Imeri Ihere: Ọ dị mkpa ilebara “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi” anya. (1 Pita 3:4) Mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova na onye agbata obi gị nọ sie ike. Nwee nkweta zuru ezu na ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi gosipụta ịhụnanya nke iji onwe onye achụ àjà. Nwee usoro dị mma maka inwe ọmụmụ ihe onwe onye na ịga nzukọ. Na-ekpe ekpere mgbe nile nakwa kpọmkwem maka enyemaka Jehova. Okwukwe siri ike na ịtụkwasị ya obi ga-ewulite obi ike anyị, meekwa ka anyị “nwebiga anyaike ókè ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Fil. 1:14.
3 Lụsoo mmetụta nke erughị eru ọgụ. O yiri ka Timoti aghaghị ime nke a. Pọl gbara Timoti ume ka ‘ọ ghara ikwe ka onye ọ bụla lelịa nwata ọ bụ anya,’ na-echetara ya na “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike.” (1 Tim. 4:12; 2 Tim. 1:7) Jehova ji Timoti mee ihe n’ụzọ zuru ezu, ọ ga-ejikwa gị mee ihe ma ọ bụrụ na i jiri obi ike zuru ezu n’ebe Ọ nọ gaa n’ihu.—Abụ Ọma 56:11.
4 Ịtụgharị uche n’otu akụkụ Bible, dị ka Matiu 10:37, nyeere otu nwanna nwanyị aka, bụ́ onye ime ihere ya mere ka ọ na-atụ di ya na-emegide ya egwu. Ka ọ nọgidesiri ike, ozi ahụ dịwanyeere ya mfe, n’ikpeazụ, di ya, nne ya, na ụmụnne ya nile nakweere eziokwu!
5 Ime Nkwadebe Dị Oké Mkpa: Obi ike gị ga-esikwu ike mgbe ị kwadoro nke ọma maka ozi. Họrọ ụzọ iche ihe n’ihu dị mfe site n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible ma ọ bụ ná mbipụta ndị gara aga nke Ozi Alaeze Anyị, mụọ ya ma mụgharịa ya. Kama ịmalite nwewe nchegbu na-enweghị isi, nwee echiche ziri ezi. Nweta obi ike site n’iso ndị ọzọ na-arụchi ọrụ anya. Buru n’uche na ọtụtụ n’ime ndị ị ga-ezute n’ọnụ ụzọ na-eme ihere, dị nnọọ ka gị. Ozi Alaeze ahụ dị onye ọ bụla mkpa.
6 Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, ike agwụla gị. Ka ị na-agbalịsi ike, Jehova ga-enyere gị aka ịghọ onye nkwusa dị irè nke ozi ọma ahụ. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọṅụ n’ozi gị.—Ilu 10:22.