Ndị Nne na Nna—Kụnyenụ Ezi Àgwà n’Ime Ụmụ Unu
1 A dịghị ebu ezi àgwà apụta ụwa, a dịghịkwa enweta ya na mberede. Ọzọkwa, ịkụnye ezi àgwà n’ime ụmụaka na-ewe oge. “Ịkụnye” pụtara “iji nwayọọ nwayọọ na-akụzi ihe” ma ọ bụ “ime ka ihe na-abanye nke nta nke nta.” Ọ chọrọ ndị nne na nna ime ihe mgbe nile ka ha wee “na-azụpụta [ụmụ ha] n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Efe. 6:4.
2 Malitenụ na Nwa Ọhụrụ: Ikike ụmụaka nwere ịmụta na ime ihe ọhụrụ dị ịrịba ama. Ọ bụ ezie na ọ na-esikarịrị ndị toworo eto ike ịmụta asụsụ ọhụrụ, ụmụaka na-etorubeghị ogo ịga akwụkwọ pụrụ ịmụta asụsụ abụọ ma ọ bụ atọ n’otu oge. Echekwala na nwa gị etorubeghị ịzụlite ezi àgwà. Ọ bụrụ na a malite ịkụziri nwatakịrị eziokwu Bible na nwata, a nọgidekwa na-eme otú ahụ, ka ọ na-erule afọ ole na ole, uche ya ga-ejupụta n’ihe ọmụma nke ga-eme ka ọ bụrụ “onye amamihe ịnata nzọpụta.”—2 Tim. 3:15.
3 Meenụ Ka Ozi Ubi Bụrụ Àgwà Unu: Otu ezi àgwà nke a ga-akụnye n’ime nwatakịrị mgbe ọ ka nọ n’afọ ndị a pụrụ ịkpụzi uche ya na ha bụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụzọ chiri anya. Ọtụtụ ndị nne na nna na-amalite nke a site n’ịkpọrọ ụmụ ha na-aga ozi ụlọ n’ụlọ n’oge ụmụ ha bụ ụmụ ọhụrụ. Òkè chiri anya nne na nna na-ekere n’ọrụ ịgba àmà na-enyere ụmụ ha aka ịzụlite ekele na ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ. Ndị nne na nna pụrụ igosi ụmụ ha ụzọ isi na-ekere òkè n’ịgba àmà n’akụkụ nke ọ bụla nke ozi ubi.
4 Idenye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enyekwara ụmụaka aka. Ọ na-eme ka ha zụlite ezi àgwà nke ịmụ ihe ma mee ka ha mụta otú e si agụ ihe ma ghọta ya. Ha na-amụta inwe mkparịta ụka banyere Bible, ịga nletaghachi, na iduzi ọmụmụ Bible. Ọzụzụ dị otú ahụ pụrụ ịkpali ha ịsụ ụzọ na iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ iche. Ọtụtụ ndị ọrụ Betel na ndị ozi ala ọzọ na-eji mmasị echeta oge ha malitere ime ihe omume n’ụlọ akwụkwọ ma na-ewere ya dị ka ndokwa nyeere ha aka ịzụlite ezi àgwà.
5 Anyị nile yiri ụrọ nke dị n’aka Ọkpụite Ukwu ahụ, bụ́ Jehova. (Aịsa. 64:8) Ka ụrọ ahụ dịruru ná nro, otú ahụ ka ọ na-adịru mfe ọkpụkpụ. Ka ọ na-akpọkwu nkụ, otú ahụ ka ọ na-esiwanye ike ọkpụkpụ. Otú ahụ ka ụmụ mmadụ dị. Mgbe ha bụ ụmụaka, ha na-ekwe mkpụzi karị—ka ha bụrukwara ụmụaka, otú ahụ ka ọ na-akaru mma. Mgbe ha ka bụ obere ụmụaka bụ mgbe a pụrụ ịkpụzi echiche ha, mgbe a ga-akpụzi ha n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya, malite na nwata kụnyewa n’ime ụmụ gị ezi àgwà n’ozi ndị Kraịst.