Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/01 p. 8
  • Jehova Na-enye Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-enye Ike
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Na-achọnụ Jehova na Ike Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova Ga-enye Gị Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Jehova Na-enye Onye Dara Mbà Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 2/01 p. 8

Jehova Na-enye Ike

1 Gịnị bụ echiche gị banyere Pọl onyeozi? Ka anyị na-agụ akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, anyị na-aghọta otú o si dị uchu n’ozi Jehova. Olee otú Pọl si rụzuo ihe nile ọ rụzuru? Ọ sịrị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Fil. 4:13) Anyị onwe anyị kwa pụrụ irite uru site n’ike nke Jehova na-enye. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji ndokwa isii ọ na-eme ka anyị wee nwetaghachi ume ma wusie anyị ike n’ụzọ ime mmụọ na-eme ihe.

2 Okwu Chineke: Dị nnọọ ka anyị na-aghaghị ịdị na-eri nri iji nọgide na-enwe ume nkịtị, anyị aghaghị iji Okwu Chineke na-azụ onwe anyị iji nọgide na-adị ndụ n’ụzọ ime mmụọ. (Mat. 4:4) Bible na-enye ike iji kwagide anyị. Iji nọgide na-enwe ịnụ ọkụ n’obi na mkpali maka eziokwu ahụ, ọ dị anyị mkpa ịdị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche bara uru, kwa ụbọchị ma o kwe mee.—Abụ Ọma 1:2, 3.

3 Ekpere: Ọ dị mkpa ịbịaru Jehova nso, karịsịa n’oge e nwere mkpa pụrụ iche. Site na mmụọ ya, ọ na-enye ndị ji ekpere na-arịọ maka ya, ike nke na-enye ume. (Luk 11:13; Efe. 3:16) Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’ (Rom 12:12) Ị̀ na-eme nke ahụ?

4 Ọgbakọ: Anyị na-enwetakwa ume na agbamume site ná nzukọ ọgbakọ na site ná mkpakọrịta ịhụnanya nke anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-enwe n’ebe ahụ. (Hib. 10: 24, 25) Mgbe anyị na-enwe nchegbu, ha na-enye aka agba anyị ume ma na-enyere anyị aka n’ịhụnanya.—Ilu 17:17; Ekli. 4:10.

5 Ozi Ubi: Ikerechi òkè anya n’ozi na-enyere anyị aka ịtụkwasị uche n’Alaeze ahụ na ngọzi ya. A na-ewuli mmụọ anyị elu mgbe anyị nyeere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova. (Ọrụ 20:35) Ọ bụghị anyị nile pụrụ ịga jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ma ọ bụ ikere òkè n’ozi oge nile, ma anyị pụrụ ikere òkè gbara ọkpụrụkpụ n’ozi n’ụzọ ndị ọzọ.—Hib. 6:10-12.

6 Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Nlekọta: Anyị na-erite uru site n’agbamume na enyemaka ndị okenye na-enye. Jehova ekenyewo ha ọrụ ịzụ atụrụ Chineke nke e nyere ha ilekọta. (1 Pita 5:2) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ewuli ọgbakọ ndị ha na-eleta elu, ọbụna dị ka Pọl mere n’oge nke ya.—Rom 1:11, 12.

7 Ihe Nlereanya nke Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi: Ọ bụ ihe na-enyeghachi ume ịtụle ihe nlereanya ọma nke ndị ọrụ ibe anyị na-ekwesị ntụkwasị obi, ma n’oge ochie ma n’oge a. (Hib. 12:1) Mgbe ọ dị gị mkpa inwetaghachi ume, gịnị ma ị gụọ otu n’ime akụkọ ndụ na-agba ume bụ́ ndị dị na magazin anyị, akụkọ na-ewuli elu dị na Yearbook, ma ọ bụ ụfọdụ n’ime akụkọ na-akpali akpali banyere akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’oge a n’akwụkwọ Proclaimers?

8 Otu nwanna nwoke, onye dị afọ 90 na ụma ugbu a, natara eziokwu mgbe ọ bụ obere nwa. Mgbe ọ ka bụ onye na-eto eto, e lere okwukwe ya ule. Nke mbụ, ụfọdụ n’ime ndị na-esobu ọgbakọ emekọ ihe n’ụzọ chiri anya hapụrụ nzukọ Jehova. Ọzọkwa, e nwere ọrụ ụlọ n’ụlọ, bụ́ nke siere ya ike. Ka o sina dị, ọ dabeere n’ebe Jehova nọ mgbe nile. N’oge na-adịghị anya, ozi ahụ malitere ịtọ ya ụtọ. Taakwanụ? N’agbanyeghị ahụ esighị ike, ọ ka bụ onye òtù ezinụlọ Betel dị na Brooklyn, soro n’Òtù Na-achị Isi. Ọ dịghị akwa ụta na ya nọgidesiri ike ná nzukọ Jehova.

9 E mere otu nwanna nwanyị, bụ́ onye òtù ezinụlọ Betel dị na Britain, baptism mgbe ọ dị afọ 13. Ya na nwanne ya nwoke malitere ịsụ ụzọ n’afọ na-eso ya, n’afọ sochikwara ya, a tụrụ nna ya mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ nọgidere na-adabere n’ebe Jehova nọ maka ike, ọ nọgidekwara na-ejere ezi Chineke ahụ ozi. Ka oge na-aga, otu nwanna nwoke nke kwesịrị ntụkwasị obi lụrụ ya, ha abụọ nọgidekwara na-eme uche Jehova. Mgbe ha lụworo di na nwunye ruo afọ 35, di ya nwụrụ na mberede. Ọzọkwa o nwetara ike site n’ebe Jehova nọ, ọ nọgidewokwa na-aga n’ihu ruo taa, na-atụ anya ịnọgide na-eje ozi ruo mgbe ebighị ebi dị ka onye òtù ezinụlọ elu ala nke Jehova.

10 Jehova na-enyere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi aka ma na-eme ka ha nweghachi ume. “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.” Anyị pụrụ inweta ike site n’isi iyi a nke ike na-adịghị agwụ agwụ site n’iji ndokwa isii ahụ dum e hotara n’elu na-eme ihe. Cheta: “Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha, . . . ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsa. 40:29-31) Pọl dabeere nke ukwuu n’ebe Jehova nọ iji nweta ike, anyị aghaghịkwa ime otú ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya