Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/01 p. 8
  • Gbaa Àmà Dị Ka Ezi Onye Agbata Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gbaa Àmà Dị Ka Ezi Onye Agbata Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ndị Agbata Obi Bara Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Hụ Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ị̀ Hụrụ “Onye Agbata Obi Gị n’Anya Dị Ka Onwe Gị”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 4/01 p. 8

Gbaa Àmà Dị Ka Ezi Onye Agbata Obi

1 Jisọs kwuru ka ị ‘hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ (Mat. 22:39) Obi abụọ adịghị ya na ị “na-arụ ezi ihe” n’ebe ndị kwere ekwe ibe gị nọ, ma ị̀ pụrụ ịgbasaru ịhụnanya gị n’ebe ndị bi gị nso nọ? (Gal. 6:10) N’ụzọ ndị dị aṅaa?

2 Site n’Ime Ka A Mara Gị: Ndị agbata obi gị hà maara na ị bụ Onyeàmà? Ọ bụrụ na ha amaghị, gịnị ma ị kpọtụrụ ha n’ozi ubi? Ihe ndị ga-esi n’ime ya pụta pụrụ ịtụ gị n’anya! Ma ọ bụ ọ bụrụ na ahụ ga-aka iru gị ala, gbalịa ịgbara ha àmà mberede. Mgbe ị nọ n’èzí, ị pụrụ ịhụ ha ka ha na-arụ ọrụ na mbara èzí ha ma ọ bụ na-eme mkpagharị n’ámá. Jiri ezi ihu ọchị jekwuru ha. Gbalịsie ike ikwu banyere ihe ndị i kweere, ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, na ihe a na-eme n’ebe ahụ, meekwa ka ha mara onye ọ bụla ọzọ bi unu nso na-aga ya. Kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ. Kpebisie ike ịgbara onye ọ bụla ị maara àmà nke ọma banyere ozi ọma ahụ.—Ọrụ 10:42; 28:23.

3 Site n’Àgwà Gị Kwesịrị Nṅomi: Gị inwe omume enyi na-ekwusi okwu ike banyere gị, o nwekwara ike imeghe ụzọ maka ịgba àmà. Ọ ‘na-achọkwa ozizi nke Chineke mma.’ (Taị. 2:7, 10) Gosi ezi mmasị n’ebe ndị agbata obi gị nọ. Nwee omume enyi na obi ebere. Kwanyere ikike ha nwere ịnọrọ onwe ha na ịnọ ebe dị jụụ ùgwù. Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha arịawa ọrịa, chebara ya echiche ma jụọ ma ị pụrụ inye aka. Mgbe otu ezinụlọ kwabatara ọhụrụ n’ógbè unu, gaa kelee ha. Àgwà obiọma ndị dị otú ahụ na-eme ka e nwee mmetụta dị mma ma na-atọ Jehova ụtọ.—Hib. 13:16.

4 Site n’Ọdịdị nke Ihe Onwunwe Gị: Ịbụ ezi onye agbata obi na-agụnye ilekọta ụlọ gị ka o wee dị mma n’anya. Ụlọ na mbara èzí dị ọcha ma dị mma n’anya bụ àmà n’onwe ha. Ma ụlọ nke ruru unyi ma ọ bụ nke a tụfusịrị ihe ndị mebiri emebi aghara aghara na ya yiri ka ọ̀ ga-adọpụ uche n’ebe ozi Alaeze ahụ dị. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa idebe ebe obibi, mbara èzí na ụgbọala gị ọcha nakwa n’ọnọdụ dị mma.

5 Ichebara ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst echiche na-egosipụta ịhụnanya i nwere maka ndị agbata obi gị. Gịnị pụrụ isi n’ime ya pụta? Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ‘site n’ọrụ ọma gị nile, nke ha na-ele anya,’ ụfọdụ n’ime ha pụrụ ‘inye Chineke otuto.’—1 Pita 2:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya