Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
Otu nkọwa e nyere egwu bụ “nsọpụrụ ofufe miri emi na ụjọ, karịsịa n’ebe Chineke nọ.” Nke a na-akọwa egwu dị mma e zoro aka na ya n’Akwụkwọ Nsọ dị ka “mmalite amamihe.” (Ọma 111:10) N’ụzọ megidere nke ahụ, ụdị egwu ọzọ ji ụwa Setan nke gbara anyị gburugburu. Olee otú anyị pụrụ isi zere mmetụta ahụ na-adịghị mma ka anyị na-azụlite egwu nsọpụrụ n’ebe Jehova nọ? Usoro ihe omume ọhụrụ maka mgbakọ sekit nke afọ ije ozi 2002 ga-aza ajụjụ a. Isiokwu ya bụ “Tụọnụ Egwu Chineke, Nyekwa Ya Otuto.” (Mkpu. 14:7) Anyị ga-aghọta ọtụtụ ụzọ egwu Jehova si abara anyị uru n’otu n’otu nakwa dị ka nzukọ.
Ọ bụ ezie na egwu pụrụ ịpụta nchegbu ma ọ bụ enwekwaghị obi ike na achọghị iche ọnọdụ ndị siri ike ihu, Bible na-ekwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ.” (Ọma 128:1) Ihe omume mgbakọ ahụ ga-egosi anyị otú anyị pụrụ isi na-anagide ihe ịma aka dị iche iche nke ezi ofufe n’ụzọ na-aga nke ọma. Anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi enyere ndị ọhụrụ aka ịzụlite ezi egwu dị otú ahụ n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke ga-akwali ha n’ezie iji obi, mkpụrụ obi, uche, na ike ha dum jeere ya ozi. (Mak 12:30) Ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ ga-eji okwu onye nlekọta distrikti bụ́ “Nọgide Na-abịaru Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nso” mechie. Ọ ga-akọwa otú anyị pụrụ isi mụrụ anya maka mgbalị Ekwensu na-eme iji dọpụ anyị n’ebe Jehova, ezinụlọ anyị, na ụmụnna anyị ndị Kraịst nọ.
“Tụọ Jehova Egwu, Ọ Bụghị Mmadụ” bụ isiokwu nke usoro isiokwu nwere akụkụ anọ bụ́ ndị a ga-ekwu n’ụbọchị nke abụọ. Ọ ga-akọwa ihe mere anyị na-aghaghị iji zere egwu ọ bụla ga-egbochi anyị ijezu ozi anyị ma ọ bụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma na-enwe ezi akọ na uche n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ọrụ nakwa otú anyị ga-esi mee ya. Okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Tụọ Egwu Chineke, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu” dabeere n’usoro ihe omume a kọwara ná Mkpughe isi 14. Mgbakọ sekit ahụ ga-eji ntụziaka na-agba ume bụ́ “Nọgide Na-eje Ije n’Egwu Jehova” mechie.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Nzukọ Ije Ozi ihe nlereanya, okwu baptism, na nchịkọta Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche bụ ihe ndị ọzọ ga-apụta ìhè n’usoro ihe omume ahụ nke na-ekwesịghị ịkwa gị. Kpọọ ndị ị na-amụrụ Bible òkù iso gị gaa. Onye ọ bụla chọrọ ka e mee ya baptism kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ngwa ngwa o kwere mee. Anyị nile kwesịrị igosipụta egwu dị mma n’ebe Jehova nọ ma nye ya otuto site n’ịghara ikwe ka akụkụ ọ bụla nke usoro ihe omume a dị ịrịba ama kwaa anyị!