Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/01 p. 8
  • Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Ime Nkwusa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Ime Nkwusa?
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ì Ji Ọrụ n’Aka Gabiga Ókè?
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 9/01 p. 8

Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Ime Nkwusa?

1 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eji ọrụ n’aka. Ndịàmà Jehova so ná ndị kasị eji ọrụ n’aka—ịmụ Okwu Chineke, ịga nzukọ ọgbakọ, na ikere òkè n’ozi ubi. Tụkwasị na nke a, anyị ji ọrụ n’aka n’ịhụ maka ọrụ ego, ọrụ ụlọ ma ọ bụ ọrụ ụlọ akwụkwọ, na ọtụtụ ibu ọrụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-ewecha oge. Nke a bụ ihe ịma aka karịsịa nye ndị isi ezinụlọ.

2 N’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere n’ọtụtụ ebe, ọ pụrụ ịdị mkpa na ndị isi ezinụlọ ga na-arụ ọrụ ruo ogologo oge ma na-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Mgbe ọrụ ego ndị na-ewe oge weere ihe ka ukwuu n’oge na ume ha, ha ga-enwe nanị obere ihe ga-afọdụ maka ọrụ nkwusa. Ebe ha nwere ibu ọrụ nke inye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ, ụfọdụ pụrụ iche na ha pụrụ nanị ikere òkè dị nta n’ozi. (1 Tim. 5:8) N’eziokwu, taa, e nwere ọtụtụ ihe nrụgide ndị e jikọtara ha na inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ma, ọrụ ego mmadụ ekwesịghị ịghọ ihe mgbochi nye ikwusa ozi ọma ahụ. (Mak 13:10) N’ihi ya, anyị ga-eme nke ọma inyocha ihe bụ́ ọnọdụ anyị n’ezie.

3 N’ihi na ụwa ka e si ahụ ya anya na-agbanwe agbanwe, onye isi ezinụlọ pụrụ ịchọ itinyebiga oge ókè n’ọrụ, n’ebumnobi nke ichekwakwu ego maka ọdachi. (1 Kọr. 7:31) Ọ bụ ezie na ịrụkwu ọrụ ego pụrụ iyi ka ọ na-eme ka e nwetakwuo ihe onwunwe ma ọ bụ ohere ntụrụndụ, nke a ọ̀ ga-eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ karị ma nwekwuo afọ ojuju ma ọ bụrụ na e jiri oge a gaara eji chụsoo ihe ime mmụọ na ịgachi nzukọ anya mee ha? N’ezie, anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla ga-etinye ọnọdụ ime mmụọ anyị n’ihe ize ndụ. Ige ntị na ndụmọdụ Jisọs bụ́ ka anyị ‘kpadoo akụ̀ n’eluigwe’ ma bụrụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ” bụ ihe amamihe dị na ya.—Mat. 6:19-21; Luk 12:15-21.

4 Buru Ụzọ Chọọ Ihe Ndị Metụtara Alaeze: Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha bute ihe ime mmụọ ụzọ tupu ihe ọ bụla ọzọ. Ọ gbara ha ume, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị?” Gịnị mere o ji kwuo nke a? Ọ kọwara, sị: “N’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa.” Ọ bụrụ na anyị ekwenyesie ike n’ezie na nke ahụ, ọ dịghị ihe mgbochi ọ bụla ga-egbochi anyị ime ihe ọzọ Jisọs kwuziri: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” Chineke ga-ahụ maka ya! (Mat. 6:31-33) N’ezie, nke a abụghị oge ịbụ ndị oké nchegbu maka ịkpata ihe e ji ebi ndụ ma ọ bụ ọchịchọ inwe ntụsara ahụ n’ime usoro ihe nke ga-apụ n’anya n’isi nso dọpụrụ uche ha.—1 Pita 5:7; 1 Jọn 2:15-17.

5 Nzube bụ́ isi e ji arụ ọrụ ego bụ mmadụ iji gboo mkpa anụ ahụ ya. Ma ihe ha aṅaa dị anyị mkpa? Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” Ànyị na-agbalị inweta ihe karịrị nke ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ ịdị na-enweta ihe ndị ahụ Pọl dọrọ aka ná ntị maka ha bụ́ ndị na-esi na ya apụta: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi.” (1 Tim. 6:8, 9; Mat. 6:24; Luk 14:33) Olee otú anyị pụrụ isi mata ma oké ọchịchọ ọ̀ na-adọla anyị azụ?

6 Ọ bụrụ na n’ihi nchụso nke ihe ụwa, anyị na-ekere nanị òkè dị nta n’ozi ubi ma ọ bụ ghara ịhụ mkpa ọ dị ịchụ àjà n’ihi ozi ọma ahụ, mgbe ahụ ọ dị mkpa ka anyị gbanwee ihe ndị anyị na-ebute ụzọ. (Hib. 13:15, 16) Ụzọ ndụ dị ala karị ga-enye aka dị ukwuu n’ibelata ihe mgbochi a nye ime nkwusa anyị. Ihe ndị metụtara Alaeze kwesịrị ịdị na-ebute ụzọ mgbe nile ma a bịa n’iji oge na ume ọrụ anyị eme ihe.

7 Ọrụ nke Na-abụghị n’Efu: Okwu Pọl kwuru na-agba anyị ume ịbụ ndị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe anyị matara na ndọgbu [anyị] na-adọgbu onwe [anyị] n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58) “Ọrụ Onyenwe anyị” nke kasịnụ bụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Iji na-ekere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee, anyị kwesịrị idokwa oge maka ozi ubi kwa izu ma gbalịa ịghara iji oge ahụ mee ihe ná nchụso ọ bụla ọzọ. (Efe. 5:15-17) Mgbe ahụ, ma ọrụ ego ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ enweghị nke ga-abụ ihe mgbochi nye ozi anyị.

8 Mgbe anyị tinyere onwe anyị n’isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible, anyị na-enweta obi ụtọ ka ukwuu nke na-abịa site n’inye ihe. (Ọrụ 20:35) Site n’ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, anyị pụrụ iji obi ike na-atụ anya ọdịnihu, “n’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ [anyị] na ịhụnanya ahụ [anyị] gosiri n’ebe aha Ya dị.”—Hib. 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya