Olee Otú Ị Na-eriru Nri Ime Mmụọ nke Ọma?
1 A na-ekwu na ‘ihe anyị na-eri na-ekpebi otú ahụ ga-adị anyị.’ N’ezie, otú anyị si eri nri na-enwe mmetụta n’ike ọkpụkpụ aka anyị nakwa ahụ ike anyị. Ebe Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta,” otú anyị si eri nri n’ụzọ ime mmụọ na-enwekwa mmetụta dị mma ma ọ bụ nke dị njọ n’ahụ anyị. (Mat. 4:4) N’ihi ya, olee otú ị na-eriru nri nke ọma n’ụzọ ime mmụọ? Ị̀ bụ onye na-ahọ nri? Ọ̀ na-adị gị oké ngwa ngwa ịnọru ala rie nri? Ka ị̀ na-eji oge ahụ anụ ụtọ nri ime mmụọ ndị na-abịa mgbe dum, ndị dị mma, ndị na-edozikwa ahụ?
2 Tụlee Ihe Ị Na-eri: Jehova na-enye anyị ‘nri n’oge ya,’ ‘oké oriri nke ihe mara abụba’ site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Mat. 24:4; Aisa. 25:6) Iji rite uru zuru ezu site ná ndokwa ịhụnanya ndị a, anyị aghaghị itinye mgbalị iri nri nke ọma n’ụzọ ime mmụọ.
3 Ị pụrụ ịjụ onwe gị sị: ‘M̀ na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị? M̀ na-agụ ma na-atụgharị uche na Bible kwa ụbọchị? M̀ na-akwadebe nzukọ ọgbakọ dị iche iche site n’ịmụ ihe a ga-amụ tupu oge eruo? Àgụsịwo m akwụkwọ ndị kasị ọhụrụ anyị nwere, gụnyere Mpịakọta nke 1 nke Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ?’
4 Jisọs kwere nkwa, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, ebe ọ bụ na a ga-eme ka afọ ju ha.” (Mat. 5:3, 6, NW) N’ihi ya, na-eri nri ime mmụọ nke ọma site n’iji ihe ọmụma Chineke mejupụta uche gị na obi gị.