“Onyinye n’Ụdị Mmadụ” Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
1 Lee ndokwa ịhụnanya Jehova meworo site n’aka Ọkpara ya n’inye “onyinye n’ụdị mmadụ”! (Efe. 4:8, 11, 12) Ha nwere ọtụtụ ibu ọrụ, gụnyere iji ịnụ ọkụ n’obi na-azụ ìgwè atụrụ Chineke mgbe nile. (1 Pita 5:2, 3) Anyị nile na-erite uru ná ndokwa a dị oké mkpa. Ma ụfọdụ hà na-enwe ihe isi ike, hà ka malitere iso ọgbakọ na-akpakọrịta ọhụrụ, hà nwere ụfọdụ adịghị ike, ma ọ bụ hà akpafuwo, ndị ikom a nwere nnọọ mmasị onwe onye n’ọdịmma ime mmụọ nke mmadụ nile.—Fil. 2:4; 1 Tesa. 5:12-14.
2 Mgbe ihe ndị na-akpata obi mgbawa bụ́ ndị na-eme n’ụwa mere ka a tụọ egwu, ndị ọzụzụ atụrụ a nọ n’okpuru na-adị ka “ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.” Ha na-enye anyị ume ọhụrụ mgbe ike gwụrụ anyị ma ọ bụ mgbe anyị bu ibu dị arọ nakwa mgbe nkasi obi dị anyị mkpa, “dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ” ma ọ bụ “dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”—Aịsa. 32:2.
3 Ịgba Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi Ume: Ndị okenye na-eme mgbalị pụrụ iche iji gbaa ndị na-adịghị ejechi ozi anya ma ọ bụ ndị na-adịghị ejekwa ozi ume, na-enyere ha aka ịmaliteghachi ikerechi òkè anya n’ihe omume nile nke ọgbakọ. Nleta ọzụzụ atụrụ ndị e mere n’ịhụnanya enyeworo ọtụtụ ndị aka ịgachi nzukọ ọgbakọ anya na ịbụ ndị e wuliri elu n’ụzọ ime mmụọ ruo n’ókè nke ịmalite ikere òkè ọzọ n’ozi ubi. Mgbalị nile dị otú ahụ ndị okenye na-eme na-egosi nlekọta ịhụnanya nke Jehova na idu ndú dị irè nke Jizọs Kraịst. O setịpụrụ ihe nlereanya nke igosi nchebara echiche dị otú ahụ maka atụrụ ya ọ bụla nke ọ pụrụ ịbụ na ọ kpafuru ma ọ bụ fuo efuo.—Mat. 18:12-14; Jọn 10:16, 27-29.
4 Ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru na-ele anya maka ihe àmà ndị na-egosi mgbe ụfọdụ ndị pụrụ ịdị na-asụ ngọngọ n’ụzọ ime mmụọ. Onye ọ bụla nke gosiri ihe àmà nke nkụda mmụọ, nke na-adịghị abịachizi nzukọ anya, ma ọ bụ nke ozi ubi ya belatarala yiri ka enyemaka ime mmụọ ọ̀ dị ya mkpa. Ndị okenye nwere mmasị inyere onye ọ bụla malitere igosipụta àgwà nke iyi uwe na iji ejiji dị ka ndị ụwa ma ọ bụ onye zụlitere omume nke ịkatọ ọgbakọ, aka. Site n’ezi mmasị na mmetụta ịhụnanya, ndị nlekọta bụ́ ndị na-enwe nchegbu banyere ndị ọzọ, na-eji ọchịchọ obi ‘enye mkpụrụ obi ha onwe ha’ ná mgbalị inyere ndị dị otú ahụ aka inweghachi ịhụnanya ha nweburu n’ebe Jehova nọ.—1 Tes. 2:8.
5 N’oge gara aga, ụfọdụ Ndị Kraịst raara onwe ha nye akwụsịwo iso ọgbakọ na-enwe mmekọrịta, jụọ oyi n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na ha abụwo ndị nsogbu ahụ́ ike, ihe isi ike akụ̀ na ụba, ma ọ bụ nrụgide nke ezinụlọ, rikpuru. Ụfọdụ akwagawo ebe ọhụrụ ma ghara ịchọta ọgbakọ dị nso. N’egosighị omume nkatọ, ndị okenye na-eji obiọma enye mmesi obi ike na Jehova na-eche banyere atụrụ ya nile nakwa na ọ ga-akwagide ha n’oge ihe isi ike. (Ọma 55:22; 1 Pita 5:7) Ndị ọzụzụ atụrụ mụ anya pụrụ inyere ha aka ịghọta na ọ bụrụ na ha ‘abịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa ha nso,’ na-enye ha nkasi obi ma mee ka ha nwee ume ọhụrụ.—Jems 4:8; Ọma 23:3, 4.
6 Iji Ndị Na-adịkwaghị Ike Akpọrọ Ihe: Ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru bụ́ ndị na-ahụ n’anya na-enwekwa nchegbu maka ndị a pụrụ ileghara anya. N’ọgbakọ ọ bụla, e nwere ụfọdụ ndị na-adịkwaghị ike, bụ́ ndị na-adịghị esi n’ụlọ apụta, ma ọ bụkwanụ ndị nwere nkwarụ. O kwere nghọta na òkè ha na-ekere n’ịkpọsa ozi Alaeze ahụ adịghị ukwuu n’ihi ọnọdụ ha. Ikekwe ohere ha nwere ịgba àmà pụrụ ịpụta nanị mgbe ha nwere ndị ọbịa, mgbe ha zutere ndị na-agafe agafe, ma ọ bụ mgbe ndị na-elekọta ha kpọtụụrụ ha. Ka o sina dị, a na-ele ihe ọ bụla ha nwere ike ime anya dị ka nkwado bara uru maka ọrụ nkwusa ahụ dum. (Mat. 25:15) Ọ bụrụgodị nanị minit 15 ka ha gbara àmà, ha kwesịrị idepụta ya, a ga-anọgidekwa na-agụ ha dị ka ndị nkwusa Alaeze na-ejechi ozi anya.
7 “Onyinye n’ụdị mmadụ” maara karịsịa banyere mkpa ime mmụọ nke ụmụnna ha n’oge a n’afọ—oge Ememe Ncheta. Lee oge kwesịrị ekwesị ọ bụụrụ ndị okenye itinye mgbalị pụrụ iche iji nyere ndị nile kpafuworonụ aka inwetaghachi ọṅụ na udo nke uche bụ́ nke a na-enweta site n’isoro ọgbakọ na-akpakọrịta n’ụzọ na-ekpo ọkụ! Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị hụrụ ka ndị dị otú ahụ bụ́ “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe” nọ ná nzukọ ọgbakọ nakwa mgbe ha pụrụ gaa ozi, na-egosighachi na ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ.—Gal. 6:10; Luk 15:4-7; Jọn 10:11, 14.