Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Ndị Kraịst Mgbe Ọ Dị Onye Ikwu A Chụpụrụ Achụpụ
1. Ọnọdụ dị aṅaa pụrụ itinye iguzosi ike n’ihe Onye Kraịst n’ule?
1 Nkekọ nke dị n’etiti ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịbụ nke siri ike nke ukwuu. Nke a na-etinye Onye Kraịst n’ule mgbe a chụpụrụ di ya ma ọ bụ nwunye ya, nwa ya, nne ya ma ọ bụ nna ya, ma ọ bụ onye ikwu ya ọzọ dị nso ma ọ bụ mgbe o kewapụrụ onwe ya n’ọgbakọ. (Mat. 10:37) Olee otú Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe kwesịrị isi na-emeso onye ikwu ahụ? Ọ̀ ga-abụ otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na o bi n’ụlọ gị? Nke mbụ, ka anyị tụleghachi ihe Bible kwuru banyere nke a, ụkpụrụ ndị metụtara ma ndị a chụpụrụ achụpụ ma ndị kewapụrụ onwe ha.
2. Dị ka Bible si kwuo, olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ?
2 Ụzọ Isi Na-emeso Ndị A Chụpụrụ Achụpụ: Okwu Chineke nyere Ndị Kraịst iwu ka ha ghara iso onye a chụpụrụ n’ọgbakọ na-akpakọrịta: “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ọbụna unu na onye dị otú a erikọla ihe. . . . Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti onwe unu.” (1 Kọr. 5:11, 13) Okwu Jizọs nke e dekọrọ na Matiu 18:17 dababakwara adaba n’okwu a: “Ka [onye ahụ a chụrụ achụ] dịrị gị nnọọ ka onye mba ọzọ nakwa dị ka onye ọnaụtụ.” Ndị na-ege Jizọs ntị maara nke ọma na ndị Juu nke oge ahụ na ndị Jentaịl adịghị emekọ ihe, ha na-ezekwa ndị ọnaụtụ eze dị ka ndị a jụrụ ajụ. Ya mere, Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na ndị a chụpụrụ achụpụ ghara ịdị na-akpakọrịta.—Lee Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peeji nke 18-20.
3, 4. Olee ụdị mkpakọrịta a machibidoro iwu iso ndị a chụpụrụ achụpụ na ndị kewapụrụ onwe ha na-enwe?
3 Nke a pụtara na Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe na onye ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ adịghị emekọ ihe ọ bụla metụtara ihe ime mmụọ. Ma ọ gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Okwu Chineke na-ekwu na anyị ekwesịghị iso ‘onye dị otú a ọbụna rikọọ ihe.’ (1 Kọr. 5:11) N’ihi ya, anyị na-ezerekwa iso onye a chụpụrụ achụpụ na-akpakọrịta n’ihe omume nkịtị dị iche iche. Nke a kagburu iso ya mee mkpapụ, nwee nnọkọ oriri, gbaa bọl, ma ọ bụ gaa ahịa ma ọ bụ ebe a na-eme ihe nkiri ma ọ bụ soro ya rikọọ nri n’ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ nri.
4 Gịnị banyere iso onye a chụpụrụ achụpụ na-ekwurịta okwu? Ọ bụ ezie na Bible ekwughị okwu banyere ọnọdụ nile pụrụ ịdapụta, 2 Jọn 10 na-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ echiche Jehova: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu ma ọ dịghị eweta ozizi a, ya adịla mgbe unu ga-anabata ya n’ebe obibi unu ma ọ bụ kelee ya.” N’ikwu okwu banyere nke a, Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peeji nke 25, na-ekwu, sị: “‘Ekele’ nkiti puru ibu nzọ-ukwu mbu nke puru iduba ná nkwurita okwu na eleghi anya, obuna n’ibu enyì. Ì ga-achọ izọpu nzọ-ukwu mbu di otú a n’ebe onye achupuru achupu nọ?”
5. Mgbe a chụpụrụ mmadụ, gịnị na-efunahụ ya?
5 N’ezie, ọ bụ nnọọ dị ka peeji nke 31 nke mbipụta Ụlọ Nche ahụ si kwuo ya: “Ihe mere eme bu na mgbe onye-Kraịst rara onwe-ya nye nmehie, ewee chupu ya n’ọgbakọ, ọtutu ihe nefunari ya: nguzo ya anwaputara anwaputa n’ebe Chineke nọ; . . . iso umu-nna nenwe nkpakọrita di utọ, tinyere ihe di uku nime nkpakọrita o nwere n’ebe ndi-ikwu-ya bú ndi-Kraist nọ.”
6. À chọrọ ka Onye Kraịst kwụsị mkpakọrịta nile nke ya na onye ikwu ya a chụpụrụ achụpụ, onye ya na ya bi n’otu ụlọ? Kọwaa.
6 N’otu Ụlọ: Nke a ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst ha na onye òtù ezinụlọ a chụpụrụ achụpụ bi n’otu ụlọ ga-ezere ikwunyere ya okwu, iso ya rikọọ nri, na iso ya na-akpakọrịta ka ha na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị? Ụlọ Nche nke April 15, 1991, kwuru n’ihe odide ala ala peeji dị na peeji nke 22, sị: “Ọ bụrụ na, n’ime ezinụlọ Onye Kraịst, e nwere onye ikwu nke a chụpụrụ achụpụ, onye ahụ ka ga-abụkwa akụkụ nke ihe omume na mmekọrịta a na-enwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị n’ime ezinụlọ ahụ.” Ya mere, ọ dịịrị ndị òtù ezinụlọ ikpebi ókè onye òtù ezinụlọ a chụpụrụ achụpụ ga-esonyeru ha mgbe ha na-eri nri ma ọ bụ na-eme ihe ndị ọzọ ezinụlọ na-eme. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha agaghị achọ ime ka ụmụnna ndị ha na ha na-akpakọrịta chee na ha ka na-eme ihe nile otú ha na-emebu tupu a chụpụ ya.
7. Olee otú mkpakọrịta ime mmụọ nke na-adị n’ụlọ si agbanwe mgbe a chụpụrụ onye òtù ezinụlọ?
7 Otú ọ dị, Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peeji nke 28, kwuru banyere onye ahụ a chụpụrụ achụpụ ma ọ bụ onye kewapụrụ onwe ya, sị: “Atọsawo ihe-nkekọ ime mmọọ mbu ahu nile kpamkpam. Nkaa bu ezi-okwu ọbuna n’ihe banyere ndi-ikwu-ya, tinyere ndi nke nọ nime ezi-na-ulo nke o si puta. . . . Nkaa putara na ngbanwe gadi ná nmekọrita ime mmọọ nke diwori n’ebe-obibi-ha na mbụ. Dika ihe-atu, asi na achupuru di-ya n’ọgbakọ, nwunye-ya na umu-ntakiri agaghi enwe ntusara-aru n’ebe ọ nọ n’iduzi ọmumu Bible nke ezi-na-ulo, ma-ọbu n’iduzi ha n’ọgugu Bible na ekpere. Ọ buru na di-ya chọrọ ikpe ekpere, dika n’oge nri, ọ bu ihe ruru ya ime otú a n’ebe-obibi-ya. Ma ndi ezi-na-ulo ya puru ikpe ekpere nke-ha n’obi nye Chineke. (Ilu 28:9; Abù Ọma 119:145, 146) Gini ma ọ buru na onye achupuru achupu chọrọ inọ ya n’ulo-ha mgbe ezi-na-ulo-ha nagukọ Bible n’otu ma-ọbu mgbe ha nenwe ọmumu-ihe Bible? Ndị ọzọ puru ikwe ka ọ nọrọ ya iji gee ntị, ma ọ buru na ọ gaghi anwa izí ha ihe ma ọbu ime ka ha nwee echìchè-ya nke okpukpe.”
8. Olee ibu ọrụ nke ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere n’ebe nwa ha na-etorubeghị ogo mmadụ nke a chụpụrụ achụpụ, onye ha na ya bi n’ụlọ, nọ?
8 Ọ bụrụ na a chụpụrụ nwatakịrị na-etorubeghị ogo mmadụ nke bi n’ụlọ achụpụ, ọ ka bụ ọrụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ịzụlite ya. Ụlọ Nche nke November 15, 1988, peeji nke 20, na-ekwu, sị: “Dị nnọọ ka ha ga-anọgide na-enye ya nri, uwe, ebe obibi, ọ dị mkpa ha ịnọgide na-ezi ya ihe ma na-adọ ya aka ná ntị n’ụzọ nke Okwu Chineke. (Ilu 6:20-22; 29:17) Nne na nna nwere ịhụnanya pụrụ ime ndokwa maka ha na ya inwe ọmụmụ Bible, ọbụna ọ bụrụ na a chụpụrụ ya n’ọgbakọ. Ma eleghị anya ọ ga-enweta abamuru kasị ukwuu ná nduzi ahụ site na nanị ha na ya inwe ọmụmụ ihe. Ma ọ bụ ha pụrụ ikpebi na ọ pụrụ ịnọgide na-ekere òkè ná ndokwa ọmụmụ ihe ezinụlọ.”—Leekwa Ụlọ Nche nke October 1, 2001, peeji nke 16-17.
9. Ruo n’ókè ha aṅaa ka Onye Kraịst na onye ikwu ya a chụpụrụ achụpụ onye ya na ya na-ebighị n’otu ụlọ ga-enweru mkpakọrịta?
9 Ndị Ikwu Na-ebighị n’Otu Ụlọ: Ụlọ Nche nke April 15, 1988, peeji nke 23, na-ekwu, sị: “Ọnọdụ ahụ dị iche ma ọ bụrụ na onye ahụ a chụpụrụ ma ọ bụ nke kewapụrụ onwe ya bụ onye ikwu nke bi n’ụlọ dị iche n’ebe ezinụlọ ahụ dị kpọmkwem. Ọ pụrụ ikwe mee ịghara isoro onye ikwu ahụ nwee mmekọrịta ọ bụla ma ọlị. Ọbụna ma e nwe okwu ezinụlọ nke ga-akpata mmekọrịta, a ga-edebe nke a n’ókè dịkarịsịrị ala,” n’ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke ahụ bụ́ ‘ka unu na onye ọ bụla nke na-eme mmehie n’enweghị nchegharị ghara imekọ ihe.’ (1 Kọr. 5:11) Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe kwesịrị ịgbalị izere iso onye ikwu dị otú ahụ na-enwe mkpakọrịta na-adịghị mkpa, ọbụna mee ka mmekọrịta achụmnta ego dịrị nnọọ n’ókè dịkarịsịrị ala.—Leekwa Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peeji nke 29-31.
10, 11. Gịnị ka Onye Kraịst ga-echebara echiche tupu o kwe ka onye ikwu a chụpụrụ achụpụ kwabata n’ebe obibi ya?
10 Ụlọ Nche kwuru okwu banyere ọnọdụ ọzọ nke pụrụ ibilite: “Gini ma ọ buru na achupuru onye-ikwu mmadu di ka nwa-nwoke, ma-ọbu nna ma-ọbu nne, bú onye bi ebe ọzọ, mgbe nkaa gasiri, o wee chọ kwaa ilaghachi bia soro ha biri? Ezi-na-ulo ahụ gekpebi ihe ha geme, dika ọnọdu ahu si di. Dika ihe-atu, nna ma-ọbu nne achupuru n’ọgbakọ puru idi naria ọria ma-ọbu ghara inwekwa ike ilekọta onwe-ya n’ihe banyere ego ma-ọbu n’uzọ anụ-aru. Ndi-Kraist bú umu ji ugwọ dika Akwukwọ nsọ si di na n’uzọ omume inye aka. (1 Tim. 5:8) . . . Ihe ageme puru idabere n’isi-ihe ndi di ka ihe bú nkpa nna ma-ọbu nne ahu n’ezie, omume-ya na nsọpuru onye-isi ezi-na-ulo ahu nwere n’ọdi-nma ime mmọọ nke ezi-na-ulo ahụ.”—Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peeji nke 28-29.
11 Banyere nwatakịrị, isiokwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe ufọdu, ndi-Kraist bú nna na nne anabataghachiwo nwa-ha nke achupuru n’ọgbakọ n’ulo ha rue oge ufọdu, bú onye malitere iria ọria n’anu-aru ma-ọbu n’uche. Ma n’ọnọdu nke ọ bula, nna na nne ahu puru itule ọnọdu nke onye ahu n’onwe-ya. Nwa ahu achupuru achupu ò biriwo onwe-ya, ọ̀ bu na o nwekwaghi ike ibiri onwe-ya ugbu a? Ka-ọbu, isi nzube-ya ilaghachite n’ulo ọ̀ bu n’ihi na ọ gabu ndu ka nfe? Gini banyere ukpuru omume-ya na àgwà-ya? Ọ̀ gewebata ‘ihe iko-achicha’ n’ebe-obibi?—Gal. 5:9.”
12. Olee uru ụfọdụ dị ná ndokwa ịchụpụ mmadụ?
12 Uru Ndị Dị n’Iguzosi Ike n’Ihe Nye Jehova: Ịkwado ndokwa Akwụkwọ Nsọ nke ịchụpụ na izere ndị mmehie na-enweghị nchegharị bara uru. Ọ na-echebe ịdị ọcha nke ọgbakọ ma na-eme ka a mata anyị dị ka ndị na-akwado ụkpụrụ omume dị elu nke Bible. (1 Pita 1:14-16) Ọ na-echebe anyị pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ. (Gal. 5:7-9) Ọ na-emekwa ka onye ahụ mere ihe ọjọọ nwee ohere nke irite uru zuru ezu n’ịdọ aka ná ntị e nyere ya, bụ́ nke pụrụ inyere ya aka ịmịpụta “mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.”—Hib. 12:11.
13. Mgbanwe dị aṅaa ka otu ezinụlọ mere, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
13 Mgbe ha nụchara otu okwu e kwuru n’otu mgbakọ sekit, otu nwanna nwoke na nwanne ya nwanyị ghọtara na ọ dị ha mkpa ime mgbanwe n’otú ha si emeso nne ha nke bi n’ebe ọzọ omume, bụ́ onye a chụpụkwara achụpụ kemgbe afọ isii. Ozugbo e mechiri mgbakọ ahụ, nwoke ahụ kpọrọ nne ya, mgbe o mesichara ya obi ike na ha ka hụrụ ya n’anya, ọ kọwara na ha agakwaghị na-ekwunyere ya okwu ọzọ ọ gwụla ma e nwere okwu ndị dị mkpa metụtara ezinụlọ ahụ ndị chọrọ ka a kpọtụrụ ya. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, nne ya malitere ịga nzukọ, e mesịkwara nabataghachi ya. Ọzọkwa, di ya bụ́ onye na-ekweghị ekwe malitere ịmụ Bible, ka oge na-agakwa, e mere ya baptizim.
14. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jiri iguzosi ike n’ihe na-akwado ndokwa nke ịchụpụ mmadụ?
14 Iji iguzosi ike n’ihe na-akwado ndokwa ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ, bụ́ nke a kọwapụtara n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ma na-eme ka o nwee ihe ọ ga-azaghachi onye ahụ nke na-ata Ya ụta. (Ilu 27:11) N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ijide n’aka na anyị ga-enweta ngọzi Jehova. Eze Devid dere banyere Jehova, sị: “Ụkpụrụ Ya kwa, adịghị m ewezụga onwe m n’ebe ha dị. N’ebe onye ebere nọ Ị ga-egosi Onwe gị onye ebere.”—2 Sam. 22:23, 26.