Irite Uru n’Ụzọ Zuru Ezu ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi”
1 Usoro Ihe Omume Na-akpali Akpali: Lee usoro ihe omume na-akpali akpali anyị nụrụ ụtọ ya ná mgbakọ distrikti anyị nwere na nso nso a! Anyị zukọrọ maka otu nzube, ịghọ ndị a kwadebere nke ọma karị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa Alaeze Chineke. Ì chetara otú onye ọkà okwu mbụ si kọwaa okwu ahụ bụ́ “ime nkwusa”? Ì chetara nnyocha a gbara anyị ume ime n’okwu bụ́ “Unu Atụla Egwu Ebe Unu Maara na Jehova Nọnyere Anyị”? Olee akụkọ ihe mere eme nke i nyochaworo ka ọ dị ugbu a?
2 Okwu ọtụtụ ndị kwuru nke bụ́ “Ule Dị Iche Iche Na-anwale Ọdịdị nke Okwukwe Anyị” kọrọ isi ihe atọ mere Jehova ji kwere ka mkpagbu dịrị. Ị̀ pụrụ ịkọwa isi ihe atọ ndị a? Gịnị bụ ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ anyị nwere maka nnọpụiche Ndị Kraịst anyị? Gịnị ka a gbara anyị ume ime iji kwadebe onwe anyị maka nsogbu ndị ga-abịa n’ihi nnọpụiche anyị? Olee otú anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọnwụnwa si ewetara Jehova otuto?
3 Olee akụkụ ndị wusiri gị ike karịsịa n’ihe nkiri ahụ bụ́ “Guzosie Ike n’Oge Ihe Isi Ike”? Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Jeremaịa?
4 Okwu ihu ọha bụ́ “Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe,” kọwara mgbanwe ndị dị aṅaa dị ịrịba ama bụ́ ndị gaje iwere ọnọdụ n’ọdịnihu, ndị ga-edugakwa n’ụbọchị dị egwu nke Chineke? Ka ị na-ege ntị n’okwu mmechi bụ́, “Baanụ Ụba n’Ezi Ọrụ Dị Ka Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi,” olee otú i si jikọta ihe ọmụma ahụ na ozi gị?
5 Isi Ihe Ndị A Ga-etinye n’Ọrụ: Dị ka a kọwara n’okwu bụ́ “Gosinụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele,” olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị sitere n’obi nye Jehova? N’okwu bụ́ isi bụ́, “Ndị Nkwusa Alaeze Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi,” ịnụ ọkụ n’obi ole ndị ka a gbara anyị ume iṅomi? Nnyocha onwe onye dị aṅaa ka a gwara anyị ka anyị mee?
6 Okwu ahụ ọtụtụ ndị kwuru nke bụ́ “Amụma Maịka Na-ewusi Anyị Ike Ijegharị n’Aha Jehova” mere ka ihe atọ dị aṅaa anyị na-aghaghị ime iji nweta ihu ọma Jehova pụta ìhè? À pụrụ imezu ihe ndị a a chọrọ? (Maị. 6:8) Dị ka okwu bụ́ “Nọgide Na-adị Ọcha n’Omume Site n’Ichebe Obi Gị” si kọwapụta, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị isi nọgide na-adị ọcha n’omume? N’akụkụ dịgasị aṅaa ka okwu bụ́ “Nọrọ na Nche Megide Aghụghọ” dọrọ anyị aka ná ntị ka a ghara iduhie anyị nakwa ka anyị ghara iduhie ndị ọzọ?
7 Isi ihe dịgasị aṅaa bara uru ndị sitere n’okwu ahụ ọtụtụ ndị kwuru bụ́ “Ndị Nkwusa Alaeze Bụ́ Ndị Na-eme Ka Ozi Ha Nwee Ùgwù” ka ị maliteworo itinye n’ọrụ n’ozi gị? N’okwu bụ́ “Mkparịta Ụka Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-ewuli Elu,” a tụlere Ndị Filipaị 4:8. Olee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si enyere anyị aka ime ka mkparịta ụka anyị bụrụ nke dabeere n’ihe ime mmụọ, oleekwa mgbe anyị kwesịrị ime otú ahụ?
8 Okwu bụ́ “Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile n’Oge Nsogbu” tụlere ụzọ anyị pụrụ isi nagide ọdachi, nsogbu ego, nsogbu ahụ́ ike, nsogbu ezinụlọ, na adịghị ike ndị na-ekweghị ala ala. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ọ bụ n’ebe Jehova nọ ka anyị tụkwasịrị obi mgbe anyị na-eche ọnọdụ ndị a ihu?
9 Akụ̀ Ime Mmụọ Ndị Ọhụrụ: Anyị nwere obi ụtọ ịnụ banyere mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Olee otú ịma ọkwa e ji kọwaa nzube mere e ji bipụta ya si metụta gị? N’ihi gịnị ka ọ ga-eji baa uru n’ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ dị ka akwụkwọ nke abụọ a ga-amụ?
10 Ọzọ, anyị nụrụ banyere mwepụta nke akwụkwọ ahụ mara mma bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Olee ụfọdụ ihe ndị pụrụ iche dị na ya? Olee ndị pụrụ irite uru na ya?
11 Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nyere anyị agbamume ime mmụọ dị anyị mkpa iji chee oge ndị a siri ike ihu. Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu site ná ndokwa ime mmụọ a pụrụ iche, ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji na-echeta ihe ndị e kwuru, iji ihe ndị anyị natara kpọrọ ihe, na itinye ihe ndị anyị mụtara n’ọrụ. (2 Pita 3:14) Ime otú ahụ ga-ewusi anyị ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe na ịbụ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi n’iṅomi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, iji wetara Jehova otuto.—Fil. 1:9-11.