Vidio nke Ga-eme Ka Ị Mụta Ihe Ma Kpalie Gị Ime Ihe!
Ọ bụ n’April 1951. E jidere ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova nọ n’ebe bụbu Soviet Union—ndị nile nọ n’ezinụlọ—ma tinye ha n’ụgbọ e ji ebu ibu, buga ha Siberia. N’ihi gịnị ka ọchịchị mba Soviet ahụ dị ike ji kpebie ikpochapụ ha? Olee otú ụmụnna anyị si lanarị, ọbụnakwa nwee ọganihu n’agbanyeghị ọtụtụ iri afọ nke mkpagbu na-ekweghị ebelata ebelata? Ị ga-achọta azịza ha na vidio bụ́ Faithful Under Trials—Jehovah’s Witnesses in the Soviet Union. Kirie ya, ma kwe ka ozi ya nke na-akụzi ihe kpalie gị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ!
Ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị a? (1) Olee mgbe mbụ Ndịàmà Jehova nwetara nnabata ọchịchị na Russia? (2) Olee otú mba Soviet Union si bịa nweta ọtụtụ puku ezinụlọ nke Ndịàmà tupu na mgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ? (3) Olee otú nkwenkwe ha si dị nnọọ iche na nkà ihe ọmụma nke Lenin? (4) Gịnị bụ Operation North, gịnịkwa ka Stalin chọrọ iji ya rụzuo? (5) Gịnị ka ịgbara ha ụgbọ nwa mkpi pụtaara Ndịàmà, gịnịkwa ka a gwara ha ka ha mee iji zere ịbụ ndị a gbaara ụgbọ nwa mkpi? (6) Na njem ahụ dị ogologo e ji ụgbọ okporo ígwè mee gaa Siberia, olee otú ụmụnna anyị si gbarịta onwe ha ume bụ́ nke juru ndị ji ha eji anya? (7) Nhụsianya dịgasị aṅaa ka Ndịàmà tachiri obi na ha na Siberia? (8) Olee ndokwa ime mmụọ ndị Jehova ji kpọrọ ihe nke ukwuu, n’ihi gịnịkwa? (9) Gịnị mere ụmụnna anyị ji dị njikere itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi akwụkwọ ha, oleekwa otú ha si nwee ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị mgbalị siri ike ndị ọchịchị mere iji gbochie ha inweta ya? (10) Olee otú Khrushchev si nọgide na-awakpo ndị Chineke? (11) Olee otú ndị ọchịchị si gbalịa imebi okwukwe nke ụmụaka Ndịàmà? (12) Olee nghọta doro anya ụmụnna anyị nwere banyere ihe mere e ji kpagbuo ha? (2002 Yearbook, peeji nke 203-204) (13) Olee otú mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ a wakporo nzukọ Chineke si mezuo ihe megidere ihe ndị ahụ na-akpagbu ha bu n’obi ịrụzu? (2002 Yearbook, peeji nke 220-221) (14) Olee ihe ndị a rụzuru, bụ́ ndị bụbu ihe Ndịàmà nọ n’ebe bụbu Soviet Union na-eche nanị n’echiche? (15) Olee ihe nyeere ụmụnna anyị aka ịtachi obi n’ule ha, oleekwa otú akụkụ ikpeazụ nke vidio ahụ si gosi ịbụ eziokwu nke Jeremaịa 1:19? (16) Kọọ otu n’ime ahụmahụ ndị mere eme banyere itinye ikwesị ntụkwasị obi n’ule bụ́ nke kasị metụ gị n’ahụ́.