Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/03 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
    Teta!—2001
  • Ihe Ngwọta Ya Ò So Akpata Nsogbu Ahụ?
    Teta!—2001
  • Akụkọ Okwukwe Sitere n’Ụlọ Mkpọrọ Mere Ihe Akụkọ
    Teta!—2001
  • “Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 4/03 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Okwu ịdọ aka ná ntị dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịṅa ntị na ha mgbe anyị na-agbara ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ àmà?

N’ụwa nile, e nwere ma ọ dị karịa ala, nde ndị mkpọrọ asatọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-egosi mmasị n’ozi ọma ahụ. (1 Tim. 2:4) Otu alaka ụlọ ọrụ na-enweta ihe dị ka akwụkwọ ozi 1,400 kwa ọnwa site n’aka ndị mkpọrọ na ndị òtù ezinụlọ ha, na-arịọ ka e wetara ha akwụkwọ ma ọ bụ ka a bịa leta ha. Ọ bụ ezie na mmasị ọtụtụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ na-egosi bụ ezi mmasị, ahụmahụ ndị e nwere egosiwo na ụfọdụ na-eme ka ha nwere mmasị, ná mgbalị iji ndị Chineke eme ihe iji nweta uru onwe onye. N’ihi nke a, mmadụ nile kwesịrị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị na-esonụ banyere ịgbara ndị mkpọrọ àmà.

N’ọtụtụ ọnọdụ, a na-agbara ndị mkpọrọ àmà site n’idere ha akwụkwọ ozi. A na-atụsi aro ike ka ụmụnna nwanyị ghara idere ndị mkpọrọ bụ́ ụmụ nwoke akwụkwọ ozi, ọ bụrụgodị na ọ bụ n’ebumnobi nke inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ nanị ụmụnna nwoke ruru eru kwesịrị iburu ibu ọrụ ahụ. A pụrụ ikenye ụmụnna nwanyị ruru eru ka ha na ndị mkpọrọ bụ́ ụmụ nwanyị, ndị na-egosi ezigbo mmasị n’eziokwu Bible, na-ederịta akwụkwọ ozi. E kwesịghị izigara ndị mkpọrọ ego ma ọ bụ inye ha onyinye, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịrịọ ihe ndị a.

Mgbe onye nọ n’ụlọ mkpọrọ gosiri mmasị, e kwesịrị inye ọgbakọ ụlọ mkpọrọ ahụ dị n’ógbè ha aha ya na adres ya. Dị ka ọ na-adịkarị, ụmụnna ruru eru nọ n’ebe ahụ na-ama ihe ha ga-eme banyere ọnọdụ dị iche iche pụrụ ibilite. Ọ bụrụ na a maghị ọgbakọ dị n’ebe ahụ, e kwesịrị izitere alaka ụlọ ọrụ ihe ọmụma ahụ.

A kagbughị ụmụnna ndị ahụ e kenyere ọrụ ahụ isoro ndị mkpọrọ ahụ na-enwe nzukọ ka ọtụtụ wee nwee ike ịmụ ihe n’otu oge ahụ. Otú ọ dị, e kwesịghị inwe ihe omume ndị pụrụ iche n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ nke ndị nkwusa ga-anọ na ya soro ndị mkpọrọ na-akpakọrịta n’ụzọ a na-akpaghịrị ókè. Ọzọkwa, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ka ndị nkwusa na-aga n’ụlọ mkpọrọ aghara aghara ma soro ndị mkpọrọ na-akpachi anya.

Ka anyị “dị akọ dị ka agwọ ma bụrụkwa ndị aka ha dị ọcha dị ka nduru” ka anyị so ndị mkpọrọ na-ekerịta ozi ọma ahụ.—Mat. 10:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya