Owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ala Ụfọdụ nke Europe
1 N’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’ọtụtụ ala nke Europe, gụnyere Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. N’ọnọdụ ka ukwuu, mmachibido iwu ndị ahụ siri oké ike. Ọ na-esi ike inwe nzukọ n’ihu ọha, ọ fọkwara nke nta ka inwe Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe a ga na-enwe nzukọ ghara ikwe omume. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, “Jehova emeworo anyị ihe ukwu; anyị na-aṅụrị ọṅụ.”—Ọma 126:3.
2 Malite n’afọ 1983, aka ike ahụ e ji na-emeso Ndịàmà Jehova malitere ibelata. Ka ọ na-erule 1989, Poland na Hungary anabatawo Ndịàmà Jehova n’ụzọ iwu kwadoro. Na 1991, a nabatara Ndịàmà Jehova n’ụzọ iwu kwadoro na Russia. Kemgbe ahụ, ọrụ ahụ enwewo ọganihu na Russia nakwa ná mba ndị mejupụtaburu Soviet Union. N’agbata March 1996 na October 1998, Òtù Na-achị Isi kwadoro arịọrọ mgbazinye ego maka Ụlọ Nzukọ Alaeze 359 ndị sitere n’aka alaka ụlọ ọrụ ndị na-elekọta mba 11 na Europe.
3 Ka ị na-ekiri foto ndị dị n’ihe ntinye a, tụgharịa uche n’oké ihe ndị magburu onwe ha Jehova mewooro ndị ya. (Ọma 136:4) Obi ga-atọ gị ụtọ ịmata na a na-eji ego òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-enye n’onyinye eme ihe bara ezigbo uru, bụ́ nke na-egosipụta ihe Jizọs kwuru dị ka e dekọrọ ya na Jọn 13:35, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”
4 Otu n’ime mba Europe ndị so na-erite uru ná ndokwa e mere iji nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị na-abachaghị ọgaranya bụ Romania, bụ́ ebe e wuworo Ụlọ Nzukọ Alaeze 36 kemgbe July 2000. Site n’iji otu ụkpụrụ wuo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nile, Ukraine wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze 61 n’afọ 2001 ma wukwuo 76 n’afọ 2002. Site n’enyemaka nke ego ndị e nyere n’onyinye n’Ụtụ Ego Society Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, e wuwo ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na Bulgaria, Croatia, Macedonia, Moldova, Russia, na Serbia na Montenegro.
5 Ọ bụwo ihe siri ike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala ụfọdụ, a ghaghịkwa itinye mgbalị dị ukwuu tupu e nwee ike ịmalite ihe owuwu kpọmkwem. Ịkwadebe maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-egbukarị oge. Ọzọkwa, ihe ọ na-efu iji wuo otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’akụkụ Europe ahụ karịrị nnọọ ihe ọ na-efu iji wuo ya n’ọtụtụ akụkụ Africa ma ọ bụ n’Ebe Ndịda America. Otú ọ dị, n’ihi mmụba dị ukwuu nke ọnụ ọgụgụ ndị na-efe Jehova ofufe, a ka chọrọ ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba Europe ndị na-abachaghị ọgaranya!
6 Lee nnọọ ihe magburu onwe ya ọ bụ ịhụ mmụba dị ngwa dị otú ahụ n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a! A gbawo àmà dị nnọọ mma n’ebe dị iche iche e wuru ha, dị ka ọtụtụ ahụmahụ na-egosi. N’ebe ụfọdụ, mmụọ ikwenye ekwenye nke e gosiri n’ịgbaso ntụziaka ndị metụtara ihe owuwu kpaliri mmasị ndị ọchịchị obodo.
7 Aịzaịa buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere mmụba nke ezi ofufe n’oge a. Site n’aka onye amụma ahụ, Chineke buru ụzọ kwuo, sị: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsa. 60:22) N’ezie, afọ iri gara aga egosiwo na ọ bụ oge Jehova maka inwe mmụba n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ka Jehova nọgide na-awụkwasị ngọzi ya bara ụba ná mgbalị anyị iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa n’ọtụtụ ala ka anyị nọgidere na-akwado Ụtụ Ego Society Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze! Nke a ga-eme ka e nwekwuo ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ọtụtụ ala ndị na-abachaghị ọgaranya. Ọ ga-akwalite ezi ofufe n’ọtụtụ akụkụ nke Europe ma mee ka a gbaa àmà ka ukwuu ruo “nsọtụ nke ụwa.”—Ọrụ 13:47.
[Foto ndị dị na peeji nke 3]
Ihe Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Moscow, Russia
[Foto ndị dị na peeji nke 4-6]
Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe
Strumica, Macedonia
Daruvar, Croatia
Bitola, Macedonia
Sokal, Lviv District, Ukraine
Sofia, Bulgaria
Krasnooktyabrskiy, Maykop Area, Russia
Bački Petrovac, Serbia na Montenegro
Plovdiv, Bulgaria
Tlumach, Ivano-Frankivsk District, Ukraine
Rava-Ruska, Lviv District, Ukraine
Stara Pazova, Serbia na Montenegro
Zenica, Bosnia na Herzegovina
Sokal, Lviv District, Ukraine
Zhydachivl, Lviv District, Ukraine