Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/03 p. 8
  • Ime Ka A Mara Aha Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ka A Mara Aha Chineke
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 6/03 p. 8

Ime Ka A Mara Aha Chineke

1. Mmetụta dị aṅaa ka ịmata aha aka Chineke pụrụ inwe n’ahụ́ ndị mmadụ?

1 Olee ihe i mere mgbe mbụ ị matara aha Chineke? Ọtụtụ ndị na-emeghachi omume ka otu nwanyị nke sịrị: “Oge mbụ m hụrụ aha Chineke n’ime Bible, ebere m ákwá. Ịmara na m pụrụ n’ezie ịmata na iji aha aka Chineke na-eme ihe, kpaliri nnọọ mmasị m.” Nye ya, ịmata aha Chineke bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ịmata Jehova dị ka onye na inwe ike iso ya na-enwe mmekọrịta.

2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ihe ngwa ngwa iji kụziere ndị ọzọ banyere Jehova?

2 Gịnị Mere A Ga-eji Mee Ka A Mara Ya? E jikọtara aha Chineke na àgwà ya, nzube ya na ihe ndị ọ na-eme. E jikọtakwara ya na nzọpụta. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” Ma, “olee otú ha ga-esi kpọkuo . . . ya,” ka Pọl tụgharịkwara n’uche, ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ebughị ụzọ mụta ihe banyere Jehova ma tinye okwukwe na ya? N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka Ndị Kraịst mee ihe ngwa ngwa iji mee ka ndị ọzọ mara aha Chineke na ihe nile ọ nọchiri anya ya. (Rom 10:13, 14) Otú ọ dị, e nwere ọbụna ihe ka ukwuu mere a na-aghaghị iji mee ka a mara aha Chineke.

3. Gịnị bụ isi ihe kasịnụ mere anyị ji na-eme nkwusa?

3 N’afọ ndị 1920, ndị Chineke si n’Akwụkwọ Nsọ ghọta ihe iseokwu ahụ metụtara eluigwe na ala banyere igosi oruru o ruuru Chineke ịbụ eze na ido aha ya nsọ. Tupu Jehova ebibie ndị ajọ omume iji wepụ nkọcha nile a kọchaworo aha ya, a ghaghị ime ka ‘a mara n’ụwa nile’ eziokwu banyere ya. (Aịsa. 12:4, 5; Ezik. 38:23) N’ihi ya, isi ihe kasịnụ mere anyị ji na-eme nkwusa bụ iji too Jehova n’ihu ọha na iji doo aha ya nsọ n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Hib. 13:15) Ịhụnanya maka Chineke na maka ndị agbata obi ga-akpali anyị ikere òkè n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ a Chineke nyere iwu ka a rụọ.

4. Olee otú e siworo jiri aha Chineke mara Ndịàmà Jehova?

4 “Otu Ndị Maka Aha Ya”: Na 1931, anyị nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsa. 43:10) Kemgbe ahụ, ndị Chineke emewo ka a mata aha ya ruo n’ókè nke na akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 124, kwuru, sị: “N’ụwa nile, a na-amata ngwa ngwa onye ọ bụla na-ejikarị aha ahụ bụ́ Jehova eme ihe dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.” È si otú a amata gị? Inwe ekele maka ịdị mma Jehova kwesịrị ịkpali anyị ‘ịgọzi aha ya,’ na-ekwu okwu banyere ya n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.—Ọma 20:7; 145:1, 2, 7.

5. Olee ihe gbasara àgwà anyị na ịza aha Chineke?

5 Dị ka “otu ndị maka aha ya,” anyị aghaghị ịdị na-akwado ụkpụrụ ya. (Ọrụ 15:14; 2 Tim. 2:19) Ihe ndị mmadụ na-ebukarị ụzọ ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ bụ àgwà ọma ha. (1 Pita 2:12) Anyị agaghị achọ mgbe ọ bụla imetọ aha ya site n’ileghara ụkpụrụ Chineke anya ma ọ bụ idebe ofufe ya n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ anyị. (Lev. 22:31, 32; Mal. 1:6-8, 12-14) Kama nke ahụ, ka ụzọ ndụ anyị gosi na anyị ji ihe ùgwù nke ịza aha Chineke kpọrọ ihe.

6. Ihe ùgwù dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi?

6 Taa, anyị na-ahụ mmezu nke ihe ahụ Jehova kwuru, sị: “Site n’ọwụwa anyanwụ wee ruo ọdịda ya aha m dị ukwuu n’etiti mba nile.” (Mal. 1:11) Ka anyị nọgide na-eme ka a mara eziokwu banyere Jehova, “gọziekwa aha nsọ Ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Ọma 145:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya