Mgbakọ Distrikti na Mgbakọ Mba Nile Na-akpali Anyị Inye Chineke Otuto!
Mgbakọ Distrikti na Mgbakọ Mba Nile “Nye Chineke Otuto,” agbawo àmà dị ukwuu. E jiriwo ihe omume ọchịchị Chineke ndị a dị ịrịba ama bulie aha Jehova elu, meekwa ka anyị nwekwuo ike ‘inye Jehova nsọpụrụ ruuru aha ya.’ (Ọma 96:8) N’eziokwu, o kwesịrị ka e too ya n’ihi oké ọrụ okike ọ rụworo, bụ́ ndị na-egosipụta àgwà ya ndị magburu onwe ha.—Job 37:14; Mkpu. 4:11.
N’iji ajụjụ ndị na-esonụ na ihe ndị i deturu mee ihe, kwadebe ma kere òkè ná ntụleghachi nke ihe omume mgbakọ ahụ bụ́ nke a ga-enwe n’izu February 16.
1. Olee otú ihe ndị e kere eke na-adịghị ndụ si akpọsa otuto Chineke, oleekwa otú nke a sị dị iche n’otú mmadụ si eto ya? (Ọma 19:1-3; “Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke”)
2. Olee ihe na-eme ugbu a nke nnwogha ahụ sere onyinyo ya, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ihe a na-eme ugbu a si agba Ndị Kraịst taa ume ịga n’ihu? (Okwu bụ́ isi, “Ọhụụ Amụma Ndị Dị Ebube Na-agba Anyị Ume Ịga n’Ihu!”)
3. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ụdị ịdị umeala n’obi Daniel onye amụma gosipụtara, oleekwa otú anyị ga-esi rite uru site n’ime otú ahụ? (Dan. 9:2, 5; 10:11, 12; “E Kpugheere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Jehova”)
4. (a) Ihe atọ dị aṅaa banyere ikpe Chineke ka anyị pụrụ ịmụta site n’amụma Emọs? (Emọs 1:3, 11, 13; 9:2-4, 8, 14) (b) Ihe mmụta bara uru dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova taa pụrụ inweta site n’ịdọ aka ná ntị dị n’Emọs 2:12? (“Amụma Emọs—Ozi Ya Maka Ụbọchị Anyị”)
5. (a) Olee ihe ize ndụ ndị dị n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ gabigara ókè, ọ bụrụgodị na mmanya egbughị onye ahụ? (b) Olee otú a pụrụ isi dozie nsogbu nke iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ gabigara ókè? (Mak 9:43; Efe. 5:18; “Zere Ọnyà nke Ịṅụbiga Mmanya Ókè”)
6. Olee otú i si erite uru site n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’? (“‘Ezi Ala Ahụ’—Ihe Atụ nke Paradaịs”)
7. N’ụzọ atọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi “na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo”? (2 Kọr. 3:18; “Na-egbukepụ Ebube Jehova Dị Ka Enyo”)
8. Gịnị kpatara ịkpọasị na-enweghị ezi ihe kpatara ya, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ịbụ ndị a kpọrọ asị otú ahụ? (Ọma 109:1-3; “Ndị A Kpọrọ Asị n’Enweghị Ihe Kpatara Ya”)
9. Gịnị bụ echiche yiri nke Kraịst banyere ịdị ukwuu, oleekwa otú mmadụ pụrụ isi kpebie na ọ dị ya mkpa ịzụlite echiche a n’ụzọ ka ukwuu? (Mat. 20:20-26; “Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu”)
10. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ n’agbanyeghị ịbụ ndị ike gwụrụ n’ụzọ anụ ahụ́? (“Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà”)
11. Olee ụzọ ụfọdụ Setan si akwalite ụgha, oleekwa ụzọ kwesịrị ekwesị nke Akwụkwọ Nso kwadoro anyị ga-esi meghachi omume ná mgbalị ndị a na-eme imebi okwukwe anyị? (Jọn 10:5; “Kpachara Anya Maka ‘Olu Ndị Bịara Abịa’”)
12. (a) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs dị ka e dekọrọ ya na Mak 10:14, 16? (b) Gịnị na-amasị gị n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ? (“Ụmụ Anyị—Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa”)
13. Olee otú ndị ntorobịa si na-eto Jehova? (1 Tim. 4:12; “Otú Ndị Ntorobịa Si Na-eto Jehova”)
14. Olee akụkụ ndị ị na-agaghị echefu echefu n’ihe nkiri ahụ bụ́ “Ịgba Àmà n’Atụghị Egwu n’Agbanyeghị Mmegide”?
15. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya nke (a) Pita na Jọn? (Ọrụ 4:10) (b) Stivin? (Ọrụ 7:2, 52, 53) (ch) ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ? (Ọrụ 9:31; ihe nkiri na okwu bụ́ “Na-ekwusanụ Ozi Ọma ahụ ‘n’Esepụghị Aka’”)
16. (a) Olee ụzọ ndị anyị kpebiri isi na-enye Chineke otuto? (b) Gịnị ka a na-emesi anyị obi ike banyere ya ma ọ bụrụ na anyị etinye ihe ndị anyị mụtara ná Mgbakọ “Nye Chineke Otuto” n’ọrụ? (Jọn 15:9, 10, 16; “‘Nọgide Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu’ Iji Wetara Jehova Otuto”)
Site n’ịtụgharị uche ná ntụziaka ime mmụọ ndị magburu onwe ha e nyere ná mgbakọ ahụ, a ga-akpali anyị itinye ihe ndị anyị mụtara n’ọrụ. (Fil. 4:8, 9) Nke a ga-ewusi mkpebi anyị ike ‘ime ihe nile iji nye Chineke otuto.’—1 Kọr. 10:31.