Abamuru Na-enweghị Atụ nke Amamihe Sitere n’Aka Chineke
1 Ụfọdụ ndị na-eche na Ndịàmà Jehova kwesịrị itinyekwu mgbalị kpọmkwem n’inye aka belata nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu taa. Ndị dị otú ahụ adịghị ahụ abamuru na-enweghị atụ nke ọrụ nkụzi Bible anyị zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ dị ka Pọl onyeozi si dee ya: “Okwu banyere osisi ịta ahụhụ ahụ bụ ihe nzuzu nye ndị na-ala n’iyi, ma nye anyị bụ́ ndị a na-azọpụta, ọ bụ ike nke Chineke.” (1 Kọr. 1:18) N’ezie, anyị maara na ozi Ndị Kraịst bụ ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’ụwa taa.
2 Ndụ Ka Mma Ugbu A: Mgbalị ndị mmadụ na-eme igbo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ arụpụtawo ihe dị nnọọ nta. Ime iwu akwụsịbeghị mmụba nke mpụ. Nkwekọrịta udo na ndị agha nchekwa udo dị iche iche emebeghị ka agha kwụsị. Atụmatụ ndị e mere maka ọdịmma ọha na eze adawo n’ime ka ịda ogbenye kwụsị. (Ọma 146:3, 4; Jer. 8:9) N’ụzọ dị iche, ozi Alaeze ahụ agbanwewo ndụ ọtụtụ nde mmadụ site n’inyere ha aka iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ. (Rom 12:2; Kọl. 3:9, 10) Site n’ime otú ahụ, ha na-ebi ụdị ndụ ka mma ugbu a.—1 Tim. 4:8.
3 Ọdịnihu Dị Ebube: Tụkwasị n’inyere anyị aka ịnagide ihe isi ike ndị anyị na-enweta ugbu a ná ndụ, amamihe sitere n’aka Chineke na-enyere anyị aka ịhazi ọdịnihu anyị nke ọma. (Ọma 119:105) Ọ na-echebe anyị pụọ n’ihe efu nke ịchọ ịgbanwe usoro ihe dị ugbu a. (Ekli. 1:15; Rom 8:20) Lee obi ụtọ anyị nwere na anyị adịghị ala ndụ anyị n’iyi n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị na-eduhie eduhie! Kama nke ahụ, anyị na-etinye mgbalị anyị ná nkwa Jehova e ji n’aka nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” bụ́ ndị ezi omume gaje ibi n’ime ha. Mgbe ụbọchị ikpe Jehova bịara, ọ ga-edo anya na ndị dabeere n’amamihe Chineke mere nhọrọ ka mma.—2 Pita 3:10-13; Ọma 37:34.
4 Ọ bụ ezie na amamihe sitere n’aka Chineke pụrụ iyi ihe na-enweghị isi nye ndị bamiworo ‘n’amamihe nke usoro ihe a,’ ọ bụ n’ezie nanị ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso. (1 Kọr. 1:21; 2:6-8) N’ihi ya, anyị na-anọgide na-akpọsa n’ụwa nile ozi ahụ nke sitere n’aka Chineke, bụ́ “onye nanị ya maara ihe.”—Rom 16:27.