Ịzọ Ije nke Usuu Ndị Agha Ịnyịnya nke Metụtara Gị
1, 2. Olee otú mmezu nke ọhụụ amụma ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 9:13-19 si metụta ndị ohu Chineke taa?
1 “Mmụọ ozi nke isii wee fụọ opi ya.” Mgbe nke ahụ gasịrị, “usuu ndị agha ịnyịnya” nke ọnụ ọgụgụ ha dị “iri puku abụọ ụzọ iri puku” nupụtara. Nke a abụghị usuu ndị agha nkịtị. “Isi ịnyịnya ndị ahụ dịkwa ka isi ọdụm.” Ọkụ, anwụrụ ọkụ, na sọlfọ si n’ọnụ ha na-apụta, ‘ọdụ ha dịkwa ka agwọ.’ Ịzọ ije ihe atụ nke usuu ndị agha ịnyịnya a kpatara mbibi. (Mkpu. 9:13-19) Ị̀ maara otú mmezu nke ọhụụ amụma a dị ịrịba ama si metụta gị?
2 Ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị ibe ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, na-ejikọ aka na-eme ka a mara banyere ikpe Chineke. Nke a na-agba ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ nke Krisendọm n’anwụ. Ka anyị tụlee akụkụ abụọ nke ọhụụ amụma ahụ, bụ́ ndị na-eme ka ihe mere ozi ndị ohu Chineke ji dị nnọọ irè pụta ìhè.
3. Olee ọzụzụ i nwetaworo iji zie ozi Chineke n’ụzọ dị irè?
3 Ndị A Zụrụ Ma Kwadebe Ikwusa Ozi Chineke: Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na nzukọ ọgbakọ ndị ọzọ, a zụwo ndị ozi Chineke iji ikike na-ezisa ozi Chineke. N’iṅomi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, ha na-achọ ndị kwesịrị ekwesị, na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ. (Mat. 10:11; Mak 1:16; Luk 4:15; Ọrụ 20:18-20) Lee otú ụzọ ime nkwusa a nke dabeere na Bible siworo dị irè!
4. Olee ngwá ọrụ ọtụtụ ndị nkwusa nwere bụ́ ndị na-enyere ha aka ịnọgide n’ọrụ ha?
4 Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi ekesawo ọtụtụ ijeri Bible, akwụkwọ, broshuọ, na magazin ka ha nọ na-arụ ọrụ nkwusa Chineke nyere ha. E bipụtawo akwụkwọ ndị a n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’asụsụ 400, ha na-atụle isiokwu dịgasị iche iche, na-ejikwa ụzọ dị iche iche na-amasị ụdị mmadụ ọ bụla eme ihe. Ị̀ na-eji ngwá ọrụ ndị a eme ihe n’ụzọ dị irè?
5, 6. Olee ihe na-egosi na Jehova na-akwado ndị ya?
5 Nduzi na Nkwado Sitere n’Eluigwe: Ọhụụ amụma ahụ na-emekwa ka o doo anya na ọrụ ahụ, nke ịzọ ije ihe atụ nke usuu ndị agha ịnyịnya ahụ sere onyinyo ya, nwere nkwado Chineke. (Mkpu. 9:13-15) A na-arụzu ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ, ọ bụghị site n’amamihe ma ọ bụ n’ike mmadụ, kama site na mmụọ Chineke. (Zek. 4:6) Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya eduzi ọrụ a. (Mkpu. 14:6) N’ihi ya, tụkwasị ná mgbalị nke Ndịàmà ya bụ́ mmadụ, Jehova na-enye nkwado iji dọta ndị dị umeala n’obi n’ebe ọ nọ.—Jọn 6:45, 65.
6 N’ịbụ ndị a zụrụ ma kwadebe nke ọma ịgbasa ozi Chineke nakwa ndị na-arụ ọrụ n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, ndị Jehova bụ ndị a na-apụghị iguzogide eguzogide. Ka anyị nọgide na-eme òkè nke anyị ná mmezu nke ọhụụ amụma a na-akpali akpali.