‘Na-agbasapụnụ’
1. Ibu ọrụ dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị nwere?
1 N’òtù ụmụnna Ndị Kraịst, onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ibu ọrụ nke ime ka e nwee ịhụnanya n’ime ọgbakọ. (1 Pita 1:22; 2:17) A na-enwe ịhụnanya dị otú ahụ mgbe anyị ‘na-agbasapụ’ ná mmetụta dị nro anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ. (2 Kọr. 6:12, 13) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịmata ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nke ọma?
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ime ndị kwere ekwe ibe anyị enyi?
2 Ọbụbụenyi Na-esikwu Ike: Ka anyị na-amatakwu ndị kwere ekwe ibe anyị nke ọma, anyị na-abịa jiri okwukwe, ntachi obi, na ọmarịcha àgwà ndị ọzọ ha nwere kpọrọ ihe karị. Amaghị eme ha na-abịa yie obere ihe nye anyị, ọbụbụenyi anyị na ha na-abịakwa sie ike. Ọ bụrụ na anyị amara ibe anyị nke ọma, anyị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma iwuli na ịkasi ibe anyị obi. (1 Tes. 5:11) Anyị pụrụ ịghọ “ndị enyemaka na-eme ka [ibe anyị] dị ike” iji guzogide mmetụta nke ụwa Setan. (Kọl. 4:11) N’ihi ụbọchị ikpeazụ ndị a jupụtara ná nrụgide, lee ekele anyị na-enwe ịbụ ndị nwere ezi ndị enyi n’etiti ndị Jehova!—Ilu 18:24.
3. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị enyemaka na-eme ka ndị ọzọ dị ike?
3 Ezi ndị enyi pụrụ ịbụrụ anyị ebe pụrụ iche anyị pụrụ isi na-enweta ume na nkasi obi mgbe anyị chere ọnwụnwa ndị tara akpụ ihu. (Ilu 17:17) Otu Onye Kraịst, bụ́ onye ya na mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe nọ na-alụ, na-echeta, sị: “E nwere ndị enyi m ndị na-ekwu ihe ndị dị mma banyere m iji nyere m aka imeri echiche ndị na-adịghị mma m nwere.” Ndị enyi dị otú ahụ bụ ngọzi sitere n’aka Jehova.—Ilu 27:9.
4. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nke ọma karị?
4 Na-egosipụta Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ: Olee otú anyị pụrụ isi na-agbasapụ ná mmetụta dị nro anyị na-enwe n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ? Tụkwasị n’ikele ndị ọzọ ná nzukọ Ndị Kraịst, gbalịa isoro ha na-enwe nkwurịta okwu ndị bara uru. N’enyonyeghị anya n’ihe ndị dịịrị nanị ha, na-egosipụta mmasị n’ebe ha nọ. (Fil. 2:4; 1 Pita 4:15) Ụzọ ọzọ isi na-egosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ bụ site n’ịkpọ ha ịbịa n’ụlọ anyị iji rie ihe. (Luk 14:12-14) Ma ọ bụkwanụ ị pụrụ ime ndokwa ka gị na ha rụkọọ ọrụ n’ozi ubi. (Luk 10:1) Ka anyị na-ebute ụzọ n’ịmata ụmụnna anyị nke ọma karị, anyị na-akwalite ịdị n’otu n’ọgbakọ.—Kọl. 3:14.
5. Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi mụbakwuo ndị enyi anyị?
5 Ànyị na-adịkarị ahọrọ ezi ndị enyi anyị nanị n’etiti ndị ọgbọ anyị ma ọ bụ ndị ihe na-amasị ha yitewere ihe ndị na-amasị anyị? Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị dị otú ahụ kpaa ókè ná ndị anyị na-eme enyi n’ọgbakọ. Devid na Jonatan nakwa Rut na Naomi zụlitere ọbụbụenyi siri ike n’agbanyeghị ndịrịta iche n’afọ ndụ ha nakwa n’otú e si zụlite ha. (Rut 4:15; 1 Sam. 18:1) Ị̀ pụrụ ịmụbakwu ndị enyi gị? Ime otú ahụ pụrụ iweta ngọzi ndị a na-atụghị anya ha.
6. Gịnị bụ uru ụfọdụ ndị dị n’anyị ịgbasapụ ná mmetụta dị nro anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ?
6 Ka anyị na-agbasapụ ná mmetụta dị nro anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ, anyị na-ewuli ibe anyị elu ma na-akwalite udo n’ọgbakọ. Ọzọkwa, Jehova n’onwe ya ga-agọzi anyị maka ịhụnanya anyị na-egosipụta n’ebe ụmụnna anyị nọ. (Ọma 41:1, 2; Hib. 6:10) Gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịmata ọtụtụ ndị n’ime ụmụnna gị dị ka o kwere mee?