Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/04 p. 1
  • Na-eṅomi Ikpe Ziri Ezi nke Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eṅomi Ikpe Ziri Ezi nke Jehova
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 7/04 p. 1

Na-eṅomi Ikpe Ziri Ezi nke Jehova

1 “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Ọma 37:28) N’ihi ya, ọ bụ ezie na o kpebiela ibibi ụwa ajọ omume a, o meela ndokwa ka e buru ụzọ dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. (Mak 13:10) Nke a na-enye ndị mmadụ ohere ichegharị ma bụrụ ndị a ga-azọpụta. (2 Pita 3:9) Ànyị na-agbalị iṅomi ikpe ziri ezi nke Jehova? Nhụsianya na ahụhụ nke ụmụ mmadụ ọ̀ na-akpali anyị isoro ndị ọzọ kerịta olileanya Alaeze ahụ? (Ilu 3:27) Ịhụnanya maka ikpe ziri ezi ga-akpali anyị ikerechi òkè anya n’ime nkwusa.

2 Na-ekwusa Ozi Ọma n’Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu: Site n’ime ka onye ọ bụla mara nzube Chineke n’eleghị mmadụ anya n’ihu, anyị ‘na-eme ihe e kpere n’ikpe.’ (Maị. 6:8) Anyị aghaghị iguzogide omume e ji mara ụmụ mmadụ na-ezughị okè nke ikpebi ihe ndị ọzọ bụ site n’ọdịdị elu ahụ́ ha. (Jems 2:1-4, 9) Ọ bụ “uche [Jehova] ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Okwu eziokwu nke Chineke pụrụ ime ka e nwee mgbanwe ndị dị ịrịba ama ná ndụ ndị mmadụ. (Hib. 4:12) Ịghọta eziokwu a pụrụ ịkpali anyị iji obi ike na-agakwuru ndị mmadụ, ọbụna ndị jụrụ ige ntị n’oge gara aga.

3 Ọdịdị elu ahụ́ nke otu nwoke na-azụkarị ya ahịa tụtụrụ otu nwanna nwanyị nke na-ere ahịa n’otu ụlọ ahịa ụjọ. Ka o sina dị, mgbe ohere kwesịrị ekwesị dapụtara, ọ gbalịrị ịgbara ya àmà banyere Paradaịs nke Chineke kwere ná nkwa. Nwoke ahụ zaghachiri n’ike na ya adịghị ekwenye n’akụkọ ifo nakwa na ya bụ onye agamevu na onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Ma ike agwụghị nwanna nwanyị ahụ. Otu ụbọchị, nwoke ahụ jụrụ ya ihe ọ na-eche banyere ogologo ntutu isi ya, ya mere o ji akọ kọwaara ya ihe Bible na-ekwu banyere ya. (1 Kọr. 11:14) N’echi ya, n’ụzọ tụrụ ya n’anya ma nye ya obi ụtọ, ọ hụrụ na nwoke ahụ akpụọla afụ ọnụ ya na ntutu isi ya! Ọ rịọrọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible, bụ́ nke obi dị otu nwanna nwoke ụtọ iduzi, o nwekwara ọganihu ruo n’ókè nke ịrara onwe ya nye, e meekwa ya baptizim. Dị ka nwoke a, ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi taa na-enwe ekele maka mgbalị siri ike nke ndị wetaara ha ozi Alaeze ahụ mere n’eleghị mmadụ anya n’ihu.

4 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ekpochapụ ajọ omume n’ụwa. (2 Pita 3:10, 13) Ka anyị jiri nwa oge a fọdụrụnụ na-eṅomi ikpe ziri ezi nke Jehova site n’inye mmadụ nile ohere nke ịgbanahụ mbibi a ga-ebibi ụwa ajọ omume Setan n’ọdịnihu.—1 Jọn 2:17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya