Jiri Bible Na-eme Ihe nke Ọma
1. Gịnị ka ị pụrụ ime mgbe ị na-akwadebe maka ozi ubi?
1 N’agbanyeghị akwụkwọ anyị bu n’uche inyefe n’ozi, ọ bara uru ịhọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-akpali iche echiche bụ́ nke anyị ga-agụrụ ndị ga-ege ntị. (Hib. 4:12) Ịhọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ e ji mee ihe n’akwụkwọ ị na-enyefe ga-eme ka i nwee ike inyefe ya n’ụzọ dị irè. N’ebe ụfọdụ, ndị nkwusa ahụtawo ya dị ka ihe bara uru iji Bible n’aka mgbe ha na-erute ebe mmadụ nọ ma ọ bụ mgbe ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ.
2. (a) Olee otú anyị pụrụ isi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ malite okwu? (b) Isiokwu ndị dị aṅaa dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-amasị ndị nọ n’ókèala unu?
2 Malite Site n’Ịgụ Otu Akụkụ Akwụkwọ Nsọ: Ụfọdụ ndị nkwusa na-amalite okwu ha site n’ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ njụta echiche dị mfe bụ́ nke dabeere n’akụkụ Bible nke ha na-agụrụ ya ozugbo ahụ. Nke a na-adọrọ uche ngwa ngwa gaa n’Okwu Chineke. Ụfọdụ n’ime okwu mmeghe ndị a hà ga-adị irè n’ókèala unu?
◼ “Ọ bụrụ na i nwere ike ime mgbanwe ndị a, ị̀ ga-eme ha?” Gụọ Mkpughe 21:4.
◼ “N’ihi gịnị ka anyị ji biri n’oge pụrụ iche otú a?” Gụọ 2 Timoti 3:1-5.
◼ “Ì chere na ógbè anyị ga-abụ ebe ka mma ma ọ bụrụ na mmadụ nile na-agbaso ndụmọdụ a?” Gụọ Matiu 7:12.
◼ “Ì chere na ụmụ gị ga-enwe ike ibi n’ụdị ọnọdụ a kọwara n’ebe a?” Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.
◼ “Ì chere na ọ dị mgbe okwu ndị a ga-emezu?” Gụọ Aịsaịa 33:24.
◼ “Ị̀ maara banyere mgbanwe ọchịchị e kwuru okwu ya n’ebe a?” Gụọ Daniel 2:44.
◼ “Ọ̀ dịtụla mgbe ị chọrọ ịjụ Chineke ajụjụ a?” Gụọ Job 21:7.
◼ “Ọ̀ ga-ekwe anyị omume ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?” Gụọ Jọn 5:28, 29.
◼ “Ndị nwụrụ anwụ, hà maara ihe ndị dị ndụ na-eme?” Gụọ Eklisiastis 9:5.
3. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị mmadụ aka ịghọta akụkụ Bible ndị anyị gụrụ?
3 Kọwaa, Mee Ihe Atụ, Kwuo Otú A Pụrụ Isi Tinye Ya n’Ọrụ: Mgbe mmadụ dị njikere iso gị kwurịta okwu, ekwula okwu gị ọkụ ọkụ. Wepụta oge iji kọwaa, mee ihe atụ, ma gosi otú a pụrụ isi tinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ị gụrụ n’ọrụ, ka onye ahụ wee ghọta ya. (Neh. 8:8) Mgbe ndị mmadụ ghọtara ma nakwere ihe Okwu Chineke na-akụzi, ọ pụrụ ime ka ndụ ha gbanwee n’ụzọ dị ịrịba ama.—1 Tes. 2:13.
4. Olee otú anyị pụrụ isi na-eji Bible eme ihe nke ọma mgbe anyị na-eme nletaghachi?
4 Nọgide na-eji Bible eme ihe nke ọma ka ị na-ewulite mmasị e gosiri. Ị pụrụ iji otu usoro a mee ihe mgbe ị na-eme nletaghachi: (1) Họrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị. (2) Jụọ otu ajụjụ dị mfe banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Mgbe ahụ, gụọ ya. (3) Kọwaa, mee ihe atụ, ma kwuo ụzọ a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ. Gbalịsie ike ịtụkwasị ihe n’ihe ọmụma onye ahụ nwere banyere Okwu Chineke n’oge ọ bụla i letara ya. N’oge na-adịghị anya, ị pụrụ ịmalite iduziri ya ọmụmụ Bible!