Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Nzukọ Ọgbakọ
1 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst, ọ ga-amasị gị ka ụmụ gị tolite hụ Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi, ma mesịakwa nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa. Olee otú ị pụrụ isi nyere ha aka ime ka ofufe Jehova bụrụ ihe mbụ ná ndụ ha? Ụzọ bụ́ isi ị pụrụ isi mee ya bụ site n’isetịpụ ihe nlereanya. (Ilu 20:7) Mgbe otu nwanna nwanyị na-echeta ihe nlereanya nke nne ya bụ́ Onyeàmà setịpụrụ, o kwuru, sị: “Anyị anaghị enwe obi abụọ ma ànyị ga-aga nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ na anyị agaghị aga.” Nke a nwere mmetụta dị mma n’ebe ọ nọ.
2 Ndị ezinụlọ gị hà ghọtara ihe bụ́ nzube e ji enwe nzukọ ọgbakọ? Ihe anyị na-amụta ná nzukọ ndị a na-ewusikwu anyị ike ịnọgide na-eme uche Chineke. Mkpakọrịta anyị na-eso ụmụnna anyị enwe ná nzukọ ndị a na-abụkwara anyị ihe agbamume dị ukwuu. (Aịsa. 54:13; Rom 1:11, 12) Ma, nzube bụ́ isi e ji enwe nzukọ ndị a bụ iji too Jehova “n’ime mkpọkọta mmadụ nile.” (Ọma 26:12) Nzukọ Ndị Kraịst na-eme ka anyị nwee ohere igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ife ya ofufe.
3 “Nọrọsienụ Ike na Nche”: Ekele anyị nwere maka nzube dị nsọ nke nzukọ anyị ga-akpali anyị ‘ịnọrọsi ike ná nche’ ka anyị wee ghara iji nwayọọ nwayọọ zụlite àgwà nke ịgha nzukọ n’ihi ihe ndị na-adịchaghị mkpa. (Efe. 5:15, 16; Hib. 10:24, 25) Mgbe ị na-edepụta usoro ihe omume ezinụlọ gị, ị pụrụ ịmalite site n’ide oge unu ji aga nzukọ ọgbakọ. Mgbe i desịrị ya, hụ na ihe omume ndị ọzọ adịghị egbochi unu ịgachi nzukọ anya. Hụ na ezinụlọ gị na-ewere ịga nzukọ dị ka ihe dị oké mkpa.
4 Ọ́ dịghị atọ anyị ụtọ mgbe anyị na-agụ banyere ihe isi ike ụmụnna anyị na-agabiga iji na-aga nzukọ na mgbakọ dị iche iche? Ọ bụ ezie na ọnọdụ gị nwere ike ọ gaghị adịru njọ ka nke ha, ikekwe gị onwe gị na-enwekwa ihe isi ike nke gị. Setan na-eme ka ife Jehova ofufe na-esiwanyere ndị Chineke ike. N’agbanyeghị nke ahụ, nwee obi ike na ụmụ gị ga-ahụrịrị mgbalị siri ike ezinụlọ gị na-eme iji na-aga nzukọ ọgbakọ. N’ezie, site n’ime otú ahụ, ị pụrụ ịkụnye onyinye ime mmụọ n’obi ha bụ́ nke ha na-agatụghị echefu echefu.