Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
1 Dị ka ndị ozi Kraịst, anyị maara na ọ bụghị mmadụ nile ga-aṅa ntị n’ozi anyị. (Mat. 10:14) Ma, anyị agaghị ekwe ka nke ahụ mee ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. (Ilu 29:25) Gịnị na-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu?
2 Pọl onyeozi ji “abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs,” kpọrọ ihe nke ukwuu. Nke a kpaliri ya iji “nkwenye siri ike” na-ekwu okwu. (Fil. 3:8; 1 Tesa. 1:5) Ọ bụ ezie na ụfọdụ lere ozi ahụ o kwusara anya dị ka ihe na-adịghị ike na ihe nzuzu, ọ maara na ozi ahụ bụ “ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” (Rom 1:16) N’ihi ya, ọbụna mgbe a na-emegide ya, ọ nọgidere ‘na-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova.’—Ọrụ 14:1-7; 20:18-21, 24.
3 Ebe Anyị Si Enweta Ike: Ọ bụghị site n’ike nke ya ka Pọl si nwee ike ịgba àmà n’atụghị egwu. Mgbe Pọl na-ekwu banyere onwe ya na Saịlas, o dere, sị: “Mgbe anyị buworo ụzọ tasịa ahụhụ ma bụrụ ndị e mesoworo n’ụzọ mkparị . . . na Filipaị, anyị [nwere] nkwuwa okwu site na Chineke anyị iji oké ịgba mgba gwa unu ozi ọma Chineke.” (1 Tesa. 2:2; Ọrụ 16:12, 37) Ọzọkwa, mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ọ rịọrọ ndị ọzọ ka ha na-ekpere ya ekpere ka ya wee nwee ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ ‘n’atụghị egwu dị ka o kwesịrị ikwu.’ (Efe. 6:18-20) Site n’ịdabere n’ebe Jehova nọ kama ịdabere n’onwe ya, Pọl nọgidere na-ekwusa Okwu Chineke n’atụghị egwu.—2 Kọr. 4:7; Fil. 4:13.
4 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Otu nwanna nwoke bụ́ onye o siiri nnọọ ike ime ka a mara na ọ bụ Onyeàmà Jehova n’ebe ọ na-arụ ọrụ, nakwa ịgbara ndị ọrụ ibe ya àmà, bịara kpee ekpere banyere ya ma malite ịgbara ha àmà. Na mbụ, otu onye ọrụ ibe ya jụrụ ige ya ntị, ma mgbe ọ nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ, ọ malite ige ntị. Nke a mere ka ọ malite iduziri ya ọmụmụ Bible. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, nwanna ahụ ji ohere ọ bụla dapụtaranụ gbaa àmà. N’ebe ọzọ ọ rụrụ ọrụ, o nyeere mmadụ iri atọ na anọ aka ịbụ ndị e mere baptizim n’ime afọ iri na anọ. Obi pụrụ isi anyị ike na Jehova n’otu aka ahụ ga-eme ka anyị gbasie ike iji ‘nọgide na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu ọ bụla.’—Ọrụ 4:29.