Ihe Ozi Anyị Na-arụzu
1. Olee otú Jehova si ele ozi anyị anya, oleekwa otú ndị mmadụ si emeghachi omume?
1 Okwu Chineke na-akọwa Ndị Kraịst dị ka ndị na-azọ njem mmeri n’ozi Jehova, dị ka à ga-asị na ha nọ ná ngagharị mmeri. (2 Kọr. 2:14-16) Ka anyị na-eme ka ndị mmadụ mara Chineke, ozi anyị na-adị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Jehova. Ụfọdụ ndị na-anabata ozi ọma ahụ n’ihi otú o si tọọ ha ụtọ; ndị ọzọ na-ajụ ya. Ma, ọjụjụ a ihe ka ọtụtụ na-ajụ ozi ọma ahụ apụtaghị na ọrụ anyị anaghị amịpụta mkpụrụ. Tụlee ihe ozi anyị na-arụzu.
2. Gịnị ka ozi anyị na-enyere anyị aka igosipụta?
2 Ibuli Jehova Elu: Setan kwuru na ụmụ mmadụ na-ejere Jehova ozi n’ihi ihe ha na-erite n’aka Ya. (Job 1:9-11) Ozi anyị na-eje dị ka Ndị Kraịst na-enye anyị ohere igosipụta na anyị ji obi anyị dum rara onwe anyị nye Jehova. Ọtụtụ ndị nkwusa anọgidewo na-erube isi n’iwu nke ikwusa ozi ọma na nke ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya ma ọ bụ mmasị ọtụtụ mmadụ na-adịghị enwe na ya. Ntachi obi dị otú ahụ ha nọgidere na-enwe na-eme ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11.
3. N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa ka anyị nọgide na-eme ka a mara aha Chineke na nzube ya?
3 Ọzọkwa, ozi anyị na-arụ ọrụ n’imezu nzube Chineke. Banyere mbibi na-abịanụ a ga-ebibi ụwa Setan, Jehova na-ekwu, sị: “Mba nile ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezik. 39:7) Ka mba nile wee mara nke a, ọ dị nnọọ mkpa ka ndị ohu Chineke nọgide na-ekwusa aha ya na nzube ya nye “mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.”—Mkpu. 14:6, 7.
4. Olee otú ọrụ nkwusa ahụ si bụrụ ihe a ga-adabere na ya wee kpee ndị mmadụ ikpe?
4 Ihe A Ga-adabere na Ya Kpee Ikpe: Nkwusa a na-ekwusa ozi ọma sokwa n’ihe a ga-adabere na ya wee kpee ndị mmadụ ikpe. Pọl onyeozi kwuru na Kraịst Jizọs ga-abọ ọbọ n’isi “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Tesa. 1:8, 9) A ga-ekpe ndị mmadụ ikpe dabere n’otú ha si meghachi omume n’ebe ozi ọma ahụ dị. Lee nnọọ ibu ọrụ dị ukwuu nke a na-eme ka ndị ohu Chineke buru! Iji zere ịbụ ndị ikpe ọbara mara, anyị aghaghị ịnọgide na-eme ka a nụrụ ozi Alaeze ahụ bụ́ nke na-azọpụta ndụ.—Ọrụ 20:26, 27.
5. Olee otú ozi anyị si egosipụta ebere Chineke?
5 Mgbalị anyị nọgideworo na-eme iji nyere ndị agbata obi anyị aka inweta ihu ọma Chineke bụ otu ụzọ Jehova si na-egosipụta ebere ya. (1 Tim. 2:3, 4) Ebe anyị maara na ndụ ndị mmadụ na-agbanwe mgbe nile, anyị na-agakwuru ha ugboro ugboro ma na-agba ha ume ịchọ Jehova mgbe oge ka dị. Site n’ime otú ahụ, anyị na-egosipụta “obi ọmịiko nke Chineke anyị,” onye ‘na-achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.”—Luk 1:78; 2 Pita 3:9.
6. Olee otú ijechi ozi Jehova anya si abara anyị uru?
6 Uru Anyị Na-erite: Ijechi ozi Jehova anya na-echebe anyị. Ọ na-enyere anyị aka iburu “ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche” nakwa izere ịbụ ndị ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-emerụ. (2 Pita 3:11-14; Titus 2:11, 12) Ya mere, ka anyị bụrụ “ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, ndị nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị,” ebe anyị maara na mgbalị anyị na-etinye n’ozi Ndị Kraịst abụghị n’efu.—1 Kọr. 15:58.