Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/05 p. 1
  • Ozizi nke Na-eduba ná Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozizi nke Na-eduba ná Ndụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?
    Teta!—1998
  • Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Bara Uru Na-enweghị Atụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 12/05 p. 1

Ozizi nke Na-eduba ná Ndụ

1 Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ bụ ịhụ ka ihu ndị mmadụ na-egbukepụ ka ha na-aghọta eziokwu nke Okwu Chineke! Ime ka ndị ọzọ mara Chineke na nzube ya banyere ihe a kpọrọ mmadụ bụ n’ezie ihe na-enye afọ ojuju. Ozizi dị otú ahụ pụrụ ime ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

2 Ihe Mere O Ji Kara Mma: A na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ ọ bụla kwere omume akụziri ndị mmadụ ihe taa, a na-akụzikwara ndị mmadụ banyere ihe ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche. (Ekli. 12:12) Ma, a pụghị iji ihe ndị ahụ a na-akụziri ha tụnyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke” ma a bịa n’ịba uru. (Ọrụ 2:11) Ihe ụwa na-akụzi ò nwewo ike ime ka ihe a kpọrọ mmadụ bịaruo Onye Okike nso nakwa ka ha mara nzube ya? Ò nyeworo ndị mmadụ aka ịghọta ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ ma ọ bụ ihe mere ọtụtụ mmadụ ji na-ata ahụhụ? Ò mewo ka ndị mmadụ nwee olileanya? Ò nyewo aka mee ka udo na-adị n’ezinụlọ? Ee e. Ọ bụ nanị site n’ozizi Chineke ka anyị pụrụ isi chọta azịza bụ́ ezigbo ya nye ajụjụ ndị kasị mkpa ná ndụ.

3 Ozizi Chineke na-eme ka e nwee otu ihe dị nnọọ ụkọ n’ụwa taa—omume ọma. Okwu Chineke na-eme ka ndị nabatara ya ma na-etinye ihe ndị ọ na-ekwu n’ọrụ wepụ ịkpọasị agbụrụ na ịhụ mba n’anya n’obi ha. (Hib. 4:12) Ọ kpaliwo ndị mmadụ ịkwụsị ụdị ime ihe ike nile ma ‘yikwasị onwe ha ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ.’ (Kọl. 3:9-11; Maị. 4:1-3) Ọzọkwa, ozizi Chineke emewo ka ọtụtụ nde mmadụ nwee ike ịhapụ omume na àgwà ndị ririla ha ahụ́ bụ́ ndị na-adịghị eme Chineke obi ụtọ.—1 Kọr. 6:9-11.

4 Ihe Mere O Ji Dị Ngwa Ugbu A: Onye Nkụzi Ukwu anyị na-eme ka anyị mara ụdị oge anyị bi na ya. N’ikpe ya e buru n’amụma, e kwuru ihe ndị oge ha na-agafebeghị bụ́ ndị a na-aghaghị ime ka ụwa nile mara. (Mkpu. 14:6, 7) Kraịst na-achị achị n’eluigwe, a ga-ebibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke adịwokwa njikere ibibi ọchịchị nile nke ụwa. (Dan. 2:44; Mkpu. 11:15; 17:16) N’ihi ya, ọ dị ngwa ka ndị mmadụ mara onye Chineke chiri Eze bụ́ onye maliterela ọchịchị, ọ dịkwa ngwa ka ha si na Babilọn Ukwu ahụ pụta, nakwa ka ha jiri okwukwe kpọkuo aha Jehova. (Ọma 2:11, 12; Rom 10:13; Mkpu. 18:4) Ka anyị kere òkè ruo ókè o kwere mee n’ịkụziri ndị ọzọ ozizi na-eduba ná ndụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya