Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/05 p. 3
  • Nwa Gị Ọ̀ Pụrụ Ime Mkpebi Rijuru Afọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwa Gị Ọ̀ Pụrụ Ime Mkpebi Rijuru Afọ?
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ị Ghaghị Ikiri Vidio Bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 12/05 p. 3

Nwa Gị Ọ̀ Pụrụ Ime Mkpebi Rijuru Afọ?

1. Olee mkpebi Ndịàmà na-eto eto meworo banyere ọbara? Nye ihe atụ.

1 Mkpebi rijuru afọ banyere gịnị? Ọ bụ banyere mmịnye ọbara. Dị ka e gosiri n’isiokwu bụ́ “Na-ejegharịnụ Dị Ka Ndị Jehova Ziworo Ihe,” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 1991, ụmụ Ndịàmà Jehova emewo mkpebi rijuru afọ iji gosi na ha chọsiri ike irube isi n’iwu Chineke banyere ọbara otú ndị mụrụ ha sikwa chọọ irube isi n’iwu ahụ. À pụrụ ịtụ anya ka nwa gị ka na-eto eto meekwa mkpebi dị otú ahụ?

2. Olee ụkpụrụ iwu nke otu ụlọikpe ji kpebie ikpe nke otu onye na-eto eto nke na-ekweghị ka a mịnye ya ọbara, oleekwa ihe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na ụmụ ha pụrụ ịmụta na nke a?

2 Gịnị Ka Iwu Obodo Na-ekwu? Na United States, ụlọikpe kasị elu nke kperela ikpe banyere ikike onye na-eto eto nwere ịjụ mmịnye ọbara bụ Ụlọikpe Kasị Elu nke Illinois. Mgbe ụlọikpe a nọ na-elebagharị anya n’ikpe metụtara otu nwanna nwanyị dị afọ 17, ụlọikpe ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ihe àmà doro anya, bụ́kwa nke a pụrụ ikweta ekweta, bụ́ nke na-egosi na nwatakịrị a amatala ihe ruo n’ókè nke ịghọta ihe ndị ga-esi n’omume ya pụta ma na-elekwa ihe anya dị ka onye toruworo ogo mmadụ, ọ pụtara na nkwenkwe ya nyere ya ikike n’ụzọ iwu ọdịnala kwadoro ịnabata ma ọ bụ ịjụ usoro ọgwụgwọ ọ bụla.” N’ihi ya, mgbe ndị dọkịta ma ọ bụ ndị isi na-achọ ịchọpụta ma nwatakịrị na-arịa ọrịa ò toruola ime mkpebi n’onwe ya, ha pụrụ ịgba ya ajụjụ ọnụ iji nụrụ ihe mere o ji ajụ ịnara ọbara. Ọ ga-adị mkpa ka nwa ahụ ghọta nke ọma ókè ọrịa ya ahụ dịruru ná njọ nakwa ihe ndị ga-esi n’ụdị ọgwụgwọ ndị ọ ga-ahọrọ pụta. Ọ ghọtasịa ihe ndị a, ya ekwuzie n’ụzọ kwụ kwem ma doo anya, ihe ya onwe ya kweere banyere iwu Chineke nyere banyere ọbara.

3. Olee ajụjụ ndị nne na nna kwesịrị ịtụlesi ike, n’ihi gịnịkwa?

3 Gịnị Ka Nwa Gị Ga-ekwu? Ụmụ gị hà nwere ike ikwu echiche ha ma a bịa n’ihe banyere ọbara? Hà ji obi ha nile kwere na ọ bụ Chineke nyere iwu ka e ‘zere ọbara’? (Ọrụ 15:29; 21:25) Hà pụrụ iji Akwụkwọ Nsọ kọwaara mmadụ ihe ahụ ha kweere? Hà pụrụ iji obi ike kwadosie mkpebi ha mere banyere ọbara ike ma ọ bụrụ na ndị dọkịta ekwuo na ndụ ha nọ n’ihe ize ndụ, ọbụna ma a sị na ị nọghị ya? Ebe ọ bụ na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara [anyị] nile,” olee otú ị pụrụ isi mee ka ụmụ gị dị njikere iguzogide ihe ọ bụla ha na-atụghị anya ya bụ́ nke ga-eme ka iguzosi ike n’ezi ihe ghọọrọ ha ihe ịma aka?—Ekli. 9:11; Efe. 6:4.

4, 5. (a) Olee ọrụ dịịrị ndị nne na nna, oleekwa ụzọ ha pụrụ isi rụzuo ya? (b) Olee ngwá ọrụ ndị e nwere bụ́ ndị ga-enyere ndị nne na nna aka?

4 Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Unu Pụrụ Ime? Unu nwere ibu ọrụ nke ịkụziri ụmụ unu ihe bụ́ echiche Chineke banyere ọbara. (2 Tim. 3:14, 15) A kọwara ya nke ọma n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 70-74. Gị na ezinụlọ gị mụọ ya nke ọma. Gị na ụmụ gị jiri isiokwu bụ́ “If Someone Says—” (“Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị—”), bụ́ nke dị na peeji nke 74-76 mee ihe ngosi iji nyere ha aka ịma otú ha ga-esi kọwaara mmadụ ihe ha kweere banyere ọbara na ihe mere ha ji kwere ya. (1 Pita 3:15) Ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịma banyere ihe ndị metụtara ọbara bụ broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? na Ụlọ Nche nke June 15, 2004, peeji nke 14-24. Tụkwasị na nke ahụ, vidio ndị bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights na No Blood—Medicine Meets the Challenge, bụ́ nke e nwere ugbu a na DVD nke aha ya bụ Transfusion Alternatives—Documentary Series, na-enye ihe ọmụma na-eme ka e kwenyesie ike na ịgwọ ọrịa na ịwa mmadụ ahụ́ n’ejighị ọbara bụ ihe amamihe dị na ya ma dịrị irè. Gị na ezinụlọ gị ùnu ekiriwo vidio ndị ahụ ma kwurịta banyere ha na nso nso a?

5 Nyere ụmụ gị aka ‘ịnwapụtara onwe ha ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè,’ banyere ọbara. Mgbe ahụ, ha pụrụ ime mkpebi rijuru afọ, bụ́ nke Jehova ga-agọzi.—Rom 12:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya